AJỤJỤ ỌNỤ A GBARA | ANTONIO DELLA GATTA
Ihe Mere Otu Ụkọchukwu Ji Hapụ Chọọchị Ya
MGBE Antonio Della Gatta gụchara akwụkwọ afọ itoolu na Rom, e chiri ya ụkọchukwu n’afọ 1969. Ka e mechara, ọ ghọrọ onyeisi n’otu ebe a na-azụ ndị ụkọchukwu nke dị nso na Nepụls, dị n’Ịtali. N’ebe ahụ, o wepụtara oge mụọ ihe ma chebara ihe ndị ọ mụrụ echiche. Ọ chọpụtara na ihe chọọchị Katọlik na-akụziri ndị mmadụ esighị na Baịbụl. Ọ kọọrọ Teta! gbasara onwe ya na otú o si mechaa mata eziokwu banyere Chineke.
Biko, kọtụrụ anyị gbasara onwe gị mgbe ị bụ nwata.
A mụrụ m n’Ịtali n’afọ 1943. Mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwaanyị toro n’otu obere ime obodo. Nna m na-arụ ọrụ ugbo, bụrụkwa kapịnta n’ebe ahụ. Nne na nna anyị zụrụ anyị ka anyị bụrụ ezigbo ndị Katọlik.
Gịnị mere i ji chọọ ịbụ ụkọchukwu?
Mgbe m bụ nwata, ọ na-amasị m ige ndị ụkọchukwu ntị ma ha kwuwe okwuchukwu na chọọchị. Olu ha na ihe dị iche iche ha na-eme ma ha dowe mas na-atọ m ụtọ. N’ihi ya, m chọwara ịbụ ụkọchukwu. Mgbe m dị afọ iri na atọ, mama m tinyere m n’ụlọ akwụkwọ a na-ebi ebi. Ụlọ akwụkwọ a na-akwadebe ụmụtakịrị nwoke maka ịmụkwu ihe ndị ga-eme ka ha ruo eruo ịbụ ndị ụkọchukwu.
À na-akụziri unu Baịbụl ebe ahụ?
Mba. Mgbe m dị afọ iri na ise, otu n’ime ndị nkuzi m nyere m akwụkwọ kwuru gbasara naanị akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Agụrụ m ya ọtụtụ ugboro. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, agara m Rom. Ihe mere m ji gaa Rom bụ ka m gaa akwụkwọ na mahadum ndị ọ ga-abụ, m gụchaa mụ abụrụ ụkọchukwu. Ọ bụ poopu na-ekwu ihe na-eme na mahadum ndị ahụ. Amụrụ m asụsụ Latịn na Grik, mụọ gbasara filọsọfi, saịkọlọji, histri, na tiọlọji. Ọ bụ eziokwu na anyị na-agụghachi amaokwu Baịbụl ndị anyị bu n’isi ma e kwuwe okwuchukwu na Sọnde, na-anụkwa ka a na-agụ Baịbụl, ma anyị anaghị amụ Baịbụl.
Ị̀ na-akụzi ihe mgbe ahụ ịbụ onyeisi ebe ahụ a na-azụ ndị ụkọchukwu?
Ọrụ m mgbe ahụ karịchaa bụ ịhazi ihe. Ma, I did teach classes on the decrees of the Second Vatican Council.
Gịnị mere ihe ndị Katọlik na-akụzi ji mewe gị obi abụọ?
O nwere ihe atọ kpatara ya. Ha na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-anabata omume rụrụ arụ ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ na-eme. Ihe ụfọdụ ha na-akụzikwa abụghị eziokwu. Dị ka ihe atụ, olee otú Chineke hụrụ mmadụ n’anya ga-esi na-ata ya ahụhụ ebighị ebi ma ọ nwụọ? Chineke, ọ̀ chọrọ ka anyị jiri chaplet na-agụ ekpere ka egwú? *
Gịnịzi ka i mere?
Ihe a niile mere ka anya mmiri ju m anya, mụ ekpee ekpere rịọ Chineke ka o nyere m aka. Azụkwara m Babụl ndị Katọlik aha ya bụ Jerusalem Bible ma malite ịgụ ya. A ka bipụtara ya ọhụrụ n’asụsụ Ịtalian mgbe ahụ. Otu ụtụtụ Sọnde m si Mas lọta na-ekowe uwe ndị ụkọchukwu m na-eyi aga chọọchị, ụmụ nwoke abụọ sị na ha bụ Ndịàmà Jehova bịara. Mụ na ha kwuru okwu ihe karịrị otu awa. Anyị nọ na-ekwu gbasra Baịbụl na ihe o kwuru e ji ama ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ.
Olee ihe masịrị gị gbasara ụmụ nwoke abụọ ahụ?
Otú obi si sie ha ike na ihe ha kweere bụ eziokwu na otú ha si ekwu ihe dị na Baịbụl ndị Katọlik masịrị m. Onyeàmà Jehova ọzọ aha ya bụ Mario mechakwara na-achọ m na-abịa. Ọ naghị ahapụ ịbịa na nke m n’ụtụtụ Satọdee ọ bụla, ma mmiri ọ̀ na-ezo ma anwụ ọ na-acha, ọ ga-abịarịrị ma ọ kụọ elekere anya itoolu n’ụtụtụ. O nwekwara ndidi.
Gịnị ka ndị ụkọchukwu ndị ọzọ kwuru mgbe ahụ Ndịàmà Jehova na-achọ gị abịa?
M na-akpọ ha ka ha bịa soro anyị na-amụ Baịbụl, ma o nweghị onye n’ime ha ji ya kpọrọ ihe. Ma, ọ na-atọ mụnwa ụtọ. E nwere ọmarịcha ihe ndị m nọ na-amụta, dị ka, ihe mere Chineke ji hapụ ahụhụ na ihe ọjọọ juru n’ụwa. Ọ dịla anya m chọwara ịmata azịza ajụjụ a.
Ò nwere oge ndị ka gị n’ọkwá gbara mbọ ime ka ị kwụsị ịmụ Baịbụl?
N’afọ 1975, m gara Rom ugboro ugboro ka m gwa ndị isi anyị ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. Ndị ka m n’ọkwá gbara mbọ ịgbagha ihe ndị m gwara ha, ma o nweghị onye n’ime ha ji Baịbụl kwado ihe ọ na-ekwu. N’ikpeazụ, n’abalị itoolu n’ọnwa Jenụwarị afọ 1976, m degaara ndị isi anyị na Rom akwụkwọ ozi gwa ha na abụghịzi m onye Katọlik. Ka o mere abalị abụọ m degachaara ha akwụkwọ ozi ahụ, m si ebe ahụ a na-azụ ndị ụkọchukwu pụọ ma banye ụgbọ gaa ebe Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ihe a bụ nke mbụ m gara ebe ha na-amụ Baịbụl, ọ dabakwara na ọ bụ mgbakọ ọgbakọ dị iche iche bịara. Otú e si mee ihe niile ebe ahụ dị ezigbo iche n’otú anyị si eme. Onye ọ bụla nọ ebe ahụ ji Baịbụl nke ya, e nweekwa ebe onye na-ekwu okwu kpọrọ na Baịbụl mgbe ọ na-ekwu okwu, onye ọ bụla na-asapeta ya na-ele anya na nke ya ka ọ na-agụ ya.
Gịnị ka ndị ezinụlọ unu kwuru mgbe ihe a niile na-eme?
Ọtụtụ n’ime ha ekweghị m ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ma, m chọpụtara na otu nwanne m nwoke bi na Lọmbadi, dị n’ebe ugwu Ịtali, na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Mgbe m gara na nke ya, Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ nyeere m aka mụ enweta ọrụ na ụlọ. M mechakwara mee baptizim n’afọ ahụ, ghọọ Onyeàmà Jehova.
Obi dị m ụtọ na mụ na Chineke dịzi ná mma
Ị̀ na-akwa ụta maka ihe a niile merenụ?
Mbanụ. Obi dị m ụtọ na mụ na Chineke dịzi ná mma n’ihi na ihe ndị m ma gbasara ya si na Baịbụl, ọ bụghị n’uche mmadụ, ha abụghịkwa ihe ndị chọọchị na-akụzi. Ọnụ na-akakwa m ịkụziri ndị ọzọ ihe n’ihi na ihe m na-akụziri ha bụ eziokwu.
^ Baịbụl zara ajụjụ ndị a na ndị ọzọ otú doro anya. . pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA.