A7-A
Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya
Otú Ihe Ndị Dị na Matiu, Mak, Luk, na Jọn Si Mee n’Usoro
E nwere map ndị ha na chaatị ndị a so. Map ndị ahụ gosiri ebe dị iche iche Jizọs gara nakwa ebe ndị o kwusara ozi ọma. Ihe ndị yiri akụ́ e sere na map ndị ahụ anaghị egosi kpọmkwem ụzọ Jizọs si gaa n’ebe ndị ahụ, kama e ji ha egosi ụzọ e nwere ike isi gaa na ha. “dk.” pụtara “n’ihe dị ka.”
Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya
AFỌ |
EBE IHE MERE |
IHE MERENỤ |
MATIU |
MAK |
LUK |
JỌN |
---|---|---|---|---|---|---|
3 T.O.N.K. |
Jeruselem, n’ụlọ nsọ |
Mmụọ ozi Gebriel buru amụma na Zekaraya ga-amụ Jọn |
||||
dk. 2 T.O.N.K. |
Nazaret; Judia |
Mmụọ ozi Gebriel buru amụma na Meri ga-amụ Jizọs; Meri gara hụ Elizabet onye ikwu ya |
||||
2 T.O.N.K. |
Obodo Judia bụ́ ugwu ugwu |
A mụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim gụọ ya aha; Zekaraya buru amụma; Jọn ga-anọ n’ọzara |
||||
2 T.O.N.K., dk. Ọkt. 1 |
Betlehem |
A mụrụ Jizọs; “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́” |
||||
Ebe dị Betlehem nso; Betlehem |
Mmụọ ozi ziri ndị na-azụ atụrụ ozi ọma; ndị mmụọ ozi toro Chineke; ndị na-azụ atụrụ gara hụ nwa ọhụrụ |
|||||
Betlehem; Jeruselem |
E biri Jizọs úgwù (n’ụbọchị nke 8); ndị mụrụ ya ku ya gaa n’ụlọ nsọ (mgbe ụbọchị 40 gachara) |
|||||
1 T.O.N.K. ma ọ bụ 1 O.N.K. |
Jeruselem; Betlehem; Ijipt; Nazaret |
Ndị ji kpakpando akọ ọdịnihu bịara; ezinụlọ Josef gbagara Ijipt; Herọd gburu ụmụaka ndị nwoke; ha si n’Ijipt pụta biri na Nazaret 2:1-23 |
||||
12, Ememme Ngabiga |
Jeruselem |
Mgbe Jizọs dị afọ 12, ọ nọ n’ụlọ nsọ na-ajụ ndị nkụzi ajụjụ |
||||
Nazaret |
Ọ laghachiri Nazaret; doo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya; ọ mụrụ ọrụ ịkwa nkà; Meri mụrụ ụmụ nwoke 4 ọzọ na ụmụ nwaanyị (Mt 13:55, 56; Mk 6:3) |
|||||
29, dk. Eprel |
Ala ịkpa, Osimiri Jọdan |
Jọn Onye Na-eme Baptizim bidoro ozi ya |