Aịzaya 30:1-33
30 Jehova kwuru, sị: “Ụmụ dị isi ike ga-ata ahụhụ.+
Ha na-eme uche ha, ọ bụghị nke m.+
Ha na ibe ha na-agbakọ aka eme ihe,* ma ọ bụghị mmụọ m na-edu ha.
Ha si otú a na-eme mmehie n’elu nke ha mere eme.
2 Ha na-aga Ijipt+ n’ajụghị m ase.+
Ha na-aga ebe ahụ ka Fero chebe ha*Nakwa ka ndị Ijipt chebe ha.
3 Ma, nchebe Fero ga-echebe ha ga-eme ka ihere mee ha.
A ga-emechukwa ha ihu n’ihi nchebe ndị Ijipt ga-echebe ha.+
4 N’ihi na ndị isi ya nọ na Zoan,+Ndị na-agara ya ozi eruokwala Henes.
5 Ndị ga-emenye ha niile ihereBụ ndị na-abaraghị ha uru ọ bụla,Ndị na-anaghị enyere mmadụ aka, ndị na-anaghị abara mmadụ uru,Ndị ihe ha na-eme bụ naanị imenye ndị ọzọ ihere na ịkparị ha.”+
6 Ihe Chineke kpebiri ime anụ ọhịa ndị na-aga n’ebe ndịda:
Ha na-ebu akụ̀ ha n’elu jakị,Na-ebukwa ngwongwo ha n’azụ kamel.
Ha na-ebu ha agafe ala ahụhụ na ihe isi ike dị,Ala ọdụm ndị na-agbọ ụja juruNakwa ala ajụala na agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe* juru.
Ma, ihe ndị ahụ ha bu agaghị abara ndị mmadụ uru.
7 O nweghị uru ọ bụla aka ndị Ijipt na-enyere unu bara.+
N’ihi ya, m gụrụ ha: “Rehab,+ onye na-anọ ọdụ otu ebe n’enweghị ihe ọ na-arụ.”
8 “Ugbu a, gaa nọrọ n’ihu ha dee ya ná mbadamba ihe,Deekwa ya n’akwụkwọ,+Ka ọ dịrị maka ọdịnihu,Ka ọ bụrụ ihe akaebe ga-adịgide adịgide.+
9 N’ihi na ha bụ ndị na-enupụ isi,+ ụmụ na-aghọ aghụghọ,+Ụmụ na-achọghị ịnụ iwu* Jehova.+
10 Ha na-asị ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzila ọhụụ,’Na-asịkwa ndị amụma, ‘Unu ebuzirila anyị ihe bụ́ eziokwu n’amụma.+
Na-agwanụ anyị ihe ga-atọ anyị ụtọ ịnụ. Na-agwanụ anyị ihe dị mma ná ntị n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe unu hụrụ n’ọhụụ.+
11 Hapụnụ ụzọ unu na-aga. Tinyenụ isi n’ụzọ ọzọ.
Kwụsịnụ ịgwa anyị gbasara Onye Nsọ Izrel.’”+
12 N’ihi ya, Onye Nsọ Izrel kwuru, sị:
“Ebe ọ bụ na unu jụrụ okwu m,+Ebe ọ bụkwa na unu ji ịgha ụgha na ịghọ aghụghọ hiwe isi,Unu jikwa ha nwee olileanya,+
13 Unu ga-adị ka mgbidi gbawara agbawa,Dịkwa ka mgbidi dị elu nke huuru ehuru ma na-achọ ịda.
Ọ ga-ada na mberede, n’otu ntabi anya.
14 A ga-etiwa ya ka ebe e tiwara nnukwu ite ọkpụite kpụrụ.
A ga-akụ ya righirighi nke na a gaghịzi ahụ iberibe ya ọ bụlaA ga-eji agụta ọkụ n’ekwúMa ọ bụ nke a ga-eji kuru mmiri n’ebe apịtị dị.”*
15 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel, kwuru, sị:
“A ga-azọpụta unu ma unu lọghachikwute m, nọrọ nwayọọ ma tụkwasị m obi.
Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.”+
Ma unu achọghị ime ya.+
16 Kama, unu sịrị: “Mba, anyị ga-arịgoro n’elu ịnyịnya gbaa ọsọ.”
N’ihi ya, unu ga-agbarịrị ọsọ.
Unu kwukwara, sị: “Anyị ga-agba ịnyịnya na-efe ọsọ.”+
N’ihi ya, ndị na-achụ unu ga na-efekwa ọsọ.+
17 Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi egwu otu onye yiri ha.+
Unu ga-ejikwa maka egwu mmadụ ise yiri unu gbaa ọsọ.
Unu ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’ime unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu,Dịkwa ka ihe na-agba àmà e gwunyere n’elu ugwu.+
18 Ma, Jehova na-enwere unu ndidi* ka o meere unu amara.+
Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere.+
Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.+
Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.+
19 Mgbe ndị Zayọn ga-alọghachi Jeruselem,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu bee ákwá.+ Chineke* ga-emere unu amara mgbe ọ nụrụ ákwá unu na-ebe ka e nyere unu aka. Ọ ga-enyere unu aka ozugbo ọ nụrụ ya.+
20 Ọ bụ eziokwu na nri Jehova ga-enye unu bụ ịta unu ahụhụ, mmiri ọ ga-enyekwa unu bụ ime ka ihe siere unu ike,+ ma, Onye Ozizi unu kachanụ agaghịzi ezo onwe ya ezo. Unu ga-ejikwa anya unu hụ Onye Ozizi unu kachanụ.+
21 Ọ bụrụ na unu efuo ụzọ, tinye isi n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ unu ga-anụ olu ga-esi n’azụ na-agwa unu, sị: “Lekwanụ ụzọ.+ Na-aganụ na ya.”
