Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?

Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?

 Ị̀ na-emeli ọtụtụ ihe otu mgbe?

 Ị̀ ma otú e si eme ọtụtụ ihe otu mgbe? Ọtụtụ ndị chere na ime ọtụtụ ihe otu mgbe anaghị abụrụ ndị toro n’oge a nsogbu n’ihi na a mụrụ ha n’oge ihe ndị nkà na ụzụ mepụtara juru ebe niile. Ha na-ekwu na ọ bụ ndị torola eto, bụ́ ndị ka na-amụ ihe ọgbara ọhụrụ ndị a amụ, ka ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-esiri ike. Ma, ì chere na ihe a bụ eziokwu?

 EZIOKWU ka ọ̀ bụ ỤGHA?

  •   Ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-eme ka mmadụ rụpụta ọtụtụ ihe ngwa ngwa.

  •   Ka ị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe kwa ụbọchị, ka ị ga na-amụtakwu otú e si eme ya.

  •   Ndị na-eto eto ma otú e si eme ọtụtụ ihe otu mgbe karịa ndị torola eto.

 Ọ bụrụ na i kwetara na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a bụ “eziokwu,” ọ pụtara na i kwetala ihe ndị na-abụghị eziokwu a na-ekwu gbasara mmadụ ime ọtụtụ ihe otu mgbe.

 Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara ime ọtụtụ ihe otu mgbe

 Ì chere na ị ga-emeli ihe abụọ n’otu oge? I nwere ike imeli ihe ụfọdụ otu mgbe ma ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị ahụ abụghị ihe i kwesịrị itinye uche na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-ege egwú mgbe ị na-ehicha ụlọ gị, i nwere ike ihicha ụlọ ahụ nke ọma.

 Ma, ọ bụrụ na ihe abụọ ị na-eme n’otu oge bụ ihe ndị e kwesịrị itinye uche na ha, ha abụọ nwere ike ịkụ afọ n’ala. O nwere ike ịbụ ihe a mere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Katherine ji kwuo na mmadụ ime ọtụtụ ihe otu mgbe pụtara “mmadụ imebisị ihe niile ọ na-eme n’otu oge.”

 “Mgbe mụ na mmadụ nọ na-akpa nkata, ozi batara n’ekwentị m. M malitere ịzaghachi ozi ahụ, na-agbalịkwa ige onye ahụ mụ na ya na-akpa nkata ntị. Ma, ihe mechara mee bụ na anụghị m ọtụtụ ihe onye ahụ mụ na ya na-akpa nkata kwuru, ọ fọkwara obere ka ọ bụrụ na m dejọrọ ihe niile m dere n’ozi ahụ m nọ na-azaghachi.”​—Caleb.

 Otu ọkachamara n’ihe gbasara nkà na ụzụ aha ya bụ Sherry Turkle kwuru, sị: “Anyị nwere ike iche na anyị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe, . . . ma, ihe ọ ga-akpatara anyị bụ ime ka anyị ghara itinye uche na nke ọ bụla n’ime ha. Ime ọtụtụ ihe otu mgbe na-eme ka ụbụrụ anyị na-arụ oké, nke na anyị ga-echewe na anyị na-emeta ihe ndị anyị na-eme. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ anyị na-emeta. Ihe na-akakwudị njọ.” a

 “Ọ na-abụ m na-agwa otu onye okwu, na-ezigara onye ọzọ ozi n’ekwentị n’otu mgbe ahụ, m na-eche na m na-emeta ya. Ma, mgbe anya doro m bụ mgbe m zigaara onye mụ na ya na-ezirita ozi n’ekwentị ihe m kwesịrị ịgwa onye mụ na ya na-ekwu okwu ihu na ihu.”​—Tamara.

 Onye ọ bụla na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe na-etinye onwe ya na gbalụ gbalụ. Dị ka ihe atụ, ọ na-ewe ha ọtụtụ oge iji mechaa ihe omume e nyere ha. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha ga-arụghachi ọrụ ha cheburu na ha arụchaala, ya eweekwa ha ọtụtụ oge. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe doro anya bụ na ndị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe anaghị enwe oge ha gaara eji eme ihe ndị ha chọrọ ime.

