Abụ Ọma 136:1-26

  • Ịhụnanya Jehova na-adịru mgbe ebighị ebi

    • Chineke ji amamihe kee eluigwe na ụwa (5, 6)

    • Fero nwụrụ n’Oké Osimiri Uhie (15)

    • Chineke na-echeta ndị nọ ná nsogbu (23)

    • Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri (25)

136  Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma.+ Ịhụnanya ya* na-adịru mgbe ebighị ebi.+   Keleenụ Chi kacha chi niile,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   Keleenụ Onyenwenụ kacha ndị nwenụ niile,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   Ọ bụ naanị ya na-eme ihe ndị dị ezigbo ịtụnanya,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+   O ji amamihe* kee eluigwe,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   Ọ gbasara ụwa n’elu mmiri,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   O kere nnukwu ihe ndị na-enye ìhè,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   O kere anyanwụ ka ọ na-enye ìhè n’ehihie,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.   O kere ọnwa na kpakpando ka ha na-enye ìhè n’abalị,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 10  O gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 11  O si n’Ijipt kpọpụta ndị Izrel,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 12  O ji aka ya siri ike+ na ike ya kpọpụta ha,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 13  O kewara Oké Osimiri Uhie ụzọ abụọ,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 14  O mere ka ndị Izrel si n’etiti ya gafere,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 15  Ọ tụbara Fero na ndị agha ya n’ime Oké Osimiri Uhie,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 16  O du ndị ya gafee ala ịkpa,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 17  O bibiri ndị eze ukwu,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 18  O gburu ndị eze dị ike,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi, 19  Ya bụ, Saịhọn+ eze ndị Amọraịt,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi, 20  Na Ọg+ eze Beshan,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 21  O nyere ndị ya ala ha ka ọ bụrụ ihe ha ketara,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi, 22  Ka ọ bụrụ ihe Izrel ohu ya ketara,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 23  O chetara anyị mgbe anyị nọ ná nsogbu,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+ 24  Ọ nọ na-anapụta anyị n’aka ndị iro anyị,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 25  Ọ na-enye ihe niile dị ndụ* nri,+N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi. 26  Keleenụ Chineke nke eluigwe,N’ihi na ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “nghọta.”
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”