Gaa n'Isiokwu


KA MMADỤ NYERE GỊ AKA ỊMỤ BAỊBỤL

Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi

Anyị na gị mụwa Baịbụl, ị gaghị akwụ ụgwọ, ị ga-amatakwa azịza ajụjụ ndị dị ka:

  • Olee otú m ga-esi na-enwe obi ụtọ ná ndụ?

  • È nwere mgbe ihe ọjọọ na ahụhụ ga-akwụsị?

  • È nwere mgbe m ga-ahụ ndị nwụnahụrụ m ọzọ?

  • Chineke ọ̀ na-eche gbasara m?

  • Olee otú m ga-esi kpee ekpere ka Chineke nụ ya?

Ị Gaghị Akwụ Ụgwọ

A ga-enye gị ihe niile ị ga-eji na-amụ ya n’akwụghị ụgwọ ọ bụla, dị ka akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Anyị ga-enyekwa gị Baịbụl ma ọ bụrụ na ị chọrọ ya.

Ọ dị gị n’aka

Anyị na gị nwere ike ịna-amụ ihe n’ekwentị ma ọ bụ ihe yiri ya ma ọ bụkwanụ ihu na ihu, n’ebe ị chọrọ nakwa n’oge dị gị mma.

Iwu Ejighị Gị

I nwere ike ịkwụsị ya mgbe ọ bụla ị chọrọ, anyị agaghị amanye gị ịna-amụ ihe.

Olee otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?

A ga-enwe onye gị na ya ga na-amụ ihe ka o nyere gị aka ịmata ihe Baịbụl na-akụzi, unu mụchaa otu isiokwu, unu agafee n’ọzọ. Aha akwụkwọ anyị na gị ga-eji na-amụ ihe bụ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Ka anyị na-amụ ya, ị ga na-amata ihe Baịbụl na-ekwu na otú o nwere ike isi nyere gị aka. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya, lee vidio a ma ọ bụkwanụ gị agaa ebe a zara ajụjụ dị iche iche ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Baịbụl anyị na ndị mmadụ na-amụ.

Ị̀ ga-achọ ịhụ otú akwụkwọ ahụ anyị na ndị mmadụ ji amụ Baịbụl dị?

Legodị isiokwu ndị dị ná mbido a.

Ị̀ dịla njikere ịmalite?

Pịa ebe a ka ị gwa anyị ụbọchị ị chọrọ ka anyị na gị malite ịmụ Baịbụl.