Abụ Ọma 132:1-18

  • Jehova họọrọ Devid, họrọkwa Zayọn

    • “Ajụla onye i tere mmanụ” (10)

    • A ga-azọpụta ndị nchụàjà bi na ya (16)

Abụ Mgbago. 132  Jehova, biko, cheta DevidNa ahụhụ niile ọ na-ata.+   Jehova, cheta otú o si ṅụọrọ gị iyi,Otú o si kwe gị bụ́ Dike na-enyere Jekọb aka nkwa, sị:+   “Agaghị m abanye n’ụlọikwuu m, n’ụlọ m.+ Agaghị m edina n’ihe ndina m, n’àkwà m.   Agaghị m ekwe ka ụra gaa m n’anya,Agaghịkwa m ehi ụra   Ruo mgbe m chọtaara Jehova otu ebe,Bụ́ ebe dị mma* Dike na-enyere Jekọb aka ga-ebi.”+   Anyị nụrụ banyere ya n’Efrata.+ Anyị chọtara ya n’oké ọhịa.+   Ka anyị bata n’ebe o bi.*+ Ka anyị kpọọ isiala n’ihu ya.*+   Jehova, biko, bilie ka gị na igbe ọgbụgba ndụ nke na-egosi na ị dị ike+Bata n’ebe ị na-anọ ezu ike.+   Ka ndị nchụàjà gị yiri ezi omume ka uwe. Ka ndị jisiri gị aka ike tiekwa mkpu ọṅụ.  10  N’ihi Devid ohu gị,Ajụla onye i tere mmanụ.+  11  Jehova aṅụọrọla Devid iyi. Ọ ga-emezurịrị ihe o kwuru, sị: “M ga-eme ka otu n’ime ụmụ gị*Nọrọ n’ocheeze gị.+  12  Ọ bụrụ na ụmụ gị emebighị ọgbụgba ndụ m,Ọ bụrụkwa na ha na-eme ihe m na-echetara ha, bụ́ ihe ndị m na-akụziri ha,+Ụmụ ha ga-anọrọkwaN’ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”+  13  N’ihi na Jehova ahọrọla Zayọn.+ Ọ bụ ebe ọ chọrọ ibi. Ọ sịrị:+  14  “Ebe a bụ ebe m ga-anọ na-ezu ike ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ebe a ka m ga-ebi+ n’ihi na ọ bụ ihe m chọrọ.  15  M ga-eji ihe oriri gọzie obodo a. M ga-eji achịcha nyejuo ndị ogbenye bi na ya afọ.+  16  M ga-azọpụta ndị nchụàjà bi na ya.*+ Ndị jisiri Chineke aka ike ga-eti mkpu ọṅụ.+  17  M ga-eme ka Devid sikwuo ike.* M meela ka e nwee onye si n’ezinụlọ onye m tere mmanụ ga na-achị.*+  18  M ga-eme ka ihere ju ndị iro ya ihu,Ma okpueze onye m tere mmanụ kpu n’isi ga na-egbuke egbuke.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “nnukwu ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “ná nnukwu ụlọikwuu ya.”
Ma ọ bụ “n’ebe ọ gbakwasịrị ụkwụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ nke afọ gị.”
Ma ọ bụ “M ga-eyiwe ndị nchụàjà ya nzọpụta dị ka uwe.”
Na Hibru, “mpi Devid puo.”
Na Hibru, “Akwadebela m ọkụ maka onye m tere mmanụ.”