Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?

Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?

ISI NKE 18

Olee Otú M Ga-esi Merie Ihe Na-esiri M Ike n’Ụlọ Akwụkwọ?

“Ihe siiri m ezigbo ike n’ụlọ akwụkwọ nke na ọ na-adị m ka m bewe ezigbo ákwá.”—Sharon.

“Ihe isi ike ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ anaghị ebelata mgbe i tolitetụkwuru—naanị ihe na-emenụ bụ na ihe ndị na-akpata ha na-agbanwe.”—Jems.

Ọ̀ NA-ADỊ gị ka ndị mụrụ gị anaghị aghọta otú ihe na-esiruru gị ike n’ụlọ akwụkwọ? Ha nwere ike ịgwa gị na ị naghị akwụ ụgwọ ụlọ, na o nweghị onye ị na-akpa afọ ya, nakwa na o nweghị onye ị na-arụrụ ọrụ ị chọrọ ime ka obi dị mma. Ma, i nwere ike iche na nsogbu ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ na nsogbu ndị mụrụ gị na-enwe hà ma ọ bụkwanụ na nke gị ka nke ha.

Naanị ịga ụlọ akwụkwọ ma lọta nwere ike ịgwụ gị ike. Tara, bụ́ onye bi n’Amerịka, kwuru, sị: “A na-alụkarị ọgụ n’ime bọs ụlọ akwụkwọ anyị. Ọkwọ ụgbọala anyị na-akwụsị, gwa onye ọ bụla ka ọ rịtuo. Anyị na-anọcha nkeji iri atọ ma ọ bụ karịa.”

Ihe a niile ọ̀ na-ebi ma i ruo ụlọ akwụkwọ? Mbanụ! Ihe ị na-ahụ n’ụlọ akwụkwọ nwere ike iyi nke ndị kwuru okwu ndị dị n’okpuru ebe a:

Otú ndị nkụzi nwere ike isi mee ka ihe na-esiri gị ike.

“Ndị nkụzi anyị chọrọ ka m bụrụ ọkaibe ma na-agba onye mbụ, ma ime ka obi dị ha mma na-esiri m ike.”Sandra.

“Ndị nkụzi na-akwanye ụmụ akwụkwọ ọkụ n’ahụ́ ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, nke ka nke ma ọ bụrụ nwa akwụkwọ matụ ihe.”April.

“Ọ bụrụgodị na o nwere ezigbo ihe ị chọrọ iji ndụ gị mee, ụfọdụ ndị nkụzi ga-eme ka i yie onye iberiibe ma ọ bụrụ na ihe ị na-achụ abụghị agụmakwụkwọ ahụ ha chere na i kwesịrị ịchụ.” *Neomi.

Olee otú obi na-adị gị n’ihi otú ndị nkụzi si eme ka ihe na-esiri gị ike?

․․․․․

Otú ụmụ akwụkwọ ibe gị nwere ike isi mee ka ihe na-esiri gị ike.

“Ndị nọ na kọleji na-aka enupụ isi n’ihi na ha na-eji aka ha ekpebi ihe ha na-eme. Ma í meghị ka ha, ha asị na ị maghị ebe a nọ.”Kevin.

“Kwa ụbọchị, a na-anwa m ịṅụ mmanya na inwe mmekọahụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịjụ iso ha.”Erọn.

“Ugbu a m dị afọ iri na abụọ, ihe na-akacha esiri m ike bụ nsogbu a na-enye m inwe enyi nwoke. Ihe onye ọ bụla nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na-ajụ m bụ, ‘Olee mgbe ị ga-enwe enyi nwoke?’”Alexandria.

“A nọ na-enye m nsogbu ka mụ na otu nwatakịrị nwoke kpawa. Mgbe m jụrụ ime otú ahụ, ha sịrị na mụ na nwaanyị ibe m na-edina. Adị m naanị afọ iri mgbe ahụ!”Christa.

Olee otú obi na-adị gị n’ihi otú ụmụ akwụkwọ ibe gị si eme ka ihe na-esiri gị ike?

