Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Obi Dara M Mbà?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Ọ Bụrụ na Obi Dara M Mbà?

 Gịnị ka ị ga-eme?

 Tụlegodị ihe atụ ndị a:

 O nweghịzi ihe na-eme ka obi dị otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jennifer mma. Ọ na-ebe ezigbo ákwá kwa ụbọchị n’enweghị ihe kpatara ya. Ọ naghị ekwusara ndị mmadụ okwu, ọ naghịkwa ekwe eri nri. Ihi ụra na-esiri ya ike, uche ya anaghịkwa adị n’ihe ọ bụla ọ na-eme. Ọ nọkata ya echewe sị: ‘Gịnịdị na-eme m? M ka ga-enwetakwa onwe m?’

 Otu nwa okorobịa aha ya bụ Mak bụbu onye e ji ama atụ n’ụlọ akwụkwọ ha. Ma ugbu a, ịga akwụkwọ na-ewe ya iwe, ọ na-ebuzi klas n’isi ma e lewe ule. Ọ naghịzi egwu egwuregwu ndị na-amasịbu ya. Ihe ahụ gbagwojuru ndị enyi ya anya. Ndị mụrụ ya na-echegbukwa onwe ha maka ya. Ò nwere mgbe ọ ga-etofe ihe a, ka ọ̀ bụ otú ọ ga-adịzi?

 Ọ̀ na-adịkarị gị otú ahụ ọ dị Jennifer ma ọ bụ Mak? Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ? I nwere ike ime otu n’ime ihe abụọ ndị a:

  1.   Gbalịa mee ihe ị ga-emeli n’onwe gị

  2.   Kọọrọ ya otu onye toro eto ị tụkwasịrị obi

 O nwere ike ịdị gị ka ọ bụ gị mee nke A, karịchaa ma ọ bụrụ na ọ dịghị gị nke ịtụpụrụ mmadụ ọnụ. Mana, ọ̀ bụ ya bụ ihe kacha mma ị ga-eme? Baịbụl sịrị: “Abụọ dị mma karịa otu . . . n’ihi na ọ bụrụ na otu n’ime ha adaa, onye nke ọzọ pụrụ ikulite ibe ya. Ma olee otú ọ ga-adịrị otu onye nke ọ bụ naanị ya, bụ́ onye dara mgbe a na-enweghị onye ọzọ ga-ekulite ya?.”—Ekliziastis 4:9, 10.

 Iji maa atụ: Ka e were ya na i furu n’ime obodo ebe ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu. Ezigbo chi ejiela, ndị ị na-ahụ ebe niile bụ ndị ị na-amaghị ndị ha bụ. Gịnị ka ị ga-eme? I nwere ike ịsị ka i jiri aka gị chọwa ụzọ. Ma, ọ́ gaghị akara gị mma ịjụ onye i chere na ọ ma ebe ahụ ka o zi gị ụzọ?

 Obi ịda mmadụ mbà dị ka onye nọ ụdị ebe ahụ ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu. Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe obi nwere ike ịjọ gị njọ. Mana, ọ bụrụ na obi ajọọ gị njọ ruo ogologo oge, i kwesịrị ịgwa onye ị ma na ọ ga-enyere gị aka.

 AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Onye na-akpa iche . . . ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.”—Ilu 18:1.

 Ihe mere ime nke B ji baa uru, nke bụ ịgwa nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụkwanụ okenye ọ bụla ị tụkwasịrị obi, bụ na i nwere ike ịmụta ihe n’aka onye ụdị ihe ahụ merela.

 I nwere ike ịsị: ‘Echeghị m na nne m na nna m ma otú ọ na-adị ma obi daa mmadụ mbà.’ Mana, ị gaghị ama ma ọ bụrụ na ị gwaghị ha. Ọ bụrụgodị na ọ bụghị otu ihe ahụ na-eme gị mere ha mgbe ha bụ ọgbọ gị, o nwekwara ike ịbụ na e nwere mgbe obi dị ha otú ọ dị gị ugbu a. Ha nwekwara ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ga-enyere gị aka.

 AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ọ̀ bụ na amamihe adịghị n’etiti ndị agadi, ọ̀ bụ na nghọta adịghịkwa n’ogologo ndụ?”—Job 12:12.

 Ihe bụ isiokwu: Ọ bụrụ na ị gwa nne ma ọ bụ nna gị, ma ọ bụkwanụ okenye ọ bụla ị tụkwasịrị obi ihe na-enye gị nsogbu, o nwere ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ga-enyere gị aka.

Obi ịda mmadụ mbà dị ka mmadụ ifu ụzọ n’ebe ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịgwa ndị ọzọ ka ha zi gị ụzọ

 Ọ́ bụrụkwanụ na ọ bụ ihe ị ga-agara ụlọ ọgwụ?

 Ọ bụrụ na obi na-ajọ gị njọ kwa ụbọchị, o nwere ike ịbụ na e nwere nsogbu i nwere kwesịrị ka dọkịta lebara ya anya. O nwere ike ịbụ obi ịda mbà.

 Onye na-eto eto nwere ike iche na o nweghị ihe o mere ma obi na-ajọ ya njọ mgbe ụfọdụ, mana o nwere ike iji nwayọọ nwayọọ ghọọ nnukwu nsogbu. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-eme gị mgbe niile, na-akwụsịghị akwụsị, i nwere ike ịgwa nne na nna gị ka ị gaa ụlọ ọgwụ.

 AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị ahụ́ na-enye nsogbu.”—Matiu 9:12.

 Ihere ekwesịghị ime gị ma ọ bụrụ na ndị dọkịta asị na ịda mbà n’obi nke gị akala njọ, n’ihi na ọtụtụ ndị na-eto eto na-ada mbà n’obi, e nwekwara ike ịgwọta ya. Enyi hụrụ gị n’anya agaghị eledawa gị anya maka ya.

 Ihe Ga-enyere Gị aka: Nwee ndidi. Ọ na-ewe oge tupu onye dara mbà n’obi enweta onwe ya. Burukwa n’obi na e nwere ụbọchị ndị ọ ga-aka mma nweekwa ụbọchị ndị ọ ga-aka njọ. a

 Ihe ị ga-eme

 Ọ bụrụgodị na ị ga-agara ya ụlọ ọgwụ, a ka nwere ihe ndị i nwere ike ime ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ. Dị ka ihe atụ, imega ahụ́ mgbe niile, iri nri na-edozi ahụ́ na ihi ezigbo ụra, nwere ike inye aka mee ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ mgbe niile. (Ekliziastis 4:6; 1 Timoti 4:8) Ihe ọzọ nwekwara ike inyere gị aka bụ inwe akwụkwọ ebe ị na-edetu otu obi dị gị, ihe ndị ị chọrọ ime ga-enyere gị aka, ihe ndị na-eme ka o siere gị ike ime ha nakwa ndị nke i metara.

 Ma obi ọ̀ na-ajọkarị gị njọ, ma ọ bụ na obi adịghị gị mma n’ihi nsogbu gị na ya na-alụ, cheta na ọ bụrụ na ị gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka, meekwa ihe ndị i kwesịrị ime, obi nwere ike ịkwụsị ịna-ajọ gị njọ.

 Amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka

  •  “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”—Abụ Ọma 34:18.

  •  “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.”—Abụ Ọma 55:22.

  •  “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’”—Aịzaya 41:13.

  •  “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi.”—Matiu 6:34.

  •  “Mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

a Mgbe ọ bụla ọ batara gị n’obi ka i gbuo onwe gị, kọọrọ ya okenye ị tụkwasịrị obi n’egbughị oge. Ị chọọ ịmatakwu gbasara ya gụọ isiokwu bụ́ “Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?” dị na Teta! Eprel 2014.