Jona 3:1-10
3 Jehova wee gwa Jona okwu nke ugboro abụọ, sị:+
2 “Bilie, gaa Ninive+ bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ndị bi na ya okwu m na-agwa gị.”
3 Jona wee bilie gaa Ninive+ otú Jehova gwara ya.+ Ninive bụ obodo buru ezigbo ibu.* Ọ ga-ewe onye ji ụkwụ ụbọchị atọ iji gazuo ya.
4 Jona wee banye n’obodo ahụ. Ọ gara ije otu ụbọchị, na-ekwusa, sị: “Ọ fọrọ naanị ụbọchị iri anọ ka e bibie* Ninive.”
5 Ndị Ninive wee nwee okwukwe na Chineke.+ Ha kwuziri ka onye ọ bụla n’ime ha buo ọnụ ma yiri ákwà iru uju, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu.
6 Mgbe eze Ninive nụrụ ihe Jona na-ekwu, o biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, yiri ákwà iru uju ma nọdụ ala ná ntụ.
7 O nyekwara iwu ka e kwusaa n’ebe niile na Ninive, sị,“Eze na ndị isi na-eti iwu, sị: Ka onye ọ bụla ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla, ìgwè ehi ma ọ bụ ìgwè atụrụ, ghara iri ihe ọ bụla. Ka ha ghara iri nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri.
8 Ka mmadụ niile yiri ákwà iru uju, ka ha jirikwa ya kpuchie anụmanụ ha. Ka ha rịọsie Chineke arịrịọ ike, hapụ ihe ọjọọ ha na-eme ma kwụsị tigbuo zọgbuo.
9 Ònye manụ ma ezi Chineke ọ̀ ga-agbanwe obi ya n’ihe ọ chọrọ ime* ma mee ka iwe ya dị ọkụ dajụọ, ka anyị ghara ịnwụ?”
10 Mgbe ezi Chineke hụrụ ihe ha mere, otú ha si hapụ ụzọ ọjọọ ha,+ ọ gbanwere obi ya banyere ọdachi ahụ o kwuru na ya ga-eme ka ọ dakwasị ha. O wetaghịzi ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Hibru, “Chineke weere Ninive ka nnukwu obodo.”
^ Ma ọ bụ “ka a kwatuo.”
^ Ma ọ bụ “ma ihe ezi Chineke chọrọ ime ọ̀ ga-ewute ya.”