Abụ Ọma 79:1-13

  • Ekpere e kpere mgbe ndị mba ọzọ bịara ọgụ

    • ‘E ji anyị eme ihe ọchị’ (4)

    • ‘Nyere anyị aka n’ihi aha gị’ (9)

    • “Kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ okpukpu asaa” (12)

Abụ Esaf.+ 79  Chineke, ndị mba ọzọ abatala n’ala gị.+ Ha emerụọla ụlọ nsọ gị.+ Ha emeela ka Jeruselem bụrụzie obodo e bibiri ebibi.+   Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye ụmụ nnụnụ ka ha rie,Werekwa anụ ahụ́ ndị na-erubere gị isi nye anụ ọhịa.+   Ha awụfuola ọbara ha ka mmiri n’ebe niile na Jeruselem,E nweghịkwa onye fọrọnụ ga-eli ha.+   Ndị agbata obi anyị jizi anyị eme ihe ọchị.+ Ndị gbara anyị gburugburu na-akparị anyị ma na-akwa anyị emo.   Jehova, olee mgbe ị ga-akwụsị oké iwe ị na-ewe? Ị̀ ga na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?+ Olee mgbe iwe gị nke na-ere ka ọkụ ga-akwụsị?+   Wesa mba ndị na-amaghị gịNakwa alaeze ndị na-anaghị akpọku aha gị ezigbo iwe.+   N’ihi na ha ebibiela Jekọb,Meekwa ka obodo ya tọgbọrọ chakoo.+   Atala anyị ahụhụ maka ihe ọjọọ nna nna anyị hà mere.+ Meere anyị ebere ọsọ ọsọ,+N’ihi na e mechuola anyị ezigbo ihu.  Chineke, onye na-azọpụta anyị, biko, nyere anyị aka+N’ihi aha gị dị ebube. Napụta anyị ma gbaghara anyị* mmehie anyị n’ihi aha gị.+ 10  Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+ Ka anyị hụ mgbe a ga-eme ka mba niile mara Na ị bọọla ọbọ maka ọbara ndị ohu gị e gburu egbu.*+ 11  Biko, nụrụ ude onye mkpọrọ na-asụ.+ Jiri nnukwu ike* gị napụta* ndị a mara ikpe ọnwụ.+ 12  Jehova, biko, kwụọ ndị agbata obi anyị ụgwọ okpukpu asaa+ Maka mkparị ha kparịrị gị.+ 13  Mgbe ahụ, anyị bụ́ ndị gị, ndị bụ́kwa ìgwè atụrụ ị na-enye nri,+Ga na-ekele gị ruo mgbe ebighị ebi. Anyị ga-etokwa gị si n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “kpuchie.”
Na Hibru, “ọbara ndị ohu gị a wụfuru.”
Na Hibru, “ogwe aka.”
O nwere ike ịbụ, “tọhapụ.”