Olee Otú Ndị Nne na Nna Ga-esi Akụziri Ụmụ Ha Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?
Ihe Baịbụl kwuru
Olee ndị kwesịrị ịkụziri ụmụaka gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị? Baịbụl sịrị na ọ bụ ọrụ dịịrị ndị nne na nna. E nwere ihe ụfọdụ nyeerela ọtụtụ ndị nne na nna aka. Lee ha:
Emela ihere. Baịbụl ezoghị ọnụ mgbe ọ na-ekwu ihe ụfọdụ gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị nakwa gbasara ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Chineke gwakwara ụmụ Izrel na e kwesịrị ịkụziri “ụmụntakịrị” ihe ndị ahụ. (Diuterọnọmi 31:12; Levitikọs 15:2, 16-19) Ị na-akọwara nwa gị banyere mmekọ nwoke na nwaanyị, kọwaa ya otú ọ na-agaghị eche na ọ bụ ihe ihere ma ọ bụ chee na ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị bụ ihe ihere.
Ka ọ na-eto, na-akọwakwuru ya ihe ndị ọzọ o kwesịrị ịma. Kama iji ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị kọjuo nwa gị isi otu ugbo, ọ ka mma ka ị na-akọwara ya ihe onye dị afọ ole ọ dị ga-aghọtali. Ọ na-eto, gị ana-akọwakwuru ya ihe ndị ọzọ.—1 Ndị Kọrịnt 13:11.
Kụziere nwa gị ịna-akpa àgwà ọma. E nwere ụlọ akwụkwọ ụfọdụ a na-akụziri ụmụaka ihe ndị ha kwesịrị ịma gbasara mmekọahụ. Ma, Baịbụl gwara ndị nne na nna ka ha na-akụziri ụmụ ha ihe gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị na-akụzikwara ha otú ha kwesịrị isi na-ele mmekọ nwoke na nwaanyị anya nakwa otú ha ga-esi na-emeso onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha.—Ilu 5:1-23.
Gee nwa gị ntị. Ọ bụrụ na nwa gị ajụọ gị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị, ewerela ya na nwa gị emebiela. Kama bụrụ “onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.”—Jems 1:19.
Otú ị ga-esi echebe ụmụ gị ka ndị na-edina ụmụaka ghara inweta ha
Mara ihe ndị i kwesịrị ịma. Mata otú ndị na-edina ụmụaka na-esi enweta ha.—Ilu 18:15; gụọ isi nke 32 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1.
Mara ihe na-eme ná ndụ nwa gị. Akpọnyela mmadụ nwa gị ma ọ bụrụ na ị tụkwasịghị ya obi. Ahapụkwala nwa gị ka “ọ na-eme otú masịrị ya.”—Ilu 29:15.
Kụziere nwa gị na ọ bụghị ihe ọ bụla onye tọrọ ya gwara ya ka ọ ga-eme. E kwesịrị ịkụziri ụmụaka ka ha na-erubere ndị mụrụ ha isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ma, ọ bụrụ na ị kụziere nwa gị ka ọ na-eme ihe ọ bụla onye toro eto gwara ya, o nwere ike ime ka nwa ahụ banye ná nsogbu. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst nwere ike ịgwa nwa ha na ọ bụrụ na mmadụ agwa ya mee ihe Chineke kpọrọ asị, ya emela ya.—Ọrụ Ndịozi 5:29.
Kụziere ụmụ gị ihe ndị ha nwere ike ime. Kụziere nwa gị ihe ọ ga-eme ma mmadụ chọọ ịrata ya ma ọ bụ mee ya ihe ọ bụla mgbe ị na-anọghị ya. Ọ bụrụ na gị na ụmụ gị amụgharịa ihe ha ga-eme, ọ ga-enyere ha aka ịkata obi sị onye ọ bụla chọrọ ime ha ihe na-adịghị mma “Hapụ m! Ihe ọ bụla i mere m, m ga-agwa ya mpa m! Gwakwa ha ka si ebe ahụ gbapụ ozugbo. Ọ ga-adị mma ị nọtụ gị echetakwara ha ihe ndị ị kụziiri ha n’ihi na ọ naghị ara ahụ́ ụmụaka echefuo ihe a kụziiri ha.—Diuterọnọmi 6:7.