Abụ Ọma 80:1-19

  • A rịọrọ Chineke ka ọ nabataghachi Izrel

    • “Chineke, biko, nabataghachi anyị” (3)

    • Izrel dị ka osisi vaịn Chineke (8-15)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ e ji echeta ihe. Abụ Esaf.+ 80  Gị Onye na-azụ Izrel dị ka atụrụ, biko, gee ntị,Gị onye na-edu Josef dị nnọọ ka ìgwè atụrụ.+ Gị onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob,+Mee ka ìhè gị nwuo.   Gosi ike gị+N’ihu Ifrem na Benjamin na Manase. Bịa zọpụta anyị.+   Chineke, biko, nabataghachi anyị.+ Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+   Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, olee mgbe ị ga-akwụsị ileghara ekpere ndị gị anya n’ihi nnukwu iwe ị na-ewesa ha?+   Ị na-eme ka anya mmiri bụrụ nri ha,Ị na-emekwa ka ha na-aṅụ anya mmiri gafee ókè.   I kwere ka ndị agbata obi anyị na-agba mbọ ka ha merie anyị. Ndị iro anyị na-akwa anyị emo otú o si masị ha.+   Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nabataghachi anyị. Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+   I mere ka osisi vaịn+ si n’Ijipt pụta. Ị chụpụrụ mba dị iche iche wee kụọ ya.+   Ị sụchaara ya ebe ọ ga-epu,O wee gbanye mgbọrọgwụ ma tochie ala ahụ.+ 10  Ndò ya kpuchiri ugwu dị iche iche,Alaka ya kpuchikwara osisi sida dị iche iche Chineke kụrụ. 11  Alaka ya gbasara ruo n’oké osimiri,Ngalaba ya rukwara n’Osimiri Yufretis.+ 12  Gịnị mere i ji kwatusịa mgbidi e ji nkume rụọ, bụ́ ndị gbara osisi vaịn ahụ gburugburu,+Nke meziri ndị niile na-agafe agafe ji na-aghọrọ mkpụrụ ya?+ 13  Ézì ọhịa na-ebibi ya,Anụ ọhịa na-erikwa ya.+ 14  Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, lọghachi. Si n’eluigwe ledata anya hụrụ. Lekọta osisi vaịn a,+ 15  Bụ́ osisi i ji aka nri gị kụọ.+ Biko, lebara nwa gị nwoke anya, bụ́ onye* i mere ka ọ dịịrị gị ike.+ 16  A na-egbutu ya, gbaa ya ọkụ.+ Mba ị na-aba na-eme ka a na-ala ha n’iyi. 17  Biko, nyere onye nọ gị n’aka nri aka,Ya bụ, nwa nke mmadụ, onye i mere ka ọ dịịrị gị ike.+ 18  Anyị agaghịzi ahapụ gị. Dowe anyị ndụ, ka anyị wee na-akpọ aha gị. 19  Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nabataghachi anyị. Meere anyị amara* ka e wee zọpụta anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”
Ma ọ bụ “alaka.”
Na Hibru, “Mee ka ihu gị nwuoro anyị ìhè.”