Mbọ Huldrych Zwingli Gbara Ịchọta Eziokwu Dị na Baịbụl
Taa, ọtụtụ ndị na-aga chọọchị nwere ike ịchọpụta ma ihe ha kweere ọ̀ bụ ihe Baịbụl na-akụzi n’eziokwu ka ọ̀ bụ na ọ bụghị. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ihe dị ka n’afọ 1500. Maka gịnị? Maka na ọtụtụ ndị enweghị Baịbụl n’asụsụ ha n’oge ahụ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị enweghị ike ịmata ma ihe a na-akụziri ha na chọọchị ọ̀ bụkwa ihe Baịbụl kwuru n’eziokwu. Ndị ụkọchukwu enweghịkwanụ ezigbo aka ha na-enyere ndị mmadụ. Akwụkwọ bụ́ History of the Christian Church kwuru na “Chọọchị dị na Swizaland na-eme ihe na-adịghị mma. Ndị ụkọchukwu na-eleghara ndị mmadụ anya, na-eme omume rụrụ arụ, kwenyekwa na nkwenkwe ụgha.”
Ọ bụ n’oge a ka Huldrych Zwingli bidoro ịchọ eziokwu dị na Baịbụl. Gịnị ka ọ chọtara? Olee otú o si gwa ndị ọzọ ihe ọ mụtara? Gịnịkwa ka anyị ga-amụta ná ndụ ya na ihe o kweere?
Mgbe Zwingli Malitere Ịchọ Eziokwu
Mgbe Zwingli bụ nwa okorobịa, o kpebiri na ọ ga-abụ ụkọchukwu ndị Katọlik. N’oge ahụ, ihe ndị chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-amụ bụ fịlọsọfị (ya bụ, amamihe mmadụ), ọdịnala chọọchị, na ihe ndị Fada chọọchị n’oge ochie dere. Ha anaghị amụ Baịbụl. Ọ bụkwa ihe ndị ahụ ka Zwingli mụrụ.
Olee otú Zwingli si malite ịchọpụta eziokwu Baịbụl na-akụzi? Mgbe ọ nọ na mahadum dị na Bazụl, Swizaland, onye nkụzi aha ya bụ Thomas Wyttenbach kụziiri ha ihe. Nwoke ahụ katọkwara ndị chọọchị maka ihe ndị ha na-eme na-adịghị mma. a Otu onye na-ede akụkọ ihe mere eme kwuru na Zwingli “si n‘ọnụ [Wyttenbach] mata na Kraịst nwụrụ otu ugboro maka mmehie anyị.” (1 Pita 3:18) Mgbe Zwingli ghọtara na ọ bụ naanị àjà mgbapụta Jizọs chụrụ na-eme ka a gbaghara anyị mmehie anyị, o kwetaghịzi na ndị ndú okpukpe ga-agbagharali mmehie ma e nye ha ego. (Ọrụ Ndịozi 8:20) Ma, Zwingli gụụrụ akwụkwọ na-aga, mechaa bụrụ ụkọchukwu ndị Katọlik mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ.
N’oge ahụ, Zwingli ji aka ya mụọ asụsụ Grik ka o nwee ike ịghọta asụsụ e ji dee ihe a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ. Ọ gụkwara ihe otu nwoke aha ya bụ Erasmus dere ma ghọta na ọ bụ naanị Jizọs bụ onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ, otú ahụ Baịbụl kwuru. (1 Timoti 2:5) N’ihi ya, Zwingli ekwetachazighị ihe ahụ ndị Katọlik na-akụzi na mmadụ nwere ike isi n’aka ndị nsọ gwa Chineke okwu.
Zwingli malitere ịchọsi eziokwu ike mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri atọ. Ma n’oge ahụ, ọ bụ onye ụkọchukwu ndị amị ndị so alụ agha na Yurop iji nweta Ịtalị. Mgbe a lụrụ agha a kpọrọ agha Marignano n’afọ 1515, ọ hụrụ otú ndị Katọlik si sụọ ndị Katọlik ibe ahụ akwụ. Mgbe afọ ole na ole gara, Zwingli ji aka ya depụta ọtụtụ akwụkwọ n’Akwụkwọ Nsọ Grik, buokwa ha n’isi. N’afọ 1519, o bizi na Zurik, bụ́ obodo na-ewu ewu na Swizaland. N’ebe ahụ ka o mechara kweta na ndị chọọchị kwesịrị ịkwụsị ịkụzi ihe ọ bụla na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ. Ma, olee otú ọ ga-esi nyere ndị ọzọ aka ikweta ihe a?
