Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 11

Ajụjụ nke 11: Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

“Ọ kwụsị iku ume, ọ na-alaghachi n’ájá. N’ụbọchị ahụ, ọ na-akwụsị iche echiche.”

Abụ Ọma 146:4

“Ndị dị ndụ ma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla . . . Ihe ọ bụla i nwere ike ime, jiri ike gị niile mee ya, n’ihi na i nweghị ike ịrụ ọrụ ma ọ bụ ime atụmatụ ma ọ bụ ịmụta ihe ma ọ bụ ịma ihe n’ili, bụ́ ebe ị na-aga.”

Ekliziastis 9:5, 10

“[Jizọs] sịrị: ‘Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.’ Ma, ihe Jizọs na-ekwu bụ na Lazarọs anwụọla. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. Jizọs gwaziri ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụọla.’”

Jọn 11:11, 13, 14