 E nwere ihe otu onye aha ya bụ Thomas Kersting kwuru bara ezigbo uru. Nwoke a bụ onye na-ahụ maka otú ụbụrụ mmadụ si arụ ọrụ, ọ na-enyekwa ụmụ akwụkwọ ndụmọdụ. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i jiri ụbụrụ mmadụ tụnyere ọbá akwụkwọ a na-etinye ihe ndị dị mkpa na ya, nke a hazikwara nke ọma, e nwere ike ịsị na ụbụrụ ndị na-emekarị ọtụtụ ihe otu mgbe ghasara aghasa.” b

 “Ọ bụrụ na ị na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe, e nwere ihe ụfọdụ dị mkpa ị ga-eleghara anya. N’ikpeazụ, ihe i mere bụ iketakwuru onwe gị ọrụ, gbuokwa oge ị na-achọbughị igbu.”​—Teresa.

Onye na-achọ ime ọtụtụ ihe n’otu oge yiri onye na-anya ụgbọala nke chọrọ itinye isi n’ụzọ abụọ n’otu oge

 Otú ka mma isi eme ihe

  •   Mee ka ọ mara gị ahụ́ ịna-eme otu ihe n’otu oge. Ime ihe a nwere ike isiri gị ike ma ọ bụrụ na ime ọtụtụ ihe n’otu oge amarala gị ahụ́. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ marala gị ahụ́ ịna-azaghachi ozi n’ekwentị mgbe ị na-amụ ihe. Ma, Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Ndị Filipaị 1:10) A bịa n’ihe ndị anyị nwere ime, e nwere ihe ndị na-aka ibe ha mkpa. N’ihi ya, kpebie nke ị ga-ebu ụzọ mee, lekwasịkwa nke ahụ anya ma hụ na i mechara ya.

     “E nwere ike iji otú mmadụ kwesịrị isi mee ike ya niile ka uche ya dịrị n’otu ihe n’otu oge tụnyere otú mmadụ ga-esi gbalịsie ike gbochie obere nwa ime ihe masịrị ya. Mgbe ụfọdụ, i kwesịrị ịrụ ahụ́ gị ụka n’agbanyeghị na o nwere ike ịkara gị mfe ịhapụ ya ka o mee ihe ahụ ọ chọrọ ime.”​—Maria.

  •   Wepụ ihe ọ bụla ga-adọpụ gị uche. Ọ̀ na-adị agụụ gị agụụ ka ị na-apị ekwentị mgbe ị na-amụ ihe? Ọ ga-aka mma ka i dowe ekwentị ahụ n’ebe ọzọ. Ọ bụrụ na tiivi dị ebe ahụ, gbanyụọ ya. Chefuokwa ihe ọ bụla gbasara ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Baịbụl kwuru, sị: “Na-ejinụ oge unu eme ihe kacha mkpa.”​—Ndị Kọlọsi 4:5.

     “Achọpụtala m na ọ na-akara m mma ime naanị otu ihe n’otu oge. Obi na-akakwa adị m ụtọ ma m mechaa otu n’ime ihe ndị m bu n’obi ime tupu mụ agafee n’ọzọ. Ọ bụ isi otú a eme ihe na-eme m ezigbo obi ụtọ.”​—Onya.

  •   Emela ihe ọzọ mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu. Ọ gaghị abara gị uru ma ị na-apị ekwentị mgbe gị na mmadụ na-ekwurịta okwu, ọ na-egosikwa na ị naghị akwanyere onye ahụ ùgwù. Baịbụl kwuru na anyị kwesịrị ịna-emere ndị ọzọ ihe anyị chọrọ ka ha na-emere anyị.​—Matiu 7:12.

     “Mgbe ụfọdụ, ọ na-abụ m na-agwa nwanne m nwaanyị okwu, ya ana-apị ekwentị ya ma ọ bụ na-ezigara mmadụ ozi. Ihe a na-afụ m ka ose. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na m na-emekwa otú ahụ mgbe ụfọdụ.”​—David.

a Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Reclaiming Conversation.

b Ihe a si n’akwụkwọ bụ́ Disconnected.