Ozi Ọma Jọn Dere 11:1-57

  • Ọnwụ Lazarọs (1-16)

  • Jizọs kasiri Mata na Meri obi (17-37)

  • Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ (38-44)

  • A gbara izu igbu Jizọs (45-57)

11  E nwere otu nwoke na-arịa ọrịa. Aha ya bụ Lazarọs. Ọ bụ onye Betani. Ya na ụmụnne ya bụ́ Meri na Mata bi n’obodo ahụ.+  Ọ bụ Meri a bụ onye tere Onyenwe anyị mmanụ na-esi ísì ọma ma jiri ntutu isi ya hichaa ụkwụ ya.+ Ọ bụkwa ya ka Lazarọs nwanne ya nwoke na-arịa ọrịa.  Ụmụnne Lazarọs ndị nwaanyị wee zigara Onyenwe anyị ozi, sị: “Onyenwe anyị, onye ị hụrụ n’anya na-arịa ọrịa.”  Ma mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ sịrị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ ka e too Chineke,+ ka e wee si na ya too Ọkpara Chineke.”  Jizọs hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.  Ma, mgbe ọ nụrụ na Lazarọs na-arịa ọrịa, ọ nọkwuru ụbọchị abụọ n’ebe ọ nọ.  Mgbe e mechara, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaghachinụ na Judia.”  Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onye Ozizi,*+ ọ dịchabeghị anya ndị Judia chọrọ ịtụ gị nkume.+ Ị̀ na-agaghachi ebe ahụ?”  Jizọs zara, sị: “Ọ́ bụghị awa iri na abụọ ka a na-enwe ìhè n’ụbọchị?+ Ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’oge ìhè dị, ọ naghị akpọ ụkwụ n’ihe ọ bụla n’ihi na ọ na-ahụ ìhè nke ụwa a. 10  Ma ọ bụrụ na mmadụ na-ejegharị n’abalị, ọ na-akpọ ụkwụ n’ihe n’ihi na ìhè adịghị n’ime ya.” 11  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ sịrị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra,+ ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” 12  Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” 13  Ma, ihe Jizọs na-ekwu bụ na Lazarọs anwụọla. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. 14  Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: “Lazarọs anwụọla.+ 15  Ana m aṅụrị ọṅụ n’ihi unu na anọghị m n’ebe ahụ, ka unu wee kwere. Ma ka anyị gaanụ hụ ya.” 16  Tọmọs, onye a na-akpọ Ejima, wee gwa ndị na-eso ụzọ ibe ya, sị: “Ka anyị gaakwa, ka anyị soro Jizọs nwụọ.”+ 17  Mgbe Jizọs rutere, ọ hụrụ na Lazarọs anọọla ụbọchị anọ n’ili.* 18  Betani dị nso na Jeruselem. Ọ dị ihe dị ka kilomita atọ* ma e si na Jeruselem gawa ya. 19  Ọtụtụ ndị Juu bịara ịkasi Mata na Meri obi n’ihi nwanne ha nwoke nwụrụ anwụ. 20  Mgbe Mata nụrụ na Jizọs na-abịa, ọ gara izute ya. Ma Meri+ nọdụrụ n’ụlọ. 21  Mata wee gwa Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ. 22  Amakwa m ugbu a na ihe ọ bụla ị rịọrọ Chineke, Chineke ga-enye gị ya.” 23  Jizọs sịrị ya: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” 24  Mata wee sị ya: “Ama m na ọ ga-ebili mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” 25  Jizọs sịrị ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ.+ Onye nwere okwukwe na m, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. 26  Onye ọ bụla dị ndụ ma nwee okwukwe na m emekataghị nwụọ.+ Ì kwetara?” 27  O wee sị ya: “Ee, Onyenwe anyị. Ekwetara m na ị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke, Onye ga-abịa n’ụwa.” 28  Mgbe o kwuru ihe a, ọ gara kpọọ Meri nwanne ya, takwunyere ya, sị: “Onye Ozizi+ abịala. Ọ na-akpọ gị.” 29  Mgbe Meri nụrụ ya, o biliri ọsọ ọsọ gawa ịhụ ya. 30  Jizọs abatabeghị n’obodo ahụ, kama ọ ka nọ n’ebe Mata zutere ya. 31  Mgbe ndị Juu ha na Meri nọ n’ụlọ, bụ́ ndị na-akasi ya obi, hụrụ ka o biliri ọsọ ọsọ pụọ, ha sochiri ya n’ihi na ha chere na ọ na-aga n’ili*+ ịga bee ákwá. 32  Mgbe Meri rutere n’ebe Jizọs nọ ma hụ ya, ọ dara n’ụkwụ ya, sị ya: “Onyenwe anyị, a sị na ị nọ n’ebe a, nwanne m nwoke agaraghị anwụ.” 33  Mgbe Jizọs hụrụ ka ọ na-ebe ákwá, hụkwa ka ndị Juu so ya bịa na-ebe ákwá, ọ sụrụ ude,* obi ajọọkwa ya njọ. 34  O wee sị: “Olee ebe unu liri ya?” Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, bịa ka ị hụ ebe ọ bụ.” 35  Anya mmiri wee gbaa Jizọs.+ 36  Ndị Juu malitere ịsị: “Lee ka o si hụ ya n’anya.” 37  Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Ọ̀ bụ na nwoke a meghere anya onye ìsì+ enweghị ike ime ka onye a ghara ịnwụ?” 38  Jizọs sụrụ ude ọzọ, ya abịa n’ili* ahụ. N’eziokwu, ili* ahụ bụ ọgba, e jikwa nkume dọchie ọnụ ya. 39  Jizọs sịrị: “Kwapụnụ nkume a.” Mata, nwanne onye ahụ nwụrụ anwụ, sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ ga-abụ na o siwela ísì ugbu a n’ihi na o meela ụbọchị anọ.” 40  Jizọs sịrị ya: “Ọ̀ kwa m gwara gị na ọ bụrụ na i kwere, ị ga-ahụ ebube Chineke?”+ 41  Ha kwapụrụ nkume ahụ. Jizọs wee lelie anya n’eluigwe,+ sị: “Nna, ana m ekele gị na ị nụla olu m. 42  N’eziokwu, ama m na ị na-anụ olu m mgbe niile. Ma, m na-ekwu ihe a n’ihi ìgwè mmadụ a guzo gburugburu ka ha wee kwere na ọ bụ gị zitere m.”+ 43  Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o kwuziri n’oké olu, sị: “Lazarọs, pụta!”+ 44  Nwoke ahụ nwụrụ anwụ wee pụta. E kere ya ákwà n’ụkwụ na n’aka, jirikwa ákwà kechie ya ihu. Jizọs sịrị ha: “Tọpụnụ ya ákwà ka ọ lawa.” 45  N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ndị Juu, bụ́ ndị bịakwutere Meri, nwere okwukwe na Jizọs mgbe ha hụrụ ihe o mere.+ 46  Ma ụfọdụ n’ime ha gakwuuru ndị Farisii kọọrọ ha ihe Jizọs mere. 47  Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọkọtara ndị Sanhedrin* ma kwuo, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme n’ihi na nwoke a na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube?*+ 48  Ọ bụrụ na anyị hapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe na ya, ndị Rom ga-abịakwa weghara ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” 49  Ma e nwere otu onye n’ime ha aha ya bụ Kayafas.+ Ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ. Ọ sịrị ha: “Unu amaghị ihe ọ bụla. 50  Ọ̀ bụ na unu echeghị na ọ kaara unu mma ka otu onye nwụchitere mmadụ niile ọnwụ, kama a ga-ebibi mba a niile?” 51  Ma, o kwughị ihe a n’echiche nke ya, kama ebe ọ bụ nnukwu onye nchụàjà n’afọ ahụ, o si otú ahụ buo amụma na Jizọs ga-anwụ maka mba ahụ. 52  Ọ bụghị naanị maka mba ahụ, kama ka e wee chịkọta ụmụ Chineke ndị gbasasịrị agbasasị ka ha bụrụ otu. 53  Malite n’ụbọchị ahụ gawa, ha gbawara izu igbu ya. 54  N’ihi ya, Jizọs kwụsịrị ijegharị n’ebe ọtụtụ ndị* ga-ahụ ya. Ọ hapụkwara ebe ahụ gaa n’ebe dị nso n’ala ịkpa ma banye n’obodo a na-akpọ Ifrem.+ Ya na ndị na-eso ụzọ ya wee nọrọ n’ebe ahụ. 55  Ugbu a, Ememme Ngabiga+ ndị Juu eruwela nso. Ọtụtụ ndị wee si n’ime ime obodo gbagoo Jeruselem tupu Ememme Ngabiga ahụ amalite ka ha mee onwe ha ka ha dị ọcha otú Iwu* kwuru. 56  Ha nọ na-achọ Jizọs. Ka ha guzokwa gburugburu ụlọ nsọ, ha nọ na-ajụrịta ibe ha, sị: “Gịnị ka unu chere? Ọ̀ bụ na ọ gaghị abịa ememme a?” 57  Ma, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nyere iwu ka onye ọ bụla matara ebe ọ nọ mee ka ha mara, ka ha wee jide ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ihe dị ka maịl abụọ. Na Grik, “ihe dị ka stediọm 15.” Otu stediọm bụ mita 185. Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Na Grik, “ọ sụrụ ude na mmụọ ya.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “na-eme ọtụtụ ihe àmà.”
Na Grik, “ndị Juu.”
Ya bụ, Iwu Mosis.