․․․․․

Ihe ndị ọzọ na-eme ka ihe na-esiri gị ike. Kanye na nke na-akacha esiri gị ike ma ọ bụ gị edee ihe ọzọ.

□ Ule unu na-aga ile

□ Ihe onye nkụzi nyere gị rụọ n’ụlọ

□ Ihe siri ike ndị mụrụ gị na-atụ anya ka i mee

□ Ime ihe siri ike ị tụrụ anya na ị ga-eme

□ Okwu a na-achọ gị ma ọ bụ egwuregwu iberiibe a na-egwusa gị

□ Ihe ọzọ ․․․․․

Ihe Anọ Ga-eme Ka Ihe Kwụsịtụ Isiri Gị Ike

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị otú ị ga-esi gachaa ụlọ akwụkwọ n’enwetụghị ihe ga-esiri gị ike. N’eziokwu, o nwere ike ịdị onye ihe na-esiri ezigbo ike ka à na-emegbu ya emegbu. Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Mmegbu pụrụ ime ka onye maara ihe na-eme ara ara.” (Ekliziastis 7:7) Ma, i kwesịghị ikwe ka o mee gị otú ahụ. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịmụta ihe i kwesịrị ime ma ihe siere gị ike.

Imeri ihe ndị na-esiri gị ike yiri ibu ihe dị arọ e ji emega ahụ́. Ndị na-ebu ya na-ebu ụzọ jikere ejikere. Ha anaghị ebu nke karịrị ha, ha na-ebukwa ya otú e si ebu ya. Ime ihe ndị a na-eme ka ahụ́ gbasie ha ike n’emerụghị onwe ha ahụ́. Ma, ọ bụrụ na ha emeghị ihe ndị ahụ, ha nwere ike imerụ ahụ́.

Otú ahụ ka i nwere ike imeri ihe ndị na-esiri gị ike ma rụọ ihe i kwesịrị ịrụ n’emerụghị onwe gị ahụ́. Olee otú ị ga-esi mee ya? Mee ihe ndị a:

1. Chọpụta ihe ndị na-eme ka ihe siere gị ike. Otu ilu amamihe dị na ya kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ma, i nweghị ike imeri ihe na-esiri gị ike ma ọ bụrụ na i bughị ụzọ chọpụta ihe na-akpata ya. Legodị anya n’ihe ndị ahụ ị kanyere ✔ na ha. Olee nke kacha esiri gị ike ugbu a?

2. Mee nchọnchọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe onye nkụzi nyere gị rụọ n’ụlọ na-agwụ gị ike, gụọ Isi nke 13 na nwanne akwụkwọ a bụ́ Nke 2. Ọ bụrụ na nwa klas unu na-enye gị nsogbu ka gị na ya nwee mmekọahụ, gụọ ndụmọdụ bara uru e nyere n’Isi nke 2, nke 5, na nke 15 n’akwụkwọ ahụ.

3. Egbula oge. I leghara nsogbu anya, ọ gaghị akwụsị. Kama nke ahụ, o nwere ike ịka njọ ma mekwuo ka obi ghara iru gị ala. Ozugbo i kpebiri ihe i kwesịrị ime n’ihi ihe na-echegbu gị, egbula oge. Mee ya ozugbo. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, nke gosiri na ị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru, mee ka ụmụ akwụkwọ ibe gị mara ozugbo o kwere omume. Ime otú ahụ nwere ike ime ka ihe dịtụrụ gị mfe. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Marchet kwuru, sị: “Ozugbo anyị gafere na klas ọhụrụ, m na-amalite ikwu ihe ụfọdụ m ma ga-eme ka m nwee ike ịkọwa ihe m kweere, bụ́ ihe Baịbụl kwuru. Achọpụtara m na m gbuo oge ime ka a mata na m bụ Onyeàmà Jehova, ọ na-esiri m ike ime ya. Ime ka a mara ihe m kweere na ime ihe gosiri na ọ bụ ihe m kweere nyeere m ezigbo aka n’ụlọ akwụkwọ.”

