Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Fiji

IKWUSA OZI ỌMA NA ỊKỤZI IHE N’ỤWA NIILE

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik
  • MBA OLE DỊ NA YA 29

  • MMADỤ OLE BI NA HA 41,051,379

  • NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA HA 98,574

  • MMADỤ OLE A MỤỤRỤ BAỊBỤL 67,609

Afọ Itoolu Gara Tupu Onye Nkụzi Ha Azaa Òkù A Kpọrọ Ya

N’Ọstrelia, e nwere otu nwata nwaanyị aha ya bụ Olivia. Mgbe ọ na-aga ụlọ akwụkwọ ọta akara, ọ kpọrọ onye nkụzi ha ka ọ bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ kpọrọ ya kwa afọ, ruo afọ asatọ. N’ikpeazụ, n’afọ 2016, onye nkụzi ha kpọrọ n’ekwentị, kwuo na ya ga-abịa. Onye nkụzi ahụ kwuru na obi dị ya ụtọ maka na Olivia na-akpọ ya òkù ahụ n’afọ ọ bụla. N’ihi ya, ya na di ya bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Di ya chetara mgbe a rụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ n’ihi na ọ rụụrụ ọchịchị ime obodo ebe ahụ ọrụ. Ọ gwara ụmụnna na obi dị ya ụtọ mgbe ahụ maka otú e si hazie owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Otú ihe e mere n’abalị ụbọchị ahụ si tọọ onye nkụzi ahụ na di ya ụtọ mere ka ha soro ná ndị ikpeazụ lawaranụ.

Ọstrelia: Mgbe afọ itoolu gara, mbọ Olivia gbara rụpụtara ihe

Ọ Gụrụ Akwụkwọ Ahụ Ugboro Atọ

Otu nwoke aha ya bụ Jacintu na nwunye ya bi na Timọ-Lest. Ha bu Chọọchị Katọlik n’isi. N’ihi ya, o juru ha anya mgbe nwa nwanne Jacintu ghọrọ Onyeàmà Jehova, kwụsị iso ha aga chọọchị. Jacintu kpebiri ịgụ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? maka na ọ chọrọ igosi ya na ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi abụghị eziokwu. Ihe o bu n’obi na-agụ akwụkwọ ahụ bụ ka ọ chọpụta ihe na-abụghị eziokwu. O mechara sị nwunye ya: “Agụọla m akwụkwọ ahụ. Ma, ihe niile dị na ya dị mma.”

Nwunye ya asị ya: “Ọ ga-abụrịrị na ị gụghị ya nke ọma. Gụọ ya ọzọ. Na nke ugbu a, jiri nwayọọ gụọ ya.”

Jacintu mere otú ahụ, gwakwa nwunye ya, sị: “Ihe niile dị na ya dị mma.” Ihe ọzọ ọ sịrị nwunye ya bụ: “Ha niile si na Baịbụl. Ihe o kwudịrị banyere ife ndị nwụrụ anwụ ofufe sikwa na Baịbụl.”

Nwunye ya sịrị ya: “Gụọ ya nke ugboro atọ. Na nke ugbu a, kaa paragraf nke ọ bụla ihe. Mụọ ya nke ọma. Ọ ga-abụrịrị na ihe o kwuru abụghị eziokwu.”

Jacintu mụrụ akwụkwọ ahụ nke ọma, kaa paragraf nke ọ bụla ihe. Mgbe ọ gụchara ya nke ugboro atọ, ọ sịrị: “Ihe niile e kwuru na ya bụ eziokwu. Ihe nwa nwanne m mere dị mma.” Jacintu na Ndịàmà Jehova na-amụ ihe ugbu a.

Nwa Ya Nwaanyị Gwara Ya Okwu

Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ, nke bi na Gụwam, ziri otu nwaanyị na-asụ asụsụ Pọnpei ozi ọma, gosikwa ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Nwanna nwaanyị ahụ gwara ya na ya ga-abịa n’oge ọzọ. Ọ gaghachiri ugboro ugboro, ma ọ hụghị nwaanyị ahụ n’ụlọ. N’ihi ya, mgbe nwa nwaanyị ahụ pụtara, nwanna nwaanyị ahụ kpebiri igosi ya otu n’ime vidio ndị a kpọrọ Bụrụ Enyi Jehova. Ọ tọgburu nwa nwaanyị ahụ atọgbu. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ kụrụ aka n’oge ọzọ, mama nwa ahụ pụtara ma gee ntị nke ọma n’ozi ọma o ziri ya. Nwa ya nwaanyị gwara ya na ha kwesịrị ịgawa chọọchị nwaanyị ahụ gosiri ya vidio na-aga. Ọ dị ka ọ̀ bụ ihe mere nwaanyị ahụ ji nwee mmasị. E gosiri ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, haziekwa otú a ga-esi na-amụrụ ya ihe.

