Olee Ndị Bụ Ndị Nefilim
Ihe Baịbụl kwuru
Ndị Nefilim bụ ndị dike gbara ajọ dimkpa ma na-eme ihe ike. Ha bụ ụmụ ajọ ndị mmụọ ozi mụrụ mgbe ha na ụmụ nwaanyị nwere mmekọahụ n’oge Noa. a
Baịbụl kwuru, sị: “Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma.” (Jenesis 6:2) ‘Ụmụ ndị ikom nke Chineke’ bụ ndị mmụọ e kere eke, bụ́ ndị nupụụrụ Chineke isi mgbe ha “hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” nke dị n’elugwe, ma bịa n’ụdị mmadụ wee “na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.”—Jud 6; Jenesis 6:2.
Ụmụ ndị ha mụrụ abụghị ụmụ nkịtị. (Jenesis 6:4) Ndị Nefilim a bụ ndị dike na-emesi ndị ọzọ ike, ndị mere ka ihe ike na tigbuo zọgbuo jupụta n’ụwa. (Jenesis 6:13) Bịabụl kpọrọ ha “ndị dike, ndị biri n’oge gboo, ndị ikom a ma ama.” (Jenesis 6:4) Ha mere ka ime ihe ike na ụjọ ju ebe niile.—Jenesis 6:5; Ọnụ Ọgụgụ 13:33. b
Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara ndị Nefilim
Ụgha: Ndị Nefilim ka nọ ndụ n’ụwa taa.
Eziokwu: Jehova ji iju mmiri bibie ndị oge ochie ahụ na-eme ihe ike. Ndị Nefilim so na ndị e bibiri mgbe ahụ. Ma, Jehova chebere Noa na ezinụlọ ya. Ọ bụkwa naanị ha ka e chebere ndụ n’oge ahụ.—Jenesis 6:9; 7:12, 13, 23; 2 Pita 2:5.
Ụgha: Ọ bụ ụmụ mmadụ bụ nna ndị Nefilim.
Eziokwu: A kpọrọ ndị nna ha “ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke.” (Jenesis 6:2) Ọ bụkwa ihe Baịbụl kpọrọ ndị mmụọ ozi. (Job 1:6; 2:1; 38:7) Ndị Mmụọ ozi nwere ikike ịgbanwe ghọọ mmadụ. (Jenesis 19:1-5; Jọshụa 5:13-15) Pita onyeozi kwuru gbasara ‘ndị mmụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ndị nupụrụ isi n’oge gara aga, mgbe Chineke ji ndidi na-echere n’ụbọchị Noa.’ (1 Pita 3:19, 20) Jud onye so dee Baịbụl kwukwara gbasara ihe a merenụ. O kwuru na ụfọdụ ndị mmụọ ozi “anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha, kama ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị.”—Jud 6.
Ụgha: Ndị Nefilim bụ ndị mmụọ si n’elu daa.
Eziokwu: Ihe e dere na Jenesis 6:4 gosiri na ndị Nefilim abụghị ndị mmụọ ozi, kama ha bụ ụmụ ndị a mụtara mgbe ndị mmụọ ozi ahụ nwoghara n’ụdị mmadụ so ụmụ nwaanyị nwee mmekọahụ. Mgbe ndị mmụọ ozi ‘lụchara ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ,’ Jehova kwuru na n’ime otu narị afọ na afọ iri abụọ, na ya ga-ebibi ndị na-anaghị atụ egwu ya n’ụwa n’oge ahụ. (Jenesis 6:1-3) E kwukwara na “n’oge ahụ,” ndị mmụọ ozi ahụ na “ụmụ ndị inyom nke mmadụ nọ na-enwe mmekọahụ, ha wee mụọrọ ha ụmụ ndị ikom, ha bụ ndị dike, ndị biri n’oge gboo,” ya bụ, ndị Nefilim.—Jenesis 6:4.
a Okwu Hibru a sụpere “Nefilim” pụtara “Ndị Nkwada.” Akwụkwọ bụ́ Wilson’s Old Testament Word Studies kwuru na okwu ahụ pụtara ndị “na-eji ike anapụ ndị ọzọ ihe ha ma na-eme ka ha daa.”
b Ndị Izrel ahụ gara nledo e kwuru okwu ha n’Ọnụ Ọgụgụ 13:33 hụrụ ndị gbara ajọ dimkpa, nke chetaara ha ndị Nefilim ahụ nwụrụla kemgbe ọtụtụ narị afọ.—Jenesis 7:21-23.