Mmadụ ò nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi?
Ị̀ ga-asị . . .
ee?
mba?
o nwere ike?
GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?
“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” —ABỤ ỌMA 37:29.
OLEE URU Ọ GA-ABARA GỊ?
Gị na ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ga na-enwe obi ụtọ, nọrọkwa n’udo n’ọdịnihu.—JEREMAYA 29:11.
Ị ga na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị obi dị gị mma taa, ya ajọwa gị njọ echi.—ABỤ ỌMA 22:26.
ÀNYỊ KWESỊRỊ IKWERE IHE A BAỊBỤL KWURU?
Eenụ! Ị chọọ ịma ihe mere anyị ji kwesị ikwere, biko leba anya n’isiokwu atọ dị n’akwụkwọ a. Isiokwu ndị ahụ bụ: