Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ilekọta Ndị Nne na Nna Merela Agadi?
Ihe Baịbụl kwuru
Ọ bụ ụmụ ndị torola eto ka ọrụ ilekọta nne ma ọ bụ nna ha merela agadi dịịrị. Baịbụl kwuru ka ụmụ torola eto “buru ụzọ mụta itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke ha, mụtakwa ịdị na-akwụ ndị mụrụ ha . . ụgwọ ruuru ha, n’ihi na ọ bụ ihe dị mma n’anya Chineke.” (1 Timoti 5:4) Ọ bụrụ na ụmụ torola eto ana-elekọta nne na nna ha merela agadi, ọ pụtara na ha na-erube isi n’iwu Baịbụl ahụ bụ́ “Sọpụrụ nna gị na nne gị.”—Ndị Efesọs 6:2, 3.
Baịbụl ekwughị kpọmkwem otú a ga-esi na-elekọta ndị nne na nna merela agadi. Ma ọ kọrọ akụkọ ndị nwoke na ndị nwanyị, ndị fere Chineke, ndị lekọtara ndị mụrụ ha. O kwukwara ihe ndị bara uru nwere ike inyere ndị na-elekọta ndị merela agadi aka.
Olee otú ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl si lekọta ndị nne na nna ha merela agadi?
E nwere ụzọ dị iche iche ha si mee ya, n’ihi otú ihe si dịrị ha.
Josef bi ebe dị ezigbo anya n’ebe nna ya merela agadi, bụ́ Jekọb, bi. Ma mgbe o kwere Josef omume, o mere ndokwa ka Jekọb bịa biri ebe dị ya nso. Josef lekọtara nna ya, nye ya nri, hụkwa na e nweghị ihe mere ya.—Jenesis 45:9-11; 47:11, 12.
Rut sooro nne di ya laa obodo ya. Ọ rụsikwara ọrụ ike iji lekọta ya.—Rut 1:16; 2:2, 17, 18, 23.
Jizọs, obere oge tupu ya anwụọ, nwere onye ọ gwara ka o lekọtawa nne ya, bụ́ Meri. O yiri ka di ya anwụọla tupu mgbe ahụ.—Jọn 19:26, 27. a
Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere ndị na-elekọta ndị nne na nna ha merela agadi aka?
Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ nwere ike inyere ndị na-elekọta nne na nna merela agadi aka ka ha nwee ike die nsogbu ndị dị ka ike ọgwụgwụ na nchegbu a na-enwe mgbe ụfọdụ ma a na-elekọta ndị agadi.
Sọpụrụ ndị mụrụ gị.
Ihe Baịbụl kwụrụ: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.”—Ọpụpụ 20:12.
Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Otú ị ga-esi gosi na ị na-asọpụrụ ndị mụrụ gị bụ ịhapụ ha ka ha na-eme ihe ụfọdụ ndị ha ga-emeli n’onwe ha. O kwe mee, ha jiri aka ha kpebie otú a ga-esi na-elekọta ha. N’otu mgbe ahụkwa, meere ha ihe ndị i nwere ike imere ha iji nyere ha aka.
Na-aghọta ha ma na agbaghara ha.
Ihe Baịbụl kwuru: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”—Ilu 19:11.
Olee otú a ga esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna merela agadi ekwuo ihe ụfọdụ were gị iwe ma ọ bụ mee ihe gosiri na obi adịghị ya ụtọ n’ihe ị na-emere ya, jụọ onwe gị sị, ‘Olee otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ m nọ n’ụdị ọnọdụ a?’ Ọ bụrụ na ị ghọta otú ihe si dịrị ya ma na-agbaghara, ị ga-eme ka ihe ghara ịka njọ.
Jụọ ndị ozọ.
Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.”—Ilu 15:22.
Olee otú a ga esi eme ihe a Baịbụl kwuru? E nwee ọrịa ndị mụrụ gị na-arịa, mee nchọnchọ ka ị mata ihe gbasara ọrịa ahụ ka i nwee ike ịma otú ị ga-esi nyere ha aka. Chọpụta ma e nwere ihe obodo na-emere ndị agadi, nke ga-eme ka ilekọta ha dịkwuo mfe. Jụọ ndị ọzọ lekọtarala nne ma ọ bụ nna merela agadi otú ha si mee ya. Ọ bụrụ na i nwere ụmụnne, unu lee ma ọ̀ ga-adị mma ka unu nwee nnọkọ ebe unu ga-anọ kparịta ihe ndị bụ́ mkpa ndị mụrụ unu, otú unu ga-esi elekọta ha na otú onye ọ bụla ga-esi nye aka.
Mara ebe ike gị ruru.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”—Ilu 11:2.
Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Mara ebe ike gị ruru. Dị ka ihe atụ, e nweghị onye oge o nwere na-anaghị agwụ agwụ ma ọ bụ onye ike na-anaghị agwụ agwụ. Ebe ọ bụ na e nwere ebe ike gị ruru, ọ bụghị ihe niile ka ị ga-enwe ike imere ndị mụrụ gị. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka naanị gị agaghị ebuli ihe dị n’ilekọta ndị mụrụ gị, i nwere ike ịgwa ndị ọzọ n’ezinụlọ unu ka ha nyere gị aka ma ọ bụ gị achọọ ndị ọkachamara ka ha nyere gị aka.
Lekọta onwe gị anya.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.”—Ndị Efesọs 5:29.
Olee otú a ga-esi eme ihe a Baịbụl kwuru? Ọ bụ eziokwu na ilekọta ndị mụrụ gị bụ ọrụ dịịrị gị, ọ dịkwa mkpa na ị ga na-elekọta onwe gị anya ma lekọta ndị ezinụlọ gị ma ọ bụrụ na ịlụọla di ma ọ bụ nwunye. I kwesịrị ịna-eri nri dị mma. I kwesịkwara ịna-ehi ụra ọfụma ma na-ezu ike nke ọma. (Ekliziastis 4:6) Ọ dịkwa mkpa ka i nwee oge onye ọzọ ga-enyetụrụ gị aka lekọta ndị agadi ahụ ma ọ bụrụ na o kwere omume. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, ahụ́ ga-aka eru gị ala ilekọta nne na nna gị mere agadi, ị ga-enwekwa ike ị ga-eji rụọ ọrụ a.
Baịbụl ò kwuru ebe a ga-anọ lekọta ndị nne na nna merela agadi?
Baịbụl agwaghị ụmụ toro eto ebe ha ga-anọ lekọta ndị nne na nna ha merela agadi. Ụfọdụ ndị na-ekpebi na ọ ka mma ka nne ha na nna ha merela agadi nọrọ n’ụlọ nke ha, ma ọ bụkwanụ ha akpọrọ ha. Mgbe ụfọdụ, e nwekwara ike ịkpọga ha n’ebe a na-elekọta ndị agadi. Ndị ezinụlọ ahụ nwere ike ịnọkọ kpebie nke ga-akara onye ọ bụla mma.—Ndị Galeshia 6:4, 5.
a Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru gbasara ihe a Jizọs mere, sị: “O nwedịrị ike ịbụ na ọ dịla anya Josef [di Meri] nwụrụ, ya bụrụkwa na ọ bụ Jizọs na-elekọtazi Meri. Ugbu a Jizọs na-aga ịnwụ, ònye ga na-elọkatazi Meri? . . . Kraịst si otú a kụziere ndị bụ́ ụmụ na ha kwesịrị ịna-elekọta ndị nne na nna ha merela agadi.”—The NIV Matthew Henry Commentary in One Volume, peeji nke 428-429.