Aịzaya 7:1-25

  • Ozi e ziri Eze Ehaz (1-9)

    • Shia-jeshọb (3)

  • A ga-amụ Ịmanuel iji gosi ihe ga-eme n’ọdịnihu (10-17)

  • Ihe ga-eme ndị na-anaghị efe Chineke (18-25)

7  N’oge Ehaz+ nwa Jotam nwa Ọzaya na-achị Juda, Rizin eze Siria na Pika+ nwa Remalaya eze Izrel bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha, ma ha* emerilighị ha.+  N’oge ahụ, a kọọrọ ezinụlọ Devid, sị: “Ndị agha Siria na ndị nke Ifrem agbakọọla aka.” Obi wee malite ịma Ehaz na ndị ya jijiji, otú osisi dị n’ọhịa si ama jijiji ma ifufe fewe.  Jehova wee sị Aịzaya: “Biko, gị na Shia-jeshọb* nwa gị nwoke+ gaa hụ Ehaz n’isi isi okpo mmiri nke ọdọ mmiri dị n’ebe mgbago,+ nke dị n’ụzọ e si aga ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwà.  Sị ya, ‘Echegbula onwe gị. Atụla egwu, ka obi gharakwa ịmapụ gị maka ezigbo iwe Rizin eze Siria na nwa Remalaya na-ewe.+ Ha yiri mkpirisi nkụ abụọ refọrọ erefọ ndị na-akwụ anwụrụ.  Ndị Siria na ndị Ifrem na nwa Remalaya akpaala nkata ihe ha ga-eme gị. Ha na-asị:  “Ka anyị gaa lụso Juda agha, merie ya* ma bibie ya.* Ka anyị chiekwa nwa Tabiel eze ka ọ chịwa Juda.”+   “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị enwe isi. Ọ gaghịkwa eme.   N’ihi na isi obodo Siria bụ Damaskọs. Onyeisi Damaskọs bụkwa Rizin. Tupu afọ iri isii na ise agaa,A ga-akụrisị Ifrem ka ọ gharazie ịbụ mba.+   Isi obodo Ifrem bụ Sameria.+ Onyeisi Sameria bụ nwa Remalaya.+ Ọ bụrụ na okwukwe unu esighị ike,Alaeze unu agaghị esi ike.”’” 10  Jehova gwakwara Ehaz, sị: 11  “Rịọ mụnwa bụ́ Jehova bụ́ Chineke gị ka m meere gị ihe ga-egosi na ihe ndị a ga-eme.+ Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ka o mee n’ebe miri emi ka ili,* ma ọ bụ n’ebe dị elu ka mbara igwe, m ga-emere gị ya.” 12  Ma Ehaz sịrị: “Agaghị m arịọ ihe a. Agaghịkwa m anwa Jehova ọnwụnwa.” 13  Aịzaya wee sị: “Ndị ezinụlọ Devid, biko geenụ ntị. Ọ̀ bụ na o zubeghịrị unu na unu na-akpasu mmadụ iwe? Gịnị mere unu ji na-akpasukwu Chineke iwe?+ 14  N’ihi ya, lekwanụ ihe Jehova ga-eme ga-egosi unu na ihe ndị a ga-eme: Nwa agbọghọ ga-adị ime, mụọ nwa nwoke,+ gụọ ya Ịmanuel.*+ 15  Tupu nwa ahụ etoruo mgbe ọ ga-ama otú ọ ga-esi jụ ihe ọjọọ mewe ihe ọma, ọ gaghị ahụ ihe ọzọ ọ ga-eri ma e wezụga bọta na mmanụ aṅụ. 16  N’ihi na tupu nwa ahụ etoruo ịmata otú ọ ga-esi jụ ihe ọjọọ mewe ihe ọma, obodo ndị eze abụọ ahụ unu na-atụ ụjọ ga-atọgbọrọ chakoo.+ 17  Ehaz, Jehova ga-eme ka gị na ndị gị na ezinụlọ nna gị nọrọ ndụ n’oge ihe ga-esi ike otú ọ na-esitụbeghị kemgbe ndị Ifrem hapụrụ ndị Juda nọọrọ onwe ha.+ Ọ ga-ezite eze Asiria.+ 18  “N’oge ahụ, Jehova ga-afụrụ ijiji ndị nọ n’ebe dị anya n’iyi niile na-asọnye n’osimiri Naịl Ijipt mkpọrọhịhị, fụọkwara aṅụ ndị nọ n’ala Asiria mkpọrọhịhị ka ha bịa. 19  Ha niile ga-abịakwa biri na ndagwurugwu nakwa n’ọgba nkume nakwa n’elu osisi ogwu niile nakwa n’elu ebe niile anụmanụ na-aṅụ mmiri. 20  “N’oge ahụ, Jehova ga-eji eze Asiria,+ bụ́ agụba a gbazitere agbazite, nke dị ná mpaghara Osimiri Yufretis, kpụọ gị isi na ajị ụkwụ. Ọ ga-akpụkwa afụ ọnụ gị. 21  “N’oge ahụ, mmadụ ga-azọ nwa ehi si n’ìgwè ehi ndụ, zọọkwa atụrụ abụọ ndụ. 22  Ebe ọ bụ na mmiri ara ehi ga-ehi nne, mmadụ ga na-eri bọta, n’ihi na onye ọ bụla fọrọ n’ala ahụ agaghị ahụ ihe ọzọ ọ ga-eri ma e wezụga bọta na mmanụ aṅụ. 23  “N’oge ahụ, naanị osisi ogwu na ahịhịa ga na-adị ebe ọ bụla a na-enwebu otu puku (1,000) osisi vaịn, ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku (1,000) mkpụrụ ego ọlaọcha. 24  Ndị mmadụ ga-ejikwa akụ́ na ụta gaa ebe ahụ, n’ihi na osisi ogwu na ahịhịa ga-ejupụta n’ala ahụ niile. 25  Mmadụ agaghị eru nso n’ugwu niile a na-ejibu ọ́gụ̀ abọ ahịhịa n’ihi egwu ọ na-atụ osisi ogwu na ahịhịa ndị dị ebe ndị ahụ. Ugwu ndị ahụ ga-aghọkwa ebe ehi na atụrụ na-ata ahịhịa.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “o.”
Shia-jeshọb pụtara “Naanị Ndị Fọdụrụ Ga-alọta.”
Ma ọ bụ “kụtuo mgbidi ya.”
O nwere ike ịbụ, “yie ya egwu.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ịmanuel pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.”