Mkpughe E Kpugheere Jọn 10:1-11
10 Ahụkwara m ka mmụọ ozi ọzọ dị ike nke yi ígwé ojii dị ka uwe si n’eluigwe na-agbadata, eke na egwurugwu dịkwa n’isi ya, ihu ya dịkwa ka anyanwụ,+ ụkwụ ya dịkwa ka ogidi ọkụ.
2 O jikwa obere akwụkwọ mpịakọta e meghere emeghe n’aka. Ọ zọkwasịkwara ụkwụ aka nri ya n’elu oké osimiri, ma zọkwasị ụkwụ aka ekpe ya n’elu ala.
3 O jikwa oké olu tie mkpu ka mgbe ọdụm gbọrọ ụja.+ Mgbe o tiri mkpu, anụrụ m olu égbè eluigwe asaa.+
4 Mgbe m nụrụ olu égbè eluigwe asaa ahụ, m nọ na-achọ ide ihe ha kwuru, ma, anụrụ m ka otu olu si n’eluigwe,+ sị: “Zochie ihe niile égbè eluigwe asaa ahụ kwuru. Edekwala ha ede.”
5 Mmụọ ozi ahụ m hụrụ nke guzo n’elu oké osimiri na n’elu ala weliziri aka nri ya elu, chee n’eluigwe.
6 Ọ ṅụkwara iyi n’aha Chineke, onye na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ onye kere eluigwe na ihe ndị dị n’ime ya, kee ụwa na ihe ndị dị n’ime ya, keekwa oké osimiri na ihe ndị dị n’ime ya.+ Ọ ṅụrụ iyi, sị: “A gaghịzi egbu oge.
7 Ma mgbe ọ fọrọ obere ka mmụọ ozi nke asaa ahụ+ fụọ opi ya,+ a ga-emezu ihe nzuzo dị nsọ+ nke bụ́ ozi ọma Chineke ziri ndị ohu ya bụ́ ndị amụma.”+
8 Anụkwara m olu ahụ si n’eluigwe+ ọzọ ka ọ na-agwa m, sị: “Gaa nara mmụọ ozi ahụ guzo n’elu oké osimiri nakwa n’elu ala+ akwụkwọ mpịakọta ahụ e meghere emeghe, nke o jikwa n’aka.”
9 M wee gakwuru mmụọ ozi ahụ, gwa ya ka o nye m obere akwụkwọ mpịakọta ahụ. Ya asị m: “Were ya taa.+ Ọ ga-enye gị nsogbu n’afọ,* ma ọ ga na-atọ ka mmanụ aṅụ n’ọnụ gị.”
10 M wee nara mmụọ ozi ahụ obere akwụkwọ mpịakọta ahụ o ji n’aka ma taa ya.+ Ọ tọrọ m ụtọ n’ọnụ ka mmanụ aṅụ.+ Ma mgbe m tachara ya, o nyere m nsogbu n’afọ.*
11 A gwakwara m, sị: “Buo amụma ọzọ gbasara ndị dị iche iche na mba dị iche iche na asụsụ dị iche iche na ọtụtụ ndị eze.”
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Na Grik, “Ọ ga-eme ka afọ luo gị ilu.”
^ Na Grik, “o mere ka afọ luo m ilu.”