Gaa n'Isiokwu

Ò Nwere Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Otú Halowin Si Bido?

Ò Nwere Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Otú Halowin Si Bido?

Ihe Baịbụl kwuru

 O nweghị ebe okwu ahụ bụ́ Halowin dị na Baịbụl. Ma, otú Halowin si malite n’oge gboo na ihe ndị a na-eme na ya n’oge a gosiri na ihe mere ndị mmadụ ji eme ya bụ na ha kweere ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ na ndị mmụọ ọjọọ.—Gụọ ihe e dere n’ebe sịrị “Otú Halowin si malite na ihe ndị a na-eme na ya.”

 Baịbụl kwuru, sị: “A gaghị ahụta n’etiti unu . . . onye na-ajụ mmụọ ihe . . . maọbụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe.” (Diuterọnọmi 18:10-​12, Baibul Nsọ [Ndezighari Ọhuru]) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị weere Halowin ka ememme nkịtị na-enweghị ihe o mere, mana Baịbụl gosiri na ihe ndị ya na ememme a so nwere ihe ha mere. Ná 1 Ndị Kọrịnt 10:20, 21, Baịbụl sịrị: ‘Achọghị m ka unu bụrụ ndị ha na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe. Unu apụghị ịdị na-aṅụ iko Jehova na iko ndị mmụọ ọjọọ.’

Otú Halowin si malite na ihe ndị a na-eme na ya

  1.   Sawin: Akwụkwọ a na-akpọ The World Book Encyclopedia sịrị na ebe e si nweta Halowin bụ n’ememme Sawin. Sawin bụ ememme “ndị ọgọ mmụọ nke ndị Kelt nọ na-eme n’ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga. Ndị Kelt kweere na ndị nwụrụ anwụ nwere ike iso ndị dị ndụ na-akpagharị n’oge Sawin, nakwa na ndị dị ndụ nwere ike ịga na nke ndị nwụrụ anwụ n’oge ahụ.” Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) N’ihi ya, ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ enweghị ike ịna-emekọrịta ihe.

  2.   Efe a na-eyi eme Halowin, swiit, nakwa ịga n’ụlọ n’ụlọ ana ndị mmadụ ihe: Otu akwụkwọ a na-akpọ Halowin​—An American Holiday, An American History sịrị na ụfọdụ ndị Kelt na-eyi efe ga-eme ka ha yie otootoo maka na ọ ga-eme ka ndị mmụọ na-akpagharị akpagharị chee na ha bụ ndị mmụọ ibe ha ma hapụ ha. Ndị ọzọ na-edosara ndị mmụọ swiit ha ga-ara ka obi jụrụ ha. N’oge gboo, na Yurop, ndị ụkọchukwu Katọlik bidoro ime ihe ndị ọgọ mmụọ na-eme ma gwa ndị chọọchị ha ka ha yiri efe e ji eme Halowin na-aga n’ụlọ ndị mmadụ na-agwa ha ka ha nye ha onyinye maka ekpere ha na-ekpere ndị nwụrụ anwụ. Ma, Baịbụl akwadoghị ka e tinye ihe ndị a na-eme n’okpukpe ụgha n’ofufe Chineke.​—2 Ndị Kọrịnt 6:​17.

  3.   Ndị amusu na ndị nwụrụ anwụ a sịrị na-apụta: Akwụkwọ bụ́ Halowin Trivia kwuru na o teela a ma na e nwere ihe jikọrọ ndị a na ndị mmụọ ọjọọ. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa ka anyị guzogide ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghị ka anyị soro ha na-emekọ ihe.​—Ndị Efesọs 6:​12.

  4.   Anyụ Halowin: Otu akwụkwọ a na-akpọ Halowin​—From Pagan Ritual to Party Night kwuru na n’oge ochie, na Briten, ndị na-eme Halowin “na-aga n’ụlọ n’ụlọ na-arịọ ndị mmadụ ihe oriri maka ekpere ha na-ekpere ndị nwụrụ anwụ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na ha na-ebu ‘ihe dị ka ayo a ghụchasịrị ime ya tinye ya kandụl a mụnyere amụnye. Kandụl ahụ nọchiri anya mkpụrụ obi e ji eji na pọgatrị.’ Ndị ọzọ kwuru na e ji ihe ahụ dị ka ayo a mụnyere kandụl n’ime ya achụ ndị mmụọ ọjọọ. N’ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, e ji anyụ dochie ihe ahụ dị ka ayo n’ihi na anyụ juru ebe niile, dịkwa mfe ịkọchasị ime ya ma tinye ya anya na imi na ọnụ ka ọ dị ka ihu mmadụ. Ihe mere ndị mmadụ ji eme ihe ndị a bụ maka na ha kweere na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, na e nwere ndị na-aga pọgatrị, nakwa na ha kwesịrị ịna-ekpere ndị nwụrụ anwụ ekpere. Ma, ihe ndị a niile esighị na Baịbụl.—Ezikiel 18:4.