ISIOKWU NKE 9
Jirinụ Ife Jehova Kpọrọ Ihe
“Feenụ Onye ahụ nke kere eluigwe na ụwa.”—Mkpughe 14:7
Akwụkwọ a enyerela anyị aka ịhụ na e nwere ọtụtụ ihe dị na Baịbụl ndị ga-enyere ma di ma nwunye ma ụmụ ha aka. Jehova chọrọ ka gị na ezinụlọ gị na-enwe obi ụtọ. O kwere nkwa na ọ ‘ga-atụkwasịrị gị ihe ndị ọzọ niile’ ma ị na-ebute ihe gbasara ofufe ya ụzọ. (Matiu 6:33) Ọ chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. N’ihi ya, mee ihe ọ bụla i kwesịrị ime ka gị na Chineke dịrị ná mma. O nweghị ihe ọma a ga-eji tụnyere ya.—Matiu 22:37, 38.
1 NA-EME IHE GỊ NA JEHOVA GA-EJI ADỊKWU NÁ MMA
IHE BAỊBỤL KWURU: “‘M ga-abụkwara unu nna, unu ga-abụkwara m ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom,’ ka Jehova . . . kwuru.” (2 Ndị Kọrịnt 6:18) Chineke chọrọ ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Otu n’ime ihe ga-enyere gị aka ka ị bụrụ ezigbo enyi ya bụ ikpe ekpere. Jehova gwara anyị ka anyị na-ekpe ekpere “n’akwụsịghị akwụsị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ọ chọrọ ka ị na-agwa ya ihe ọ bụla dị gị n’obi. (Ndị Filipaị 4:6) Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ gị ana-ekpekọ ekpere ọnụ, ha ga-ahụ na i jighị ife Chineke egwu egwu.
Ka ị na-agwa Chineke ihe dị gị n’obi, i kwesịkwara ịna-ege ya ntị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. (Abụ Ọma 1:1, 2) Na-echebakwara ihe ị gụtara na Baịbụl echiche. (Abụ Ọma 77:11, 12) Otú ọzọ anyị ga-esi na-ege Chineke ntị bụ ịna-agachi ọmụmụ ihe anya.—Abụ Ọma 122:1-4.
Ihe ọzọ ị ga-eme ka gị na Jehova dị ná mma bụ ịna-aga ozi ọma, na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova. Ọ bụrụ na ị na-agachi ozi ọma anya, gị na Jehova ga-adịkwu ná mma.—Matiu 28:19, 20.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Wepụtanụ oge unu ga-eji na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Wepụtakwanụ oge unu ga-eji na-ekpe ekpere kwa ụbọchị
-
Gbaa mbọ ka ị hụ na ihe kacha ndị ezinụlọ unu mkpa bụ ihe gbasara ofufe Chineke, ọ bụghị ihe e ji atụrụ ndụ
2 MEE KA OFUFE EZINỤLỌ NA-ATỌ ỤTỌ
IHE BAỊBỤL KWURU: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8) Hazienụ oge unu ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ na ihe ndị unu ga na-amụ. Unu kwesịrị ịna-enwechi ya anya. (Jenesis 18:19) Ma, e nwere ihe ọzọ unu kwesịrị ime. Ihe ọ bụla unu na-eme kwa ụbọchị kwesịrị ịna-egosi na unu ji obi unu niile hụ Chineke n’anya. Ndị ezinụlọ gị na Chineke ga-adị ná mma ma ọ bụrụ na ị na-agwa ha banyere Chineke “mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.” (Diuterọnọmi 6:6, 7) Kpebie na ị ga-eme ka onye fere Jehova n’oge ochie aha ya bụ Jọshụa. O kwuru sị: “Mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Jehova.”—Jọshụa 24:15.
IHE I NWERE IKE IME:
-
Na-enwechinụ ofufe ezinụlọ anya, na-amụkwanụ ihe ga-enyere onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu aka