Olee Iwu Ndị Bụ́ Iwu Iri nke Chineke?
Ihe Baịbụl zara
Iwu Iri ahụ bụ iwu Chineke nyere mba Izrel n’oge ochie. A na-akpọkwa ha Okwu Iri ahụ, nke bụ́ nsụgharị nkịtị nke okwu Hibru bụ́ ʽaseʹreth had·deva·rimʹ. Okwu a pụtara ugboro atọ na Pentatuk (Tora), ya bụ, akwụkwọ ise mbụ nke Baịbụl. (Ọpụpụ 34:28; Diuterọnọmi 4:13; 10:4) Otú ọzọ e si sụgharịa ya na Grik bụ deʹka (Iri) loʹgous (okwu). Ọ bụkwa na ya ka e si nweta okwu a sụgharịrị “Iwu Iri.”
Chineke dere Iwu Iri ahụ ná mbadamba nkume abụọ ma nye ya onye amụma ya bụ́ Mozis n’Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 24:12-18) E dere Iwu Iri ndị ahụ n’Ọpụpụ 20:1-17 nakwa na Diuterọnọmi 5:6-21.
Otú e si depụta Iwu Iri ahụ
Fee naanị Jehova bụ́ Chineke.—Ọpụpụ 20:3.
Ekperela arụsị.—Ọpụpụ 20:4-6.
Ejila aha Chineke eme ihe efu.—Ọpụpụ 20:7.
Debe Ụbọchị Izu Ike.—Ọpụpụ 20:8-11.
Sọpụrụ ndị mụru gị.—Ọpụpụ 20:12.
Egbula ọchụ.—Ọpụpụ 20:13.
Akwala iko.—Ọpụpụ 20:14.
Ezula ohi.—Ọpụpụ 20:15.
Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha.—Ọpụpụ 20:16.
Ihe onye ọzọ agụla gị agụụ.—Ọpụpụ 20:17.
Gịnị mere e ji nwee otú dị iche iche e si depụta Iwu Iri ahụ?
Baịbụl edeghi nọmba n’iwu nke ọ bụla n’ime Iwu Iri ahụ. N’ihi ya, otú ọtụtụ ndị chere e kwesịrị isi depụta ya ga-adị iche iche. Nke e depụtara n’elu bụ otú a kacha esi edepụta iwu ndị ahụ. Ma, ụfọdụ ndị na-edepụta Iwu Iri ahụ n’ụzọ dị iche n’otú e si dee ya ebe a. Ndị a na-edekarị n’ụzọ dị iche iche bụ iwu nke mbụ, nke abụọ, na nke ikpeazụ. a
Gịnị mere e ji nye Iwu Iri ahụ?
Iwu iri ahụ so n’Iwu Mozis. E nwere ihe karịrị narị iwu isii so n’Iwu ahụ. Ha so n’ihe Chineke na mba Izrel oge ochie kwekọrịtara na ha mgbe ha gbara ndụ. (Ọpụpụ 34:27) Chineke kwere ụmụ Izrel nkwa na ihe ga-agaziri ha ma ha rube isi n’Iwu Mozis. (Diuterọnọmi 28:1-14) Ma, ihe bụ́ isi mere e ji nye Iwu ahụ bụ iji kwadebe ụmụ Izrel maka Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ma ọ bụkwanụ Kraịst.—Ndị Galeshia 3:24.
Ọ̀ bụ iwu na Ndị Kraịst ga-edeberịrị Iwu Iri ahụ?
Mba. Ndị bụ́ isi Chineke nyere Iwu ahụ, nke Iwu Iri ahụ so na ya, bụ mba Izrel oge ochie. (Diuterọnọmi 5:2, 3; Abụ Ọma 147:19, 20) Iwu ejighị Ndị Kraịst idebe Iwu Mozis. ‘A tọpụdịrị ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst’ n’iwu ahụ.’ (Ndị Rom 7:6) b E ji “iwu nke Kraịst” dochie Iwu Mozis. Ihe ndị so n’iwu nke Kraịst bụ ihe niile Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme.—Ndị Galeshia 6:2; Matiu 28:19, 20.
Iwu Iri ahụ hà ka bara uru taa?
Ee. Ebe ọ bụ na Iwu Iri ahụ na-egosi otú Chineke si eche echiche, ha ga-abara anyị uru ma anyị na-amụ gbasara ha. (2 Timoti 3:16, 17) Iwu Iri ahụ hiwere isi n’isi ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ oge ha na-anaghị agafe agafe. (Abụ Ọma 111:7, 8) N’eziokwu, ọ bụ n’ọtụtụ n’ime eziokwu ndị a ka ọtụtụ ihe ndị dị n’ihe a kpọrọ Agba Ọhụrụ hiwere isi.—Lee “ Isi Ihe Ndị Dị n’Iwu Iri ahụ Ndị Gbakwara n’Agba Ọhụrụ.”
Jizọs kụziri na Iwu Mozis niile, ma Iwu Iri ahụ, hiwere isi n’iwu abụọ dị mkpa. Ọ sịrị: “‘Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.’ Ọ bụ ya bụ iwu kasị ukwuu, bụrụkwa nke mbụ. Nke abụọ bụ nke dị ka ya bụ ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ dum dabeere.” (Matiu 22:34-40) N’ihi ya, n’agbanyeghị na iwu ejighị Ndị Krịast taa idebe Iwu Mozis, e nyere ha iwu ka ha hụ Chineke na ndị mmadụ ibe ha n’anya.—Jọn 13:34; 1 Jọn 4:20, 21.
Isi ihe ndị dị n’Iwu Iri ahụ ndị gbakwara n’Agba Ọhụrụ
Isi Ihe Ndị Dị n’Iwu Iri Ahụ |
Ebe Ha Gbara n’Agba Ọhụrụ |
---|---|
Fee naanị Jehova bụ́ Chineke |
|
Ekperela arụsị |
|
Sọpụrụ aha Chineke |
|
Na-efe Chineke mgbe niile |
|
Sọpụrụ ndị mụrụ gị |
|
Egbula ọchụ |
|
Akwala iko |
|
Ezula ohi |
|
Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha |
|
Enwela anyaukwu |
a A bịa n’otú ndị Juu si hazie ya, ha “mere ka Op[ụpụ] xx. 2 bụrụ ‘okwu’ nke mbụ, mee ka amaokwu 3-6 bụrụ otu iwu, bụrụzie iwu nke abụọ.” (The Jewish Encyclopedia) Ma, ndị Katọlik weere Ọpụpụ isi 20, amaokwu nke 1-6 ka otu iwu. O meziri ka iwu kwuru gbasara imetọ aha Chineke bụrụ iwu nke abụọ. Iji hụ na iwu ahụ zuru iri, ha kere iwu nke ikpeazụ ụzọ abụọ, nke kwuru ka nwunye onye agbata obi gị nakwa ihe onwunwe ya ghara ịgụ gị agụụ.
b Ndị Rom 7:7 ji iwu nke iri mee ihe atụ nke ihe so ‘n’Iwu ahụ.’ O si otú ahụ gosi na Iwu Iri ahụ so n’Iwu Mozis.