Ha “Dị Ka Atụrụ Na-enweghị Onye Na-azụ Ha”

Otu onye nlekọta sekit aha ya bụ Terence na Stella nwunye ya gara Inako, bụ́ ebe a na-enweghị ọgbakọ e kenyere ikwusa ozi ọma, na Papụa Niu Gini. Terence kwuru, sị: “Mgbe anyị ka nọ na-ehi ụra n’isi ụtụtụ n’ụbọchị nke mbụ, anyị nụrụ aka a kụrụ n’ụzọ. Ọtụtụ ndị nọ n’èzí na-eche anyị. N’ihi ya, anyị zigidere ha ozi ọma malite n’elekere isii ruo n’etiti ehihie. Anyị kwụsịrị saa ahụ́, hụzie na ọtụtụ ndị ọzọ na-echekwa anyị. N’ihi ya, anyị zigidekwara ozi ọma si n’elekere abụọ nke ehihie ruo n’ime abalị.” N’ụtụtụ echi ya, nwanna ahụ na nwunye ya kpebiri ibili n’isi ụtụtụ gawa ebe ọzọ izi ozi ọma. Ọtụtụ ndị chọkwa ha bịa n’ebe ahụ ha bi, ma ha ahụghị ha. Terence kwuru, sị: “Mgbe ha chọpụtara ebe anyị gara, ha chọ anyị bịa ebe ahụ. Anyị zigidekwara ozi ọma ruo n’etiti ehihie. Mgbe anyị laghachiri n’ebe anyị bi, ndị ọzọ nọ na-eche anyị. Ihe ahụ mere kwa ụbọchị. Ndị obodo ahụ ‘dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.’”​—⁠Mat. 9:⁠36.

Papụa Niu Gini: Ebe ndị mmadụ na-eche Terence na Stella

Onyinye Abụọ E Nyere Onye Na-agwọ Ọrịa

Otu ọsụ ụzọ nke bi na Niu Kaledonia, aha ya bụ Agnès, gakwuuru otu nwaanyị na-agwọ ya aka na-egbu ya mgbu. Mgbe nwaanyị ahụ na-agwọ Agnès, o kwuru na otú ọtụtụ ndị si na-ata ahụhụ mere ka o chewe ma Chineke ọ̀ dị obi ọjọọ. Agnès kelere Jehova n’obi ya maka ohere a o nyere ya ịgbachitere ya. N’ihi ya, o gosiri nwaanyị ahụ traktị bụ́ Ò Nwere Mgbe Nsogbu Ụwa A Ga-akwụsị? ma gụọrọ ya Mkpughe 21:​3, 4.

Nwaanyị ahụ sịrị: “Echeghị m na ebe ahụ ị gụrụ dị na Baịbụl m. Naanị ihe dị na ya bụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn.” Mgbe ọ matara na Agnès bụ Onyeàmà Jehova, o kwuru na ya ahụla Ndịàmà Jehova n’obodo ha bụ́ Chili.

Agnès chetara na a kọrọ gbasara alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Chili n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. N’ihi ya, mgbe ọ gara ọzọ na nke nwaanyị ahụ, o ji obere kọmputa ya gaa, ma gosi ya ihe ahụ e gosiri na tiivi anyị. Obi dị nwaanyị ahụ ezigbo ụtọ mgbe ọ hụrụ Betel na Ụlọ Mgbakọ dị na Chili. Agnès mechara kwuo, sị: “Lee ihe nke abụọ m chọrọ inye gị. Ọ bụ Baịbụl zuru ezu, ka i nwee ike ịgụ Mkpughe 21:​3, 4 m gụụrụ gị n’izu gara aga.” Nwaanyị ahụ maliri n’oche ya, makụọ Agnès, sị ya, “I meela nke ukwuu maka onyinye abụọ a magburu onwe ha.”

Niu Kaledonia: Ebe Agnès na-egosi nwaanyị na-agwọ ya vidio ruru ya n’obi

Mgbe Agnès gawara ọzọ, o wetaara nwaanyị ahụ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? ma kọwakwuoro ya ihe mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ n’ụwa a. Nwaanyị ahụ sịrị na ya ga-esi na Niu Kaledonia gaa ezumike na Chili nakwa na ya ga-eji akwụkwọ a gaa ka ya nwee ike ịgụcha ya.