Amụma Ndị E Buru Gbasara Mesaya Hà Na-egosi n’Eziokwu na Ọ Bụ Jizọs Bụ Mesaya?
Ihe Baịbụl kwuru
Ee. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ amụma e buru gbasara “Mesaya bụ́ Onye Ndú,” onye e kwuru na ọ ga-abụ “Onye Nzọpụta nke ụwa,” mezuru n’isi ya. (Daniel 9:25; 1 Jọn 4:14) Mgbe Jizọs nwụchara, amụma ndị e buru gbasara Mesaya ka nọkwa na-emezu n’isi ya.—Abụ Ọma 110:1; Ọrụ Ndịozi 2:34-36.
Gịnị ka “Mesaya” pụtara?
Okwu Hibru bụ́ Ma·shiʹach (Mesaya) na okwu Grik bụ́ Khri·stos (Kraịst) pụtara otu ihe, ya bụ, “Onye E Tere Mmanụ.” N’ihi ya, “Jizọs Kraịst” pụtara “Jizọs Onye E Tere Mmanụ,” ma ọ bụ “Jizọs bụ́ Mesaya.”
N’oge Baịbụl, ọ bụrụ na a họpụta mmadụ ka ọ rụọ ọrụ pụrụ iche, a na-ete ya mmanụ. Otú a na-esikarị ete mmadụ mmanụ bụ ịwụsa ya mmanụ n’isi. (Levitikọs 8:12; 1 Samuel 16:13) Ọ bụ Chineke họpụtara Jizọs ka ọ bụrụ Mesaya. Ihe a bụ nnukwu ọkwá. (Ọrụ Ndịozi 2:36) Ma, otú e si tee Jizọs mmanụ abụghị ịwụsa ya mmanụ nkịtị n’isi, kama Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ.—Matiu 3:16.
Amụma ndị e buru gbasara Mesaya hà nwere ike imezu n’isi ọtụtụ ndị?
Mba. Otú ahụ akara dị ná mkpịsị aka mmadụ na-enweghị mgbe ya na nke onye ọzọ na-abụ otu, ka amụma ndị e buru gbasara Mesaya ma ọ bụ Kraịst na-enweghị mgbe ọ ga-emezu n’isi ihe karịrị otu onye. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị kpachara anya maka na “Kraịst ụgha na ndị amụma ụgha ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.”—Matiu 24:24.
Mesaya ọ̀ ka ga-abịa n’ọdịnihu?
Mba. Baịbụl buru amụma na Mesaya ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid chịrị Izrel. (Abụ Ọma 89:3, 4) Ma, akwụkwọ ndị e dere aha ndị niile si n’ezinụlọ Devid adịkwaghị. Ọ ga-abụ na e bibiri ha mgbe ndị Rom bibiri Jeruselem n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst. a Kemgbe ahụ, e nweghị ihe mmadụ ga-agbakwasịli ụkwụ kwuo na ya si n’ezinụlọ eze Devid. Ma n’oge Jizọs nọ n’ụwa, akwụkwọ ndị e dere aha ndị niile si n’ezinụlọ Devid ka dị, e nweghịkwa onye iro ya ọ bụla nwere ike igosi na Jizọs ghara ụgha mgbe o kwuru ihe gosiri na o si n’ezinụlọ Devid.—Matiu 22:41-46.
Amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara Mesaya hà dị ole?
E nweghị ike ikwu kpọmkwem amụma ole e buru na Baịbụl gbasara Mesaya. Dị ka ihe atụ, otú ụfọdụ ndị si agụ amụma ole dị n’amaokwu Baịbụl ndị na-ekwu gbasara Mesaya nwere ike ịdị iche n’otú ndị ọzọ si agụ ha. N’amụma e buru n’Aịzaya 53:2-7, e kwuru ihe dị iche iche gbasara Mesaya. Ụfọdụ ndị nwere ike iwere ha niile ka otu amụma, ebe ndị ọzọ nwere ike iwere ihe nke ọ bụla e kwuru n’ebe ahụ gbasara Mesaya ka amụma kwụụrụ onwe ya.
Ụfọdụ amụma ndị e buru gbasara Mesaya bụ́ ndị mezuru n’isi Jizọs
Amụma |
Ọ Dị na |
O Mezuru na |
---|---|---|
Ọ ga-abụ nwa Ebreham |
||
Ọ ga-esi n’ezinụlọ Aịzik, nwa Ebreham |
||
A ga-amụ ya n’ebo Juda, n’Izrel |
||
Ọ ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid |
||
Ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-amụ ya |
||
A ga-amụ ya na Betlehem |
||
A ga-akpọ ya Ịmanuel b |
||
A ga-amụ ya n’ezinụlọ ndị ogbenye |
||
A ga-egbu ụmụaka mgbe a mụchara ya |
||
A ga-esi n’Ijipt kpọpụta ya |
||
A ga-akpọ ya onye Nazaret c |
||
Onye ozi ga-ebutere ya ụzọ |
||
A ga-ete ya mmanụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst d ka ọ bụrụ Mesaya |
||
Chineke ga-ekwu na ọ bụ Ọkpara ya |
||
Ọ ga-anụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi |
||
Ọ ga-ezi ozi ọma |
||
Ozi ọma ọ ga-ezi na Galili ga-eme ka e nwee oké ìhè |
||
Ọ ga-arụ ọrụ ebube ka Mozis |
||
Ọ ga-agwa ndị mmadụ uche Chineke otú Mozis mere |
||
Ọ ga-agwọ ọtụtụ ndị ọrịa |
||
Ọ gaghị eme ka ndị mmadụ towe ya |
||
Ọ ga-emetere ndị na-ata ahụhụ ebere |
||
Ọ ga-eme ka a mata na Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi |
||
Ọ ga-abụ Onye Ndụmọdụ Dị Ebube |
||
Ọ ga-eme ka a mata aha Jehova |
||
Ọ ga-eji ihe atụ kụzie ihe |
||
Ọ ga-abụ Onye Ndú |
||
Ọtụtụ ndị agaghị enwe okwukwe na ya |
||
Ọ ga-abụ nkume na-akpọbi mmadụ ụkwụ |
||
Ndị mmadụ ga-ajụ ya |
||
A ga-akpọ ya asị na nkịtị |
||
Ọ ga-anọ n’elu ịnyịnya ibu banye Jeruselem, ndị mmadụ ana-aṅụrị ọṅụ |
||
Ụmụaka ga-eto ya |
||
Ọ ga-abịa n’aha Jehova |
||
Ezigbo enyi ya ga-arara ya nye |
||
A ga-akwụ onye ga-arara ya nye mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ e |
||
Ndị enyi ya ga-ahapụ ya gbaa ọsọ |
||
A ga-agbagide ya akaebe ụgha |
||
Ọ ga-agba ndị na-ebo ya ebubo nkịtị |
||
A ga-agbụ ya ọnụ mmiri |
||
A ga-akụ ya ihe n’isi |
||
A ga-apịa ya ihe |
||
Ọ hapụrụ ka ndị chọrọ iti ya ihe tie ya ihe |
||
Ndị ọchịchị ga-ejikọta aka megide ya |
||
A ga-eji ntu si n’aka ya na n’ụkwụ ya kpọgide ya n’osisi |
||
A ga-efere uwe ya nza |
||
A ga-agụnye ya ná ndị mmehie |
||
A ga-akwa ya emo, kparịakwa ya |
||
Ọ ga-ata ahụhụ n’ihi ndị mmehie |
||
Ọ ga-adị ya ka Chineke ọ̀ hapụla ya |
||
A ga-enye ya mmanya gbara ụka na ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ |
||
Akpịrị ga-akpọ ya nkụ mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ |
||
Ọ ga-enyefe Chineke mmụọ ya |
||
Ọ ga-ekweta ịnwụ |
||
Ọ ga-eji ndụ ya gbapụta ụmụ mmadụ ná mmehie |
||
A gaghị agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla |
||
A ga-ama ya ube |
||
A ga-eli ya n’ebe a na-eli ndị ọgaranya |
||
A ga-akpọlite ya n’ọnwụ |
||
A ga-eji onye ọzọ dochie onye raara ya nye |
||
Ọ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke |
a Akwụkwọ e ji eme nchọnchọ McClintock na Strong dere kwuru, sị: “O doro anya na akwụkwọ ndị e dere aha ebo ndị Juu na ezinụlọ dị iche iche ha si lara n’iyi n’oge e bibiri Jeruselem, ọ bụghị tupu oge ahụ.”
b Ịmanuel bụ aha Hibru. Ọ pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” Aha a na-egosi ọrụ Jizọs ga-arụ maka na ọ bụ Mesaya. Ọbịbịa ọ bịara n’ụwa na ọrụ ndị ọ rụrụ gosiri na Chineke nọnyeere ndị na-efe ya.—Luk 2:27-32; 7:12-16.
c O nwere ike ịbụ na okwu a sụgharịrị “onye Nazaret” si n’okwu Hibru bụ́ neʹtser. Neʹtser pụtara “mgbọrọgwụ.”
d Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Baịbụl si gosi na ọ bụ n’afọ 29 Oge Ndị Kraịst ka Jizọs ghọrọ Mesaya, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa.”
e Amụma a dị n’akwụkwọ Zekaraya, ma otu onye so dee Baịbụl aha ya bụ Matiu sịrị na ‘e kwuru ya site n’ọnụ Jeremaya onye amụma.’ (Matiu 27:9) Ọ ga-abụ na mgbe ụfọdụ, a na-ebute akwụkwọ Jeremaya ụzọ n’akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ ‘Akwụkwọ Ndị Amụma.’ (Luk 24:44) Mgbe Matiu kwuru ‘Jeremaya,’ ọ ga-abụ na ihe o bu n’obi bụ akwụkwọ ndị amụma ahụ niile, nke akwụkwọ Zekaraya so na ha.