Ịtụkwasị Jehova Obi
Ilu 3:5, 21-26; Aịza. 26:3, 4; Jere. 17:7, 8
I nwekwara ike ịgụ Ọma 34:8; 40:4, 5; Ilu 20:22; Aịza. 30:15
Ihe Baịbụl kwuru banyere ihe a:
1 Ihe 5:18-20, 22—Ihe mere ebo ụfọdụ n’Izrel ji merie ndị iro ha n’agha bụ maka na ha tụkwasịrị Jehova obi
2 Ihe 14:9-13—Mgbe ndị agha ọnụ ọgụgụ ha dị ọtụtụ karịa ndị agha Eze Esa bịara ịlụso ndị Juda agha, Esa gosiri na ya tụkwasịrị nnọọ Jehova obi mgbe ọ kpọkuru ya n’ekpere