Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ite Ime?
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl ekwughị gbasara “ite ime” nke mmadụ ịma ama wepụ nwa nọ ya n’afọ. Ma, e nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke si ele ndụ mmadụ anya, ma nke nwa e bu n’afọ.
Ndụ bụ onyinye si n’aka Chineke. (Jenesis 9:6; Abụ Ọma 36:9) O weere ndụ mmadụ niile ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ma nke nwa e bu n’afọ. Ọ bụ ya mere na mmadụ kpachara anya gbuo nwa nọ n’afọ, a na-ewere onye ahụ ka onye gburu ọchụ.
Iwu Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ na-alụ ọgụ, ha ewee merụọ nwaanyị dị ime ahụ́, nwa ya ewee pụta ma mmadụ anwụghị n’ihe mberede a, a ghaghị iri ya iwu dị ka ihe onye lụ nwaanyị ahụ gwara ya si dị; ọ ga-akwụkwa ya site n’aka ndị ikpe. Ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ihe mberede a, ị ga-eme ka mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi.”—Ọpụpụ 21:22, 23. a
Olee mgbe ndụ mmadụ na-amalite?
Chineke weere ya na ndụ na-amalite ozugbo nwaanyị tụụrụ ime. N’Okwu ya bụ́ Baịbụl, Chineke kwuru ọtụtụ mgbe na nwa e bu n’afọ bụ mmadụ. Ka anyị lee ihe atụ ụfọdụ na-egosi na Chineke anaghị ewere ya na nwa e bu n’afọ dị iche na nke a mụrụla amụ.
Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ gwa Chineke, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.” (Abụ Ọma 139:16) Chineke weere Devid ka mmadụ dị ndụ tupudị a mụọ ya.
Ihe ọzọkwa bụ na tupudị a mụọ Jeremaya onye amụma, Chineke ma na o nwere ọrụ pụrụ iche ọ ga-arụrụ ya. Chineke gwara ya, sị: “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, amaara m gị, tupu gị esi n’akpa nwa pụta, edoro m gị nsọ. Emere m gị onye amụma nke mba dị iche iche.”—Jeremaya 1:5.
Luk onye so dee Baịbụl, onye bụ́kwanụ dọkịta, ji otu okwu Grik o ji kọwaa nwa e bu n’afọ kọwaa nwa a mụrụ ọhụrụ.—Luk 1:41; 2:12, 16.
Chineke ọ̀ ga-agbaghara onye terela ime?
Chineke nwere ike ịgbaghara ndị tetụrụla afọ ime. Ọ bụrụ na ha amalite ile ndụ anya otú Chineke si ele ya, ha ekwesịghị ichewe na ndụ a ha dị enweghị isi. “Jehovah dị ebere na-emekwa amara. . . Dị ka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka o mere ka njehie anyị dị anya n’ebe anyị nọ.” b (Abụ Ọma 103:8-12) Jehova ga-agbaghara ndị niile ji obi ha chegharịa ná mmehie ndị ha mere, ma ndị nke terela ime.—Abụ Ọma 86:5.
Ọ bụrụ na ndụ nne ma ọ bụ nwa e bu n’afọ nọ n’ihe ize ndụ, o nwere ihe o mere ma o tee ime ahụ?
N’ihi ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara nwa e bu n’afọ, mmadụ ekwesịghị ite ime n’ihi na a gwara ya na nwa e bu n’afọ ma ọ bụ yanwa nwere ike ịnwụ ma a hapụ ime ahụ.
Ọ bụ eziokwu na ọ naghị emekarị, gịnịkwanụ ka a ga-eme ma ọ bụrụ na mgbe a na-amụ nwa e nwee nsogbu biliterenụ nke ga-eme ka ọ dị mkpa ikpebi ichebe ndụ nne ma ọ bụ nke nwa o bu n’afọ? A bịa na nke a, ndị ọ gbasara ga-eji aka ha ekpebi ndụ onye nke a ga-echebe.
a Otú e si sụgharịa iwu a na Baịbụl ụfọdụ bịaziri mee ka o yie ka ebe nsogbu dị bụ ma ihe mee nwaanyị ahụ dị ime, ọ bụghị nwa o bu n’afọ. Ma, okwu Hibru e si na ya sụgharịa ihe a gosiri na ihe a na-ekwu okwu ya bụ ma nwaanyị ahụ dị ime ma ọ bụ nwa o bu n’afọ nwụọ.
b Jehova bụ aha Chineke, e kwukwara gbasara aha a na Baịbụl.—Abụ Ọma 83:18.