Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 1: M̀ Dịla Njikere Mụ na Mmadụ Ịkpawa?

Nwoke na Nwaanyị Ịkpa—Nke 1: M̀ Dịla Njikere Mụ na Mmadụ Ịkpawa?

 Gịnị ka nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara?

 Ụfọdụ na-ewere nwoke na nwaanyị ịkpa ka naanị ihe mmadụ ji eme onwe ya obi ụtọ. Ma n’isiokwu a, nwoke na nwaanyị ịkpa pụtara oge ha abụọ na-ele ibe ha iji mara ma ọ̀ ga-adabara ha ịlụ di na nwunye. Ihe a pụtara na e nwere ihe nwoke na nwaanyị kwesịrị ibu n’obi mgbe ha na-akpa. Ọ bụghị ihe mmadụ na-eme naanị maka na obi ya dị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nọ.

 Ka oge na-aga, nwoke na nwaanyị na-akpa kwesịrị ikpebi ma hà ga-alụ ma hà ga-akwụsị ịkpa. Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-akpa, i kwesịrị ịdị njikere maka otu n’ime ihe abụọ ahụ.

 Ihe i kwesịrị iburu n’obi: Ọ bụrụ na i chere na ị dịla njikere ka gị na mmadụ kpawa, o kwesịkwara ịbụ na ị dịla njikere ịlụ di ma ọ bụ nwunye.

Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị na-akpa ma ha ebughị n’obi imecha lụọ di na nwunye, ọ dị ka ebe mmadụ gara ịchọ ọrụ ọ na-ebughị n’obi ịrụ

 Ị̀ dịla njikere ka gị na mmadụ kpawa?

 Nwoke na nwaanyị kpawa, ha nwere ike imecha lụọ. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ka i chee banyere àgwà ndị ị na-akpa ndị ga-eme ka ihe gaara unu ọfụma ma ọ bụ nke nwere ike ịkpatara unu nsogbu. Dị ka ihe atụ, chebagodịrị ihe ndị a echiche:

  •   Otú i si emeso ndị ezinụlọ unu. Otú i si emeso nne na nna gị na ụmụnne gị, karịchaa mgbe ihe siiri gị ike, ga-egosi otú ị ga-esi na-emeso onye ị ga-alụ.

     Ihe Baịbụl kwuru: Kwụsịnụ inwe ụdị obi ilu ọ bụla, iwe, ọnụma, iti mkpu, ịkparị mmadụ, na ihe ọjọọ niile.”​—Ndị Efesọs 4:31.

     Jụọ onwe gị, sị: ‘Nne na nna m na ụmụnne m hà ga-asị na m na-akwanyere ha ùgwù? Mụ na onye ọ bụla n’ime ha nwee nghọtahie, m̀ na-ewetuli obi ala ka anyị kwuo banyere ya, ka iwe ọ̀ na-ewe m, mụ na onye ahụ arụwa ụka?’

    Ọ bụrụ na ị gaghị edozili esemokwu gị na ndị mụrụ gị nwere, i mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị̀ ga-edozili esemokwu unu abụọ ga-enwe?

  •   Ime ihe ndị ọzọ chọrọ. Ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, i kwesịrị ịna-eche banyere ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị chọrọ ma na-emekwara ya ihe ọ chọrọ kama ime ihe gịnwa chọrọ.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ka onye ọ bụla na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị yanwa uru.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

     Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-achọkarị ka e mee ihe m chọrọ? Ndị ọzọ hà na-ele m anya ka onye na-echebara ndị ọzọ echiche? Olee otú m sirila gosi na m na-eche banyere mkpa ndị ọzọ karịa nke m?’

  •   Ịdị umeala n’obi. Ezigbo di ma ọ bụ nwunye ga na-ekweta ihe o mejọrọ ma jiri obi ya niile rịọ mgbaghara.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Anyị niile na-emejọ ihe ọtụtụ ugboro.”​—Jems 3:2.

     Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ekweta ihe m mejọrọ, ka m̀ na-ekwuwe ihe mere m ji mejọọ ihe? Iwe ọ̀ na-ewe m ma mmadụ gwa m ebe m ga-emekwu nke ọma?’

  •   Ego. Ego bụ otu ihe na-eme ka di na nwunye na-arụ ụka. N’ihi ya, ị ga-ezere esemokwu ma ọ bụrụ na ị ma otú e kwesịrị isi na-ele ego anya.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya?”​—Luk 14:28.

     Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ejideli onwe m ma a bịa n’imefu ego, ka m̀ na-ejikarị ụgwọ? Olee otú m sirila gosi na m ma otú e kwesịrị isi na-ele ego anya?’

  •   Ihe gbasara ofufe Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, i kwesịrị inwe oge ị haziri ị ga-eji na-amụ Baịbụl ma na-agakwa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst.

     Ihe Baịbụl kwuru: “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha na-enwe obi ụtọ.”​—Matiu 5:3.

     Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-agba mbọ ime ka okwukwe m sie ike? Ọ̀ bụ ihe ndị m na-eme iji fee Chineke kacha m mkpa ná ndụ ka m̀ na-ekwe ka ihe ndị ọzọ mee ka m ghara ịna-eme ha?’

 Ihe ị ga-eburu n’obi: I kwesịrị ịna-emete di gị ma ọ bụ nwunye gị mma. Ọ bụ ihe ruuru ya. Ọ bụrụ na ị na-agba mbọ ịbụ ezigbo di ma ọ bụ nwunye, onye na-agbakwa mbọ ka gị ga-enwe mmasị n’ebe ị nọ.