4. Chọọ onye ga-enyere gị aka. Ndị na-ebu ihe e ji emega ahụ́ nwere ndị ha na-agaghị ebuli. Gịnwa nwekwara ihe ị na-agaghị emeli. Ma, i kwesịghị ibu ibu arọ gị naanị gị. (Ndị Galeshia 6:2) Ọ ga-adị mma ma ị kọọrọ ya ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye ọzọ bụ́ Onye Kraịst ma nke a na-akọ. Gosi ha ihe ndị i dere ná mmalite isiokwu a. Gwa ha ka ha tụọrọ gị aro.

Ì Kwesịrị Ịna-echegbu Onwe Gị Mgbe Ụfọdụ?

O nwere ike isiri gị ike ikweta, ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dị mma na ị na-echegbu onwe gị mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị? Ọ na-egosi na ị na-arụsi ọrụ ike, nakwa na akọnuche gị anwụbeghị. Baịbụl kọwara onye o yiri ka o nweghị ihe ọ bụla na-echegbu ya, sị: “Ị̀ ga-edinara ala ruo ole mgbe? Olee mgbe ị ga-esi n’ụra gị bilie? Ihitụkwu ụra, irotụkwu ụra, ịkụkụkọtakwu aka nke nta wee dinara ala, ịda ogbenye gị ga-abịa dị ka onye na-apụnara mmadụ ihe, ụkọ gị ga-abịakwa dị ka onye bu ihe agha.”—Ilu 6:9-11.

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Heidi kọwara ya nke ọma, sị, “Ụlọ akwụkwọ nwere ike iyi ebe jọgburu onwe ya, ma nsogbu ndị ị na-enwe n’ebe ahụ bụkwa ụdị nsogbu ị ga-enwe mgbe ị ga-amalite ịrụ ọrụ.” N’eziokwu, imeri ihe isi ike adịghị mfe. Ma, i mee ihe i kwesịrị ime, ọ gaghị egbu gị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ ga-eme ka ị gbasikwuo ike.

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ ọ̀ ga-eme ka nsogbu gị kwụsị?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ Isi nke 20 n’akwụkwọ a.

AMAOKWU BAỊBỤL

‘Tụkwasị Chineke nchegbu gị niile, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’—1 Pita 5:7.

NDỤMỌDỤ

Kee nsogbu ndị mere ka ị na-echegbu onwe gị ụzọ abụọ, ya bụ, ndị i nwere ike ime ihe banyere ha na ndị ị na-enweghị ike ime ihe banyere ha. Buru ụzọ mee ihe i kwesịrị ime ná nsogbu ndị i nwere ike ime ihe banyere ha. Mgbe i merichara nsogbu ndị nke ahụ, ma ọ bụrụ na e nwere mgbe ị ga-emericha ha niile, ị ga-ejizi oge fọrọnụ chebara nsogbu ndị ị na-enweghị ike imeri echiche.

Ị̀ MA NA . . . ?

Ihi ụra nke ọma n’abalị ọ bụla, ya bụ, awa asatọ ma ọ dịkarịa ala, ga-enyere gị aka imeri ihe na-esiri gị ike, meekwa ka ị na-echeta ihe.

IHE M GA-EME!

Ka m nwee ike imeri ihe na-echegbu m, ekpebiela m na mgbe ọ bụla o kwere omume, m ga-alakpu ụra n’elekere ․․․․․

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․

GỊNỊ KA I CHERE?

● Gịnị mere ịchọ imetacha ihe niile ga-eji mee ka ị na-echegbukwu onwe gị?

● Ònye ka ị ga-agwa ma nsogbu mee ka isi na-agba gị ghara ghara?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 132]

“Mụ na papa m na-ekpe ekpere kwa ụbọchị tupu ya ebuga m n’ụlọ akwụkwọ. Ọ na-eme ka obi sie m ike.”—Liz

[Foto dị na peeji nke 131]

Ibuli ihe e ji emega ahụ́ otú e si ebu ya nwere ike ime ka ahụ́ gbasie gị ike, otú ahụ ka ime ihe i kwesịrị ime iji merie ihe na-esiri gị ike nwere ike ime ka obi ruo gị ala