“E Zibeghị Ụdị Ozi Ọma A Mbụ”
Zwingli kwetara na ndị mmadụ nụ eziokwu Baịbụl na-akụzi, ha agaghịzi ekweta ụgha a na-akụziri ha. N’ihi ya, mgbe ọ ghọrọ ụkọchukwu na chọọchị Grossmünster a ma ama na Zurik, o kwuru ihe juru ndị mmadụ anya mgbe ọ na-ebido okwu Chukwu ya. Ọ sịrị na ya agaghịzi na-agụ akwụkwọ e depụtara amaokwu Baịbụl n’asụsụ Latịn b otú ndị ụkọchukwu ndị ọzọ na-agụ kemgbe ọtụtụ afọ ma ha kụziwe ihe. Kama, na ya ga na-agụpụta Baịbụl ma o kwuwe okwu Chukwu. Kama iji ihe ndị Fada chọọchị oge ochie dere kọwaa ihe Baịbụl kwuru, ọ ga na-eji Baịbụl akọwa Baịbụl. Otú o si mee ya bụ na ọ na-eji ebe ndị dị mfe nghọta na Baịbụl akọwa ebe ndị siri ike.—2 Timoti 3:16.
Zwingli nyeere ndị mmadụ aka ịhụ otú Baịbụl ga-esi na-abara ha uru kwa ụbọchị. Ọ kụziri omume ndị Baịbụl kwadoro, kụzie na e kwesịghị ịna-ekpegara ndị nsọ ekpere, ịna-ana ndị mmadụ ego ka e wee gbaghara ha mmehie, na ịna-efe Meri, nne Jizọs. O kwukwara na ndị ụkọchukwu na-eme omume rụrụ arụ. Gịnị ka ndị mmadụ meziri? Mgbe o kwuchara okwu Chukwu ya nke mbụ, ụfọdụ sịrị: “E zibeghị ụdị ozi ọma a mbụ.” Otu onye na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru banyere ndị Katọlik, ndị gere ihe Zwingli kwuru, sị: “Ndị kwụsịburu ịga chọọchị maka iberiibe ndị ụkọchukwu na-eme nakwa àgwà ọjọọ ha bidokwara gawa chọọchị.”
N’afọ 1522, ndị ụkọchukwu gbalịrị ka ndị ọchịchị Zurik mee ka ndị mmadụ kwụsị ime ihe na-adabaghị n’ozizi chọọchị. N’ihi ya, e boro Zwingli ebubo na ọ na-eduhie ndị mmadụ. O kweghị ahapụ ihe o kweere, n’ihi ya, o ji aka ya kwụsị ịbụ ụkọchukwu ndị Katọlik.
Gịnị Ka Zwingli Mere?
Zwingli kwụsịrị ịbụ ụkọchukwu, ma ọ ka nọ na-ezi ozi ọma, na-agbakwa mbọ ime ka ndị ọzọ kweta ihe o kweere. A ma ya ama maka ozi ọma ọ na-ekwusa, nke mekwara ka ndị ọchịchị Zurik na-ege ya ntị. O si n’aka ndị ọchịchị a na-ege ya ntị gbalịwa ka a gbanwee ihe ụfọdụ n’okpukpe ndị dị na Zurik. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1523, o mere ka ndị ikpe nọ na Zurik kweta na ha ga-amachi onye ọ bụla ịkụzi ihe ọ bula na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ. N’afọ 1524, o mere ka ha kwuo na ikpere arụsị bụ imebi iwu. Ndị ikpe obodo, ndị na-ezi ozi ọma, na ndị ọzọ gbakọrọ aka kpochapụ ebe a na-esu insensị ọkụ, ihe ndị a kpụrụ akpụ, ihe ndị a tụrụ atụ, foto, na ihe ndị ọzọ e ji efe ofufe. Akwụkwọ bụ́ Zwingli—God’s Armed Prophet kwuru na e wepụ oge ndị mmadụ bịara zuru ihe ndị ahụ n’ụlọ ụka na e nwebeghị mgbe a kpachaara anya bibie ihe ndị ahụ otú e mere n’oge ahụ. Ka a na-eru n’afọ 1525, o meela ka ndị ọchịchị jiri ụlọ ndị chọọchị rụrụ merezie ụlọ ọgwụ, meekwa ka ha kweta ka ndị ụkọchukwu na-alụ nwaanyị, ka ndị sista na-alụkwa di. Ọ gbakwara mbọ ka a kwụsị ịna-eme mass nakwa ka e jiri ihe Baịbụl kwuru ka a na-eme dochie ya. (1 Ndị Kọrịnt 11:23-25) Ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na mbọ Zwingli gbara mere ka ndị ndú okpukpe na ndị ọchịchị nọ na Zurik na-arụkọ ọrụ, bụrụkwa otú e si malite mbọ a gbara ịgbanwe ihe ụfọdụ na chọọchị na ime ka e nwee chọọchị Protestant.
Ọrụ kacha mkpa Zwingli rụrụ bụ ịsụgharị Baịbụl. Malite n’afọ 1520 gawa, ya na ụfọdụ ndị ọkà mmụta si otú dị mfe sụgharịa Baịbụl. Ha gụọ otu amaokwu n’asụsụ Hibru na Grik, ha agụọkwa ya ná nsụgharị ndị a ma ