Ịgba Chaa Chaa Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl ekwughị ọtụtụ ihe gbasara ịgba chaa chaa. Ma, ihe ndị dị́ na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka ịmata na Chineke weere ịgba chaa chaa ka ihe ọjọọ.—Ndị Efesọs 5:17. a
Ọ bụ anyaukwu mere ndị mmadụ ji agba chaa chaa. Ma, Chineke kpọrọ anyaukwu asi. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Ndị Efesọs 5:3, 5) Ndị na-agba chaa chaa na-ebu n’obi na ha ga-eri ego ha na ibe ha tụkọtara. Ma, Baịbụl kwuru na anyị ekwesịghị ikwe ka agụụ inweta ihe ndị ọzọ na-agụ anyị.—Ọpụpụ 20:17; Ndị Rom 7:7; 13:9, 10.
A sịgodị na ọ bụ obere ego ka mmadụ chọrọ iji gbaa chaa chaa, o nwere ike ime ka onye ahụ malite ịhụ ego n’anya.—1 Timoti 6:9, 10.
Ndị na-agba chaa chaa na-atụkwasịkarị chi ihu ọma obi. Ma, Chineke weere ịtụkwasị chi ihu ọma obi ka ikpere arụsị. E nweghịkwa ihe jikọrọ ofufe Chineke na ikpere arụsị.—Aịzaya 65:11.
Baịbụl gbara anyị ume ka anyị na-arụsi ọrụ ike, kama ịnọ na-achọ inweta ego n’enweghị ọrụ anyị rụrụ. (Ekliziastis 2:24; Ndị Efesọs 5:28) Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-eri “nri ha onwe ha rụtara.”—2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12.
Ịgba chaa chaa nwere ike ime ka ndị mmadụ na-amarịta aka. Baịbụl kagbukwara mmadụ na ibe ya ịmarịta aka ma ọ bụ ịsọ mpi.—Ndị Galeshia 5:26.
a Naanị ebe Baịbụl kwuru gbasara ya bụ mgbe a na-ekwu banyere ndị agha Rom, bụ́ ndị ji anyaukwu fee nza maka uwe Jizọs.—Matiu 27:35; Jọn 19:23, 24.