IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ALỤMDI NA NWUNYE
Na-ewepụtanụ Ezigbo Oge Unu Ga-eji Na-anọrị
Ọtụtụ ndị di na nwunye achọpụtala na ha na ibe ha anaghị ekwurịta okwu nke ọma ọ bụrụgodị na ha nọkọtara ọnụ. Olee ihe ndị na-akpata ya?
Gịnị mere o ji adị ka anyị anọghị ibe anyị nso n’agbanyeghị na anyị nọkọtara ọnụ?
Ike ọgwụgwụ
“E nwee ohere mụ na di m ga-eji kparịta ụka, ma ọ́ bụghị na ike gwụchara yanwa ya abụrụ na ike gwụchara mụnwa. Obere ihe nwekwara ike ịkpasu m iwe ma ike gwụ m. Ọ na-akara anyị mma ilewe tiivi.”—Anna.
Ịnọ n’Ịntanet mgbe niile
“Izirịta ozi na ile vidio n’Ịntanet nwere ike iwekọrọ oge ị ga-eji mee ihe ndị ọzọ. I nwere ike ịnọ n’Ịntanet ruo ọtụtụ awa, ị tụpụbereghị di gị ma ọ bụ nwunye gị ọnụ. I nwedịrị ike ichefu na gị na ya nọ n’otu ọnụ ụlọ.”—Katherine.
Ihe na-amasị otu onye dị iche n’ihe na-amasị ibe ya
“Ọ na-abụkarị di m lọtahaala ọrụ, ya etinye isi n’ime ihe ndị na-amasị ya. Ọ dịghị njọ na ọ na-eme ihe a ma ọ lọta n’ihi na ọrụ ọ na-arụ abụghị obere ọrụ. Ma, ọ na-adị m ka ya bụrụ na anyị na-ewepụtakwu oge anọrị.”—Jane.
Ọrụ
“Ekwentị na ihe ndị yiri ya emeela ka ndị mmadụ jiri oge ha na ndị ezinụlọ kwesịrị iji na-anọrị arụ ọrụ n’ụlọ ma ha lọta ọrụ. Ọtụtụ mgbe, m na-eji oge mụ na nwunye m kwesịrị iji anọrị azaghachi ozi iimel na ozi e ziteere m n’ekwentị gbasara ọrụ m.”—Mark.
Ihe i nwere ike ime
Na-ewere ya na unu abụọ iwepụta oge na-anọrị dị ezigbo mkpa, ọ bụghị ihe unu ga-eme mgbe ọ dabara.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ihe ndị ị na-eme ọ̀ na-egosi na i ji di gị ma ọ bụ nwunye gị kpọrọ ihe karịa ọrụ gị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-amasị gị? Ọ̀ bụ mgbe i mechara ihe ndị dịịrị gị ka ị na-enwezi oge ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nọrịa?
Aro: Kpebienụ oge ndị unu ga-eji na-anọrị. Unu emela ya mgbe ọ dapụtara.
“Obi na-adị m ụtọ ma di m hazie ka e nwee ihe naanị anyị abụọ ga-emekọ ọnụ. Ọ na-eme ka m mara na ọ hụrụ m n’anya nakwa na ọ chọrọ ka mụ na ya na-anọrị. Ihe a na-emekwa ka m hụkwuo yanwa n’anya.”—Anna.
Mara mgbe i kwesịrị ịtọgbọ ekwentị gị.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “E nwere oge kwesịrị ekwesị maka ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 3:1.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ugboro ole n’ụbọchị ka ozi batara n’ekwentị gị na-adọpụ gị uche ma gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akọrị?
Aro: Gbaa mbọ ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-erikọ nri, ọ dịkarịa ala, otu ugboro n’ụbọchị. Hapụkwanụ ekwentị unu n’ọnụ ụlọ ọzọ. Oge unu ji eri nri bụ oge magburu onwe ya unu ga-eji kparịta ihe mere n’ụbọchị.
Mgbe ọ bụla o kwere omume, gakọọnụ ahịa ọnụ ma ọ bụ rụkọọnụ ọrụ ndị dị n’ụlọ ọnụ.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Abụọ dị mma karịa otu n’ihi na a ga-akwụ ha ezigbo ụgwọ ọrụ maka ọrụ ha na-arụsi ike.”—Ekliziastis 4:9.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ugboro ole ka naanị otu onye n’ime unu na-aga ahịa azụ ihe ndị unu chọrọ?
Aro: Na-enyerịtaranụ ibe unu aka na-eme ihe ụfọdụ, ọ bụrụgodị ihe otu onye ga-emeli naanị ya.
“Werenụ ịgakọ ahịa ọnụ, ịsakọ efere ọnụ, ịpịakọ ákwà ọnụ, ịgbakọ aka edebe gburugburu ụlọ unu ọcha, ka oge unu ji anọrị, kama iwere ha ka naanị oge e ji arụ ọrụ ụlọ.”—Nina
Atụla anya ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mee ihe ọ na-agaghị emeli.
Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.”—Ndị Filipaị 4:5.
Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma a bịa n’ihe ị na-atụ anya ya n’aka di gị ma ọ bụ nwunye gị?
Aro: Wepụtanụ oge kparịta ihe onye nke ọ bụla chọrọ ịna-eji oge ya eme. Kpebienụ ihe ga-adị onye ọ bụla n’ime unu mma, nakwa ihe unu abụọ ga-eji obi unu niile kwadoo.
“Ume juru di m n’ahụ́, mana ọrịa m na-arịa na-eme ka ike na-agwụcha m. Ọtụtụ mgbe, m na-agwa di m ka ọ pụọ gaa megaa ahụ́, na anyị ga-ahụ ma ọ lọta. M na-anọ n’ụlọ zurutụ ike m chọrọ izu, di m apụọkwanụ gaa megaa ahụ́ ọ chọrọ imega. Obi na-adị anyị ụtọ na onye nke ọ bụla mere ihe ga-adị ahụ́ ya mma.”—Daniela.
Ihe di na nwunye ga-ekwurịta
Onye nke ọ bụla n’ime unu buru ụzọ zaa ajụjụ ndị a n’onwe ya. Unu mechaa, unu ekwurịtazie ihe ndị unu zara.
A bịa n’ihe gbasara unu abụọ iwepụta ezigbo oge na-anọrị, olee otú ị ga-asị na unu na-eme ugbu a?
Olee ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme ugbu a ka unu nwee ike ịna-anọrị, nke ị chọrọ iji maka ya jaa ya mma?
Olee ebe ị ga-achọ ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mezikwuo ihe na ya?
Ugboro ole ka ekwentị na-eme ka ị ghara itinye uche n’ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-agwa gị?
Olee otú unu abụọ ga-esi gosi na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma a bịa n’ihe unu chọrọ ka ibe unu na-eme.
Olee ebe ndị onye nke ọ bụla n’ime unu nwere ike imezikwu ihe n’izu a ka unu nwee ike ịnọrị n’enweghị ihe ọ bụla ga-adọpụ unu uche?