Gaa n'Isiokwu

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?

Olee Otú M Ga-esi Na-emeri Ọnwụnwa?

 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Mgbe m chọrọ ime ihe dị mma, ihe ọjọọ na-abata m n’obi.” (Ndị Rom 7:21) Ọ̀ dịtụla gị otú ahụ ọ dị Pọl? Ọ bụrụ otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ndị na-abịara gị ka i mee ihe ọjọọ.

 Ihe i kwesịrị ịma

 Ndị ọzọ nyewe anyị nsogbu ka anyị mee ihe ọjọọ, ọnwụnwa abịarala anyị. Baịbụl kwudịrị na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” (1 Ndị Kọrịnt 15:33) Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ike ime ka i chewe ihe ndị nwere ike ime ka ime ihe ọjọọ gụwa gị agụụ ma ọ bụdị mee ka ‘isoro ìgwè mmadụ mee ihe ọjọọ.’​—Ọpụpụ 23:2.

 “Otú o si agụ anyị agụụ ka ihe anyị masị ndị ọzọ nakwa ka ha nabata anyị nwere ike ime ka i soro ha mewe ihe ọ bụla ha na-eme, naanị ka ihe gị nwee ike ịdị ha mma.”​—Jeremy.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere imeri ọnwụnwa ji esi ike karịa ma ọ bụrụ na ị na-echegbubiga onwe gị ókè gbasara ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị?​—Ilu 29:25.

 Nke bụ́ eziokwu: Ekwela ka ihe ndị ọzọ na-eche banyere gị mee ka ị kwụsị ime ihe ndị dị mma ị na-eme.

 Ihe i nwere ike ime

 Jidesie ihe ndị i kweere aka ike. Ọ bụrụ na ị maghị ebe ị kwụ akwụ, i nwere ike ịdị ka nwa bebi ndị ọzọ ji eme ihe masịrị ha. O nweghị ihe a ga-eji tụnyere ime ihe Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Na-achọpụtanụ nke bụ́ eziokwu n’ihe niile; jidesienụ ihe dị mma aka ike.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:21) Ka ihe ndị i kweere na-edokwu gị anya, ọ ga na-adịkwuru gị mfe ijidesi ha aka ike na imeri ọnwụnwa ọ bụla ga-abịara gị ka i mee ihe dị iche n’ihe ndị ahụ i kweere.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere obi ji sie gị ike na ihe ndị Chineke gwara anyị na-eme bụ maka ọdịmma gị?

 “Achọpụtala m na mgbe ọ bụla m kwụsiri ike n’ihe m kweere ma ghara ime ihe ndị ọzọ na-anwa m ka m mee, ndị mmadụ na-akwanyere m ùgwù karịa.”​—Kimberly.

 Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Daniel. Daniel “kpebisiri ike n’obi ya” na ya agaghị emebi iwu Chineke. Ọ ga-abụ na o kpebiri ihe a mgbe ọ ka nọ n’afọ iri na ụma.​—Daniel 1:8.

Ọ bụrụ na ị maghị ebe ị kwụ akwụ, i nwere ike ịdị ka nwa bebi ndị ọzọ ji eme ihe masịrị ha

 Mara ihe ndị ị na-anaghị emeta. Baịbụl kwuru na e nwere “ihe na-agụ ndị na-eto eto agụụ,” ya bụ, ihe ndị na-akacha agụ mmadụ agụụ mgbe ọ ka na-eto eto. (2 Timoti 2:22) Ụfọdụ n’ime ha bụ agụụ mmekọahụ, ịchọ ịdị ka ibe, na mmadụ ịchọ ịna-ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme mgbe ọ na-etorubeghị imewa otú ahụ.

 Ihe ị ga-echebara echiche: Baịbụl kwuru na “ọ bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ na-anwa onye ahụ, nwata ya.” (Jems 1:14) Olee ihe na-agụ gịnwa agụụ kacha abụrụ gị ọnwụnwa?

 “Gwa onwe gị eziokwu gbasara ihe ọjọọ kacha agụ gị agụụ ime. Mee nchọnchọ gbasara otú ị ga-esi emeri ọnwụnwa ahụ, deekwa ihe ndị ị chọtara ị ga-eme ede. Ọnwụnwa ahụ bịaziere gị n’oge ọzọ, ị ga-ama otú ị ga-esi emeri ya.”​—Sylvia.

 Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Devid. Oge ụfọdụ, o mere ihe ndị ọzọ chọrọ ka o mee nakwa ihe na-agụ yanwa agụụ. Ma ọ mụtara ihe n’ihe ndị o mejọrọ ma gbaa mbọ ime ihe dị mma. Ọ rịọrọ Jehova n’ekpere, sị: “Biko, mee ka m nwee obi dị ọcha, meekwa ka ọ na-agụ m agụụ ime ihe dị mma mgbe niile.”​—Abụ Ọma 51:10.

 Kwụrụ n’ụkwụ gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị.” (Ndị Rom 12:21) Ihe a pụtara na i kwesịghị ịbụrụ ọnwụnwa anụ oriri. I nwere ike ikpebi ime ihe dị mma.

 Ihe ị ga-echebara echiche: A nwaa gị ka i mee ihe ọjọọ, olee otú i nwere ike isi kwụrụ n’ụkwu gị ma mee ihe dị mma?

 “M na-eche otú obi ga-adị m ma m mee ihe ọ bụla a nwara m ka m mee. Ọ̀ ga-eme ka obi dị m mma? O nwere ike ime ka obi dị m mma obere oge. Obi ọ̀ ka ga-adị m mma ka oge na-aga? Mba, naanị obi ọjọọ ka ọ ga na-eme m. Ọ̀ baranụ uru na m mere ihe ọjọọ ahụ? Mba.”​—Sophia

 Onye Baịbụl kọrọ akụkọ ya ị ga-eme ka ya: Pọl. Ọ bụ eziokwu na Pọl kwuru na e nwere oge ndị ihe ọjọọ na-agụ ya agụụ, ma ọ kwụụrụ n’ụkwụ ya. O kwuru, sị: “M na-ejidesi onwe m ike, na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m.”​—1 Ndị Kọrịnt 9:27.

 Nke bụ́ eziokwu: Ọ bụ gị ga-ekpebi ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla ọnwụnwa bịaara gị.

 Cheta na ọnwụnwa anaghị adịte aka. Melissa, onye dị afọ iri abụọ, kwuru, sị: “Ọtụtụ ihe ndị bụụrụ m ezigbo ọnwụnwa n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị enweghịzi ihe ha bụụrụ m ugbu a. Ihe a na-eme ka obi sie m ike na ọnwụnwa ndị na-abịara m ugbu a ga-emecha laa ka naị nakwa na otu ụbọchị, m ga-aghọta na m na-enwe ezigbo obi ụtọ maka na m meriri ọnwụnwa ndị a ugbu a.”