Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Gịnị Bụ Shiol na Hedis?

Gịnị Bụ Shiol na Hedis?

N’ASỤSỤ ndị mbụ e jiri dee Bible, e ji okwu Hibru bụ́ sheʼohlʹ na okwu Grik ya na ya kwekọrọ bụ́ haiʹdes mee ihe ihe karịrị ugboro 70. Ọ dị ihe jikọtara okwu abụọ ahụ na ọnwụ. Ná nsụgharị ụfọdụ nke Bible, a sụgharịrị ha ịbụ “ala mmụọ.” Nke a abụghị nsụgharị ziri ezi. Otú ọ dị, n’ihe ka n’ọtụtụ asụsụ, e nweghị okwu ndị na-enye kpọmkwem echiche okwu Hibru na Grik ndị a na-enye. N’ihi ya, New World Translation jiri okwu ndị ahụ bụ́ “Shiol” na “Hedis” mee ihe. Gịnị ka okwu ndị a pụtara n’ezie? Ka anyị rịba ama otú e si jiri ha mee ihe n’akụkụ dị iche iche nke Bible.

Eklisiastis 9:10 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol], ebe gị onwe gị na-ala.” Nke a ọ̀ pụtara na Shiol na-ezo aka n’otu ili kpọmkwem, bụ́ ebe ọ pụrụ ịbụ na anyị liri onye anyị hụrụ n’anya? Ee e. Mgbe Bible na-ezo aka n’otu ebe kpọmkwem e liri mmadụ, ma ọ bụ n’ili, ọ na-eji okwu Hibru na Grik ndị ọzọ eme ihe, ọ bụghị sheʼohlʹ na haiʹdes. (Jenesis 23:7-9; Matiu 28:1) Bible ejighịkwa okwu ahụ bụ́ “Shiol” mee ihe maka ili e liri ọtụtụ mmadụ na ya, dị ka ili ezinụlọ.—Jenesis 49:30, 31.

Oleezi ụdị ebe “Shiol” na-ezo aka na ya? Okwu Chineke na-egosi na “Shiol,” ma ọ bụ “Hedis,” na-ezo aka n’ihe karịrị nnọọ ili e liri ọtụtụ mmadụ na ya. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa 5:14 na-ekwu na “[Shiol] emewo ka ọchịchọ mkpụrụ obi ya saa mbara, ọ saghebigawokwa ọnụ ya ókè.” Ọ bụ ezie na Shiol eloworị ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ọ na-eyikarị ka ọ̀ na-achọkwu ndị ọzọ ọ ga-elo. (Ilu 30:15, 16) N’adịghị ka ebe nkịtị a na-eli mmadụ, bụ́ nke a pụrụ ili ozu ole na ole na ya, “afọ adịghị eju [Shiol] na ebe ịla n’iyi.” (Ilu 27:20) Shiol adịghị eju eju. Afọ adịghị eju ya. Ya mere, Shiol, ma ọ bụ Hedis, abụghị ebe a pụrụ ịhụ anya. Kama, ọ bụ ili nke ihe a kpọrọ mmadụ, ebe ihe atụ, bụ́ ebe ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-ehi ụra ọnwụ.

Ihe Bible kụziri banyere mbilite n’ọnwụ na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe “Shiol” na “Hedis” pụtara. Okwu Chineke na-eji Hedis eme ihe maka ụdị ọnwụ a ga-enwe mbilite n’ọnwụ na ya. * (Ọrụ 2:31) Okwu Chineke na-egosikwa na ndị nọ na Hedis, na-agụnye, ọ bụghị nanị ndị jewooro Jehova ozi, kamakwa ọtụtụ ndị na-ejereghị ya ozi. (Mkpughe 20:13) N’ihi ya, Bible na-akụzi na a ga-enwe “mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15.

^ par. 6 N’ụzọ dị iche, e kwuru na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị a na-agaghị akpọlite n’ọnwụ nọ, ọ bụghị na Shiol, ma ọ bụ Hedis, kama “na Gehena.” (Matiu 5:30; 10:28; 23:33) Dị ka Shiol na Hedis, Gehena abụghị ebe a na-ahụ anya.