IHE NDỊ ỌZỌ A KỌWARA—NKE A
Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ
Jizọs kwuru na ndị nwere ezi obi ga-amata eziokwu ma ha nụ ya. (Jọn 10:4, 27) N’ihi ya, anyị gwawa ndị mmadụ okwu, anyị kwesịrị ịkụziri ha eziokwu Baịbụl ndị dị mfe. Ị chọọ ịkụziri mmadụ otu eziokwu, i nwere ike ịjụ ya, sị: “Ị̀ ma na . . . ?” ma ọ bụ “Ị̀ nụtụla na . . . ?” Jirizie amaokwu Baịbụl dabara adaba kọwaara ya eziokwu ahụ. Naanị ịkụziri mmadụ otu ihe dị mfe dị na Baịbụl nwere ike ịkụnye eziokwu n’obi ya. Chineke nwekwara ike ime ka o too.—1 Kọr. 3:6, 7.
ỌDỊNIHU
-
1. Ihe ndị na-eme n’ụwa taa nakwa otú ndị mmadụ si akpa àgwà na-egosi na ihe ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.—Mat. 24:3, 7, 8; Luk 21:10, 11; 2 Tim. 3:1-5.
-
2. O nweghị ihe ga-eme ka e bibie ụwa a.—Ọma 104:5; Ekli. 1:4.
-
3. A gaghịzi na-emetọ ikuku na mmiri. Ụwa ga-abụzi paradaịs.—Aịza. 35:1, 2; Mkpu. 11:18.
-
4. E nweghịzi onye ga-arịa ọrịa.—Aịza. 33:24; 35:5, 6.
-
5. Ị ga-adịli ndụ ebighị ebi n’ụwa.—Ọma 37:29; Mat. 5:5.
EZINỤLỌ
-
6. Nwoke kwesịrị ‘ịhụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya.’—Efe. 5:33; Kọl. 3:19.
-
7. Nwaanyị kwesịrị ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.—Efe. 5:33; Kọl. 3:18.
-
8. Di na nwunye ekwesịghị ịna-agba n’èzí.—Mal. 2:16; Mat. 19:4-6, 9; Hib. 13:4.
-
9. Ihe ga-agaziri ụmụaka na-asọpụrụ nne na nna ha ma na-erubere ha isi.—Ilu 1:8, 9; Efe. 6:1-3.
CHINEKE
-
10. Chineke nwere aha.—Ọma 83:18; Jere. 10:10.
-
11. Chineke si na Baịbụl na-agwa anyị okwu.—2 Tim. 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21.
-
12. Chineke anaghị emegbu mmadụ. Ọ naghị akpa ókè.—Diut. 10:17; Ọrụ 10:34, 35.
-
13. Chineke chọrọ inyere anyị aka.—Ọma 46:1; 145:18, 19.
EKPERE
-
14. Chineke chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere, na-akọrọ ya mkpa anyị.—Ọma 62:8; 65:2; 1 Pita 5:7.
-
15. Baịbụl na-akụziri anyị otú e si ekpe ekpere.—Mat. 6:7-13; Luk 11:1-4.
-
16. Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere mgbe niile.—Mat. 7:7, 8; 1 Tesa. 5:17.
JIZỌS
-
17. Jizọs bụ Onye Ozizi Ukwu, onye ndụmọdụ ya na-aba uru mgbe niile.—Mat. 6:14, 15, 34; 7:12.
-
18. Jizọs buru amụma na ihe ndị na-eme taa ga-eme.—Mat. 24:3, 7, 8, 14; Luk 21:10, 11.
-
19. Jizọs bụ Ọkpara Chineke.—Mat. 16:16; Jọn 3:16; 1 Jọn 4:15.
-
20. Jizọs abụghị Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile.—Jọn 14:28; 1 Kọr. 11:3.
ALAEZE CHINEKE
-
21. Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe.—Dan. 2:44; 7:13, 14; Mat. 6:9, 10; Mkpu. 11:15.
-
22. Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.—Ọma 2:7-9; Dan. 2:44.
-
23. Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu ụmụ mmadụ kwụsị.—Ọma 37:10, 11; 46:9; Aịza. 65:21-23.
ỊTA AHỤHỤ
-
24. Ọ bụghị Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata.—Diut. 32:4; Jems 1:13.
-
25. Ọ bụ Setan na-achị ụwa a.—Luk 4:5, 6; 1 Jọn 5:19.
-
26. Ahụhụ ị na-ata na-emetụ Chineke n’obi.—Ọma 34:17-19; Aịza. 41:10, 13.
-
27. Chineke ga-eme ka ahụhụ kwụsị n’oge na-adịghị anya.—Aịza. 65:17; Mkpu. 21:3, 4.
ỌNWỤ
-
28. Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla; ha anaghịkwanụ ata ahụhụ.—Ekli. 9:5; Jọn 11:11-14.
-
29. Ndị nwụrụ anwụ enweghị ike inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́.—Ọma 146:4; Ekli. 9:6, 10.
-
30. A ga-akpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ.—Job 14:13-15; Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
-
31. “Ọnwụ agaghịzi adị.”—Mkpu. 21:3, 4; Aịza. 25:8.
OKPUKPE
-
32. Ọ bụghị okpukpe niile na-amasị Chineke.—Jere. 7:11; Mat. 7:13, 14, 21-23.
-
33. Chineke kpọrọ ime ihu abụọ asị.—Aịza. 29:13; Maị. 3:11; Mak 7:6-8.
-
34. E ji ezigbo ịhụnanya amata ezigbo okpukpe.—Maị. 4:3; Jọn 13:34, 35.