22 Unu ga-emerụ ọlaọcha e ji machie arụsị dị iche iche a pịrị apị unu na-efe. Unu ga-emerụkwa ọlaedo e ji machie arụsị dị iche iche a kpụrụ akpụ unu na-efe.+ Unu ga-atụfu ha otú nwaanyị si achịfu ákwà o yi mgbe ọ nọ ná nsọ. Unu ga-asịkwa ihe ndị ahụ: “Nke unu agaala!”*+
23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge unu kụrụ mkpụrụ n’ala.+ Nri ala a ga-emepụta ga-adị mma, hiekwa nne.+ N’oge ahụ, anụ ụlọ unu ga-ata ahịhịa ná nnukwu ala ahịhịa juru.+
24 Ehi na jakị ndị e ji akọ ubi ga-ata ahịhịa dị mma, nke e ji shọvel na fọk wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma na ya.
25 N’ụbọchị a ga-egbu ọtụtụ ndị mgbe ụlọ nche dị iche iche ga-ada, iyi na olulu mmiri ga-adị ma ná nnukwu ugwu niile ma n’obere ugwu niile.+
26 N’ụbọchị Jehova ga-ekechi ọkpụkpụ ndị ya gbajiri agbaji,+ gwọọkwa ha ezigbo ahụ́ o merụrụ ha mgbe o tiri ha ihe,+ ìhè ọnwa gbazuru agbazu ga-adị ka ìhè anyanwụ. Anyanwụ ga-enyekwu ìhè okpukpu asaa+ dị ka à ga-asị na o ji otu ụbọchị chaa ihe o kwesịrị iji abalị asaa chaa.
27 Jehova* si ebe dị anya na-abịa.
Ezigbo iwe ji ya. Ígwé ojii na-enweghị atụ kpuchikwara ya.
Egbugbere ọnụ ya na-egosi na ezigbo iwe ji ya.
Ire ya dịkwa ka nnukwu ọkụ.+
28 Mmụọ* ya dị ka iyi toro eto nke na-eru mmadụ n’olu.
Ọ ga-eji myọ yọchapụta mba dị iche iche ka ihe a ga-ebibi ebibi.*
Ọ ga-ekenyekwa eriri n’agba ha+ dufuo ha.
29 Ma, abụ unu ga-abụ ga-adị ka nke unu na-abụ n’abalịUnu na-ejike* ememme.+
Obi ga-abụkwa unu sọ aṅụrịOtú obi na-abụ onye na-egbu ọjà sọ aṅụrịKa ọ na-aga n’ugwu Jehova, ka ọ gakwuru Oké Nkume Izrel.+
30 Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube.+
Ọ ga-emekwa ka a hụ mgbe ọ ga-eji ezigbo iwe jiri aka ya+ taa ndị iro ya ahụhụ.+
Ihe ndị ọ ga-eji mee ya bụ ire ọkụ nke nnukwu ọkụ+Na oké mmiri ozuzo+ na égbè eluigwe na akụ́ mmiri ígwé.+
31 Olu Jehova ndị Asiria ga-anụ ga-eme ka ezigbo ụjọ jide ha.+
Ọ ga-apịakwa ha ụtarị.+
32 Ugboro ole ọ bụlaJehova ga-apịa ndị Asiria ụtarịGa-abụ ugboro ole a ga-eji obere ịgbà na ụbọ akwara kụọ egwú.+
A ga na-akụ ya ka Chineke ji aka ya na-alụso ha agha.+
33 N’ihi na a kwadebechaala Tofet*+ ha.
A kwadebekwaara ya eze ha.+
Chineke* akwakọtala nkụ n’ebe miri emi.
Nnukwu ọkụ na nkụ hiri nne dịkwa ebe ahụ.
Ume Jehova, nke dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri,Ga-esunye ya ọkụ.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “na-achụ àjà e ji mmanya achụ.” O nwere ike ịbụ iji gosi na e nweela otu olu.
^ Na Hibru, “ka ha gbaba ebe Fero rụsiri ike.”
^ Ma ọ bụ “agwọ ọjọọ nke na-efe ọsọ.”
^ Ma ọ bụ “ntụziaka.”
^ O nwere ike ịbụ, “n’olulu mmiri.”
^ Ma ọ bụ “ọ na-agụ Jehova agụụ.”
^ Na Hibru, “Ọ.”
^ O nwere ike ịbụ, “Unu ruru unyi.”
^ Na Hibru, “Aha Jehova.”
^ Na Hibru, “ka ihe na-abaghị uru ọ bụla.”
^ Ma ọ bụ “Ume.”
^ Ma ọ bụ “na-edo onwe unu nsọ maka.”
^ E ji “Tofet” tụnyere ebe ọkụ na-ere, nke e ji ama atụ mbibi.
^ Na Hibru, “Ọ.”