Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 19

Ajụjụ nke 19: Gịnị dị n’akwụkwọ dị iche iche dị na Baịbụl?

AKWỤKWỌ NSỌ HIBRU (“AGBA OCHIE”)

PENTATUK (AKWỤKWỌ ISE):

Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ, Diuterọnọmi

Malite mgbe Chineke kere ihe ruo mgbe e nwere mba Izrel oge ochie

AKWỤKWỌ NDỊ A KỌRỌ AKỤKỌ NA HA (AKWỤKWỌ IRI NA ABỤỌ):

Joshụa, Ndị Ikpe, Rut

Otú ndị Izrel si banye n’Ala Nkwa na ihe ndị mere mgbe ha banyechara

1 Samuel na 2 Samuel, 1 Ndị Eze na 2 Ndị Eze, 1 Ihe E Mere na 2 Ihe E Mere

Akụkọ gbasara mba Izrel ruo mgbe e bibiri Jeruselem

Ezra, Nehemaya, Esta

Akụkọ gbasara ndị Juu mgbe ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn lọta

AKWỤKWỌ NDỊ E DERE N’ỤDỊ ABỤ (AKWỤKWỌ ISE):

Job, Abụ Ọma, Ilu, Ekliziastis, Abụ Solomọn

Okwu amamihe dị iche iche na abụ

AKWỤKWỌ NDỊ AMỤMA (AKWỤKWỌ IRI NA ASAA):

Aịzaya, Jeremaya, Abụ Ákwá, Ezikiel, Daniel, Hosia, Joel, Emọs, Obedaya, Jona, Maịka, Nehọm, Habakọk, Zefanaya, Hagaị, Zekaraya, Malakaị

Amụma gbasara ndị Chineke

AKWỤKWỌ NSỌ GRIK NKE NDỊ KRAỊST (“AGBA ỌHỤRỤ”)

OZI ỌMA (AKWỤKWỌ ANỌ):

Matiu, Mak, Luk, Jọn

Akụkọ ndụ Jizọs na ozi o jere n’ụwa

ỌRỤ NDỊOZI (OTU AKWỤKWỌ):

Akụkọ otú ọgbakọ Ndị Kraịst si malite na otú ha si kwusaa ozi ọma ná mba ndị ọzọ

AKWỤKWỌ OZI (AKWỤKWỌ IRI ABỤỌ NA OTU):

Ndị Rom, 1 Ndị Kọrịnt na 2 Ndị Kọrịnt, Ndị Galeshia, Ndị Efesọs, Ndị Filipaị, Ndị Kọlọsi, 1 Ndị Tesalonaịka na 2 Ndị Tesalonaịka

Akwụkwọ ozi ndị e degaara ọgbakọ Ndị Kraịst dị n’ebe dị iche iche

1 Timoti na 2 Timoti, Taịtọs, Faịlimọn

Akwụkwọ ozi ndị e degaara Timoti, nke e degaara Taịtọs, na nke e degaara Faịlimọn

Ndị Hibru, Jems, 1 Pita na 2 Pita, 1 Jọn, 2 Jọn, na 3 Jọn, Jud

Akwụkwọ ozi ndị ọzọ e degaara Ndị Kraịst

MKPUGHE (OTU AKWỤKWỌ):

Ọhụụ dị iche iche e mere ka Jọn onyeozi hụ