Abụ Ọma 69:1-36
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ Devid.
69 Chineke, biko zọpụta m, n’ihi na mmiri na-achọ iri m.*+
2 Emikpuola m n’ime apịtị miri emi, nke ala ya na-esighị ike.+
Adakpuola m na mmiri miri emi.
Iyi na-asọsi ike eburula m.+
3 Etigidela m mkpu, ike agwụ m.+
Olu agụọla m.
Anya m anaghịzi ahụcha ụzọ ebe m nọ na-echere Chineke m.+
4 Ndị kpọrọ m asị n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha+Dị ọtụtụ karịa ntutu isi m.
Ndị chọrọ igbu m,Ya bụ, ndị iro m, bụ́ ndị aghụghọ,* adịla ọtụtụ.
Ha manyere m ka m nye ha ihe m na-ezughị ezu.
5 Chineke, ị ma nzuzu m zuzuru,Ị makwa ihe ndị m mere ikpe ji ma m.
6 Ọkaakaa Onyenwe anyị, Jehova nke ụsụụ ndị agha,Biko, ekwela ka ihere mee ndị nwere olileanya n’ebe ị nọ n’ihi m.
Biko, Chineke Izrel,Ekwela ka e menye ndị na-achọ gị ihere n’ihi m.
7 A na-akparị m n’ihi gị.+
Ihere ejula m ihu.+
8 Abụrụla m onye ọbịa n’anya ụmụnne m,Abụkwa m onye mba ọzọ n’anya ndị nne ji mụ na ha.+
9 Ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi.+
Ọ bụ m ka ndị na-akparị gị kparịrị.+
10 Mgbe m wedara onwe m* ala buo ọnụ,*A kparịrị m.
11 Mgbe m ji ákwà iru uju mere uwe,Ha ji m mere ihe ọchị.*
12 Ndị nọ n’ọnụ ụzọ ámá na-ekwu gbasara m,Ndị aṅụrụma jikwa m agụ egwú.
13 Ma Jehova, biko, ka ekpere mRuo gị ntị n’oge ị ga-emere m amara.+
Chineke, biko, n’ihi ịhụnanya gị* dị ukwuu,Za ekpere m ma gosi na ị bụ onye nzọpụta a tụkwasịrị obi.+
14 Dọpụta m n’apịtị.
Ekwela ka m mikpuo.
Napụta m n’aka ndị kpọrọ m asị,Dọpụtakwa m ná mmiri miri emi.+
15 Ekwela ka idei mmiri na-asọsi ike buru m,+Ma ọ bụ ka mmiri miri emi rie m,Ma ọ bụ ka m dakpuo n’olulu mmiri.*+
16 Jehova, biko, za m, n’ihi na ịhụnanya gị* dị mma.+
Chee ihu n’ebe m nọ maka na ị na-eme ebere nke ukwuu,+
17 Ezokwarala ohu gị ihu gị.+
Za m ngwa ngwa n’ihi na m na-ata ahụhụ.+
18 Bịa m nso napụta m.
Napụta m n’aka ndị iro m.
19 Ị ma mkparị a na-akparị m na otú e si na-emenye m ihere nakwa otú e si jiri m na-eme ihe ọchị.+
Ị na-ahụ ndị iro m niile.
20 Obi agbawaala m n’ihi mkparị a na-akparị m, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.
M nọ na-atụ anya ka e metere m ebere, ma e nweghị onye meteere m ebere.+
M nọkwa na-atụ anya ndị ga-akasi m obi, ma e nweghị onye m hụrụ.+
21 Ha nyere m nsí* kama inye m nri,+Ha nyekwara m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ mgbe mmiri na-agụ m.+
22 Ka tebụl ha bụụrụ ha ọnyà,Ka akụnụba ha bụkwaara ha ọnyà.+
23 Ka anya ha gbaa ọchịchịrị ka ha gharazie ịhụ ụzọ,Meekwa ka úkwù na-ama ha jijiji mgbe niile.
24 Wesa ha oké iwe gị,Wesakwa ha iwe gị dị ọkụ.+
25 Ka ebe ha mara ụlọikwuu* tọgbọrọ chakoo.
Ka a ghara inwe onye bi n’ụlọikwuu ha.+
26 N’ihi na ha na-achụ onye i tiri ihe ọsọ,Ha na-akọsakwa ahụhụ ndị ị merụrụ ahụ́ na-ata.
27 Mee ka ha taa ahụhụ ihe ọjọọ ha mere taruo ya n’isi,Ka ị gharakwa ile ha anya ka ndị ezi omume.
28 Ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndụ,*+Ka a gharakwa ide aha ha n’ebe e dere aha ndị ezi omume.+
29 Ma m na-ata ahụhụ, ahụ́ niile na-egbukwa m mgbu.+
Chineke, biko, jiri ike i ji azọpụta ndị gị chebe m.
30 M ga-abụ abụ too aha Chineke.
M ga-aja ya mma, keleekwa ya.
31 Ime otú a ga-amasị Jehova karịa iji oké ehi achụrụ ya àjà,Karịa oké ehi kara aka.+
32 Ndị dị umeala n’obi ga-ahụ ike Chineke wee ṅụrịa ọṅụ.
Unu ndị na-achọ Chineke, ka obi sie unu ike.
33 N’ihi na Jehova na-ege ndị ogbenye ntị,+Ọ gaghịkwa eleghara ndị ya a dọọrọ n’agha anya.+
34 Ka eluigwe na ụwa too ya.+
Ka oké osimiri na ihe niile na-agagharị n’ime ya too ya.
35 N’ihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn+Ma rụghachi obodo dị iche iche dị na Juda.
Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ, ya* abụrụ nke ha.
36 Ọ bụ ya ka ụmụ ndị ohu ya ga-eketa,+Ndị ji aha ya kpọrọ ihe+ ga-ebikwa na ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ O nwere ike ịbụ, “Mgbe m bere ákwá ma buo ọnụ.”
^ Na Hibru, “ihe e ji atụ ilu.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “n’olulu.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “ahịhịa na-egbu mmadụ.”
^ Ma ọ bụ “ụlọikwuu ha mgbidi gbara gburugburu.”
^ Ma ọ bụ “n’akwụkwọ nke ndị dị ndụ.”
^ Ya bụ, ala ahụ.