Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 18

Ajụjụ nke 18: Gịnị ka ị ga-eme ka gị na Chineke dị ná mma?

“Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka ụdị mmadụ niile ga-abịakwute.”

Abụ Ọma 65:2

“Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi. N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya, ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.”

Ilu 3:5, 6

“Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”

Jọn 17:3

“N’eziokwu, [Chineke] nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.”

Ọrụ Ndịozi 17:27

“Ihe m na-ekpekwa n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abakwu ụba, ka unu na-amatakwu uche Chineke nke ọma ma na-aghọtacha uche ya.”

Ndị Filipaị 1:9

“Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe, ya na-arịọ Chineke n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị ewesa ya iwe, kama ọ ga-emere ya ihe ọ rịọrọ.”

Jems 1:5

“Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso. Ndị mmehie, meenụ ka aka unu dị ọcha. Ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme, meenụ ka obi unu dị ọcha.”

Jems 4:8

“Ịhụ Chineke n’anya pụtara ịna-eme ihe ndị o nyere n’iwu, ihe ndị o nyere n’iwu esighịkwa oké ike.”

1 Jọn 5:3