NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ
Olee Otú M Ga-esi Mụtakwuo Otú E Si Akparịta Ụka nke Ọma?
Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a
Olee uru ịkparịta ụka ihu na ihu bara?
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ịkparịta ụka ihu na ihu siri ike, na-agwụkwa ike, karịcha ma e jiri ya tụnyere izigara mmadụ ozi.
“Mmadụ ga-akpachapụrịrị anya ma o kwukwe okwu ihu na ihu maka na ọ gaghị agbanweli ihe o kwuru ma ọ bụ hichapụ ya.”—Anna
“Izigara mmadụ ozi dị ka ebe mmadụ na-ele fim e mecharala emecha ma ịkparịta ụka ihu na ihu dị ka ebe mmadụ na-ele fim mgbe ahụ a na-eme ya. Mgbe ọ bụla mụ na mmadụ na-akparịta ụka, m na-agwa onwe m, sị, ‘Marakwa ihe ị na-ekwu.’”—Jean
Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na i kwesịrị ịmụta otú e si akparịta ụka ihu na ihu. Dị ka ihe atụ, ọ ga-abara gị uru ma ị chọwa imete ndị enyi, ma ị chọọ inweta ọrụ ma rụrụ ya na-aga, ma ọ bụkwanụ ma ị chọwa inweta onye gị na ya ga na-akpa maka ọlụlụ, mgbe ọ bụla i toruru ya.
Ma, ụjọ gị na ndị mmadụ ịkparịta ụka ihu na ihu ekwesịghị ịtụ gị. Ị ga-amụtalị otú e si eme ya, ọ bụrụgodị na ị bụ onye ihere.
“A ga-enwerịrị mgbe ị ga-ekwu ihe na-adabaghị adaba, obi ajọọkwa gị njọ. Tinyere ya obi ọma.”—Neal
Otú e si amalite mkparịta ụka
Jụọ ajụjụ. Chee gbasara isiokwu ga-amasị ndị mmadụ, jirizie ya malite mkparịta ụka. Dị ka ihe atụ:
“È nwere ebe ị gara n’oge ezumike gara aga?”
“Ihe ndị dị n’ebe a a na-edebe ihe n’Ịntanet amaka. Ị̀ gatụla na ya?”
“Ị̀ nụrụ gbasara . . . ?”
Ị chọọ ka ihe ị na-ekwu ruo mmadụ n’obi, kwuo gbasara ihe gị na onye ahụ nwere mmasị na ya. Dị ka ihe atụ, gị na ya ọ̀ na-aga n’otu ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na-arụ ọrụ otu ebe? Sizie n’ihe ahụ unu abụọ nwere mmasị na ya jụọ ya ajụjụ.
“Chee banyere ajụjụ ndị ị ma ga-amasị ndị mmadụ, ndị ị ga-achọkwa ịnụ otú ndị mmadụ ga-esi aza ha.”—Maritza
Ihe ị na-ekwesịghị ime: Ajụla mmadụ ajụjụ, ị jụpụ gị ajụchie. Ọ ga-adịzi ka ị na-agba ya ajụjụ. Gbaakwa mbọ ka ị ghara ịjụ mmadụ ajụjụ nwere ike imenye ya ihere. Ajụjụ ndị dị ka, “Olee ihe ị kacha atụ ụjọ?” ma ọ bụ “Gịnị mere i ji eyi uwe na-acha anụnụ anụnụ mgbe niile?” nwere ike imenye mmadụ ihere. Ajụjụ nke abụọ a nwedịrị ike ịdị ka ị na-akatọ onye ahụ.
Ihe ọzọ ị na-ekwesịghị ime ka ọ ghara ịdị ka ị na-agba onye ahụ ajụjụ bụ ikwu uche gị gbasara ajụjụ ị jụrụ ya tupu ya azaa ajụjụ ahụ ma ọ bụ mgbe ọ zachara ya. I mee ihe ndị a, mkparịta ụka gị na mmadụ agaghị adị ka ị na-agba ya ajụjụ, kama, unu abụọ ga na-ekwurịta okwu.
Ihe Baịbụl kwuru: “Ihe mmadụ na-eche n’obi ya dị ka mmiri miri emi, ma onye na-aghọta ihe ga-esepụta ya.”—Ilu 20:5
Na-ege ntị nke ọma. Mkparịta ụka gị na ndị ọzọ ga na-aga nke ọma ma ị mara otú ị ga-esi na-ege ha ntị nke ọma kama ịna-ekwu naanị okwu.
“M na-agbalị ịmụta otu ihe ọhụrụ gbasara onye mụ na ya kparịtara ụka. Anyị kpachaa, m na-agba mbọ na-echeta ihe onye ahụ kwuru ka m nwee ike ịma ajụjụ m ga-ajụ ya gbasara ihe ahụ n’oge ọzọ anyị ga-akparịta ụka.”—Tamara
Ihe ị na-ekwesịghị ime: Enyela onwe gị nsogbu banyere ihe ị ga-ekwu ma ọ zachaa. Ọ bụrụ na i gee ntị nke ọma, ị ga-esi n’ihe ọ zara mara ihe ọzọ ị ga-ekwu.
Ihe Baịbụl kwuru: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa.’—Jems 1:19.
Gosi onye gị na ya na-akparịta ụka na i ji ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na i ji onye gị na ya na-akparịta ụka kpọrọ ihe, mkparịta ụka unu ga na-atọ gị ụtọ.
“Ọ bụrụ na i mee ka onye gị na ya na-akparịta ụka chọpụta na i ji ihe ọ na-ekwu kpọrọ ihe, mkparịta ụka unu ga-adị ụtọ, ọ bụrụgodị na e nwere oge i kwuru ihe na-adabachaghị adaba.”—Marie
Ihe ị na-ekwesịghị ime: Ajụkwala mmadụ ajụjụ ihe na-agbasaghị gị. Dị ka ihe atụ, ị gwachaa mmadụ na uwe ya mara mma, onye ahụ nwere ike iwe iwe ma ị jụọ ya, sị, “Ego ole ka ị zụrụ ya?”
Ihe Baịbụl kwuru: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”—Ndị Filipaị 2:4.
Olee otú i kwesịrị isi mechie mkparịta ụka? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jọdan kwuru, sị: “Gbalịa ka i kwuo ihe dị mma iji mechie mkparịta ụka unu. Ikwu ihe dị ka ‘Ụka mụ na gị kparịtara tọrọ m ezigbo ụtọ’ ma ọ bụ ‘Ka ihe gaziere gị taa’ nwere ike ime ka ọ dị mfe unu abụọ ikwurịta okwu n’oge ọzọ.”