AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA
2 Timoti 1:7—“Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ Nke Ụjọ”
“N’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ, kama, ọ na-enye anyị ike, na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ka anyị na-ele ihe anya otú dị mma.”— 2 Timoti 1:7, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.
“Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ, kama mmụọ nke ike, nke ịhụnanya na nke ịkwanyere onwe anyị ugwu.”—2 Timoti 1:7, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.
Ihe 2 Timoti 1:7 Pụtara
Chineke nwere ike inyere mmadụ aka ịkata obi mee ihe dị mma. Chineke achọghị ka mmadụ jiri maka ụjọ mee ihe n’adịghị mma, mmadụ ime ụdị ihe a ga-ewute Chineke.
E nwere ihe atọ amaokwu a kwuru ga-enyere anyị aka ịghara ịtụ ụjọ.
“Ike.” Ndi na-efe Chineke akatala obi na-efe ya n’agbayeghị nsogbu ndị iro ha obi fere azụ na-enye ha. Ha anaghị eji ụjọ akwụsị ife ya. (2 Ndị Kọrịnt 11:23-27) Olee ihe na-enyere ha aka? Legodi otú Pọl onyeozi si kwuo ya: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Chineke nwere ike inye ndị na-efe ya “ike karịrị ike mmadụ” iji merie nsogbu ọ bụla.—2 Ndị Kọrịnt 4:7.
“Ịhụnanya.” Mmadụ ịhụ Chineke n’anya ga-enyere ya aka ịkata obi mee ihe dị mma. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-adị ma mmadụ hụ mmadụ ibe ya n’anya. Ọ na-enyere ya aka ọbụrụgodi na o nwere ike ịta isi anyị.—Jọn 13:34; 15:13.
“Ị na-ele ihe anya otú dị mma.” Mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na mmadụ na-ele ihe anya otú dị mma, ihe ọ na-apụta bụ na onye ahụ na-eji ihe ndị Baịbụl kwuru ekpebị ihe ndị ọ na-eme. Onye na-ele ihe anya otú dị mma na-eme mkpebi ndị dị mma, ma mgbe ihe siiri ya ike. Ọ na-eme mkpebi ndị gosiri na ọ na-eche echiche otú Chineke chọrọ, na-echeta na o kwesịrị ime ihe dị Chineke mma ọ bụghị ihe ndị mmadụ chọrọ.
Ihe Ndị Gbara 2 Timothy 1:7 Gburugburu
Ọ bụ Timoti ka Pọl onyeozi degaara akwụkwọ Timoti Nke Abụọ. Ọ bụ enyi ya na onye ya na ya na-arụkọ ọrụ. N’akwụkwọ ozi a, Pọl medara obi gbaa ya ume ka o jisie ike na-emekwu nke ọma n’ozi ọma. (2 Timoti 1:1, 2) O nwere ike ịbụ na Timoti bụ onye ihere, ya emezie ka ọ ghara ịna-esoro ụmụnna eme ihe niile ha na-eme. (1 Timoti 4:12) Ma Pọl chetaara Timoti na o nwere onyinye e nyere ya, onyinye a bụ ọrụ pụrụ iche e nyere ya n’ọgbakọ. Pọl gwakwara Timoti ka ọ ghara ịla azụ mgbe ọ bụla o kwesịrị ịrụ ọrụ ya ka okenye ọgbakọ, mgbe ọ na-ezi ozi ọma nakwa mgbe a na-akpagbu ya n’ihi okwukwe ya.—2 Timoti 1:6-8.
Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Timoti ka Pọl degaara akwụkwọ ozi a, o mere ka obi sie ndị niile chọrọ ife Chineke taa ike na ọ ga-enyere ha aka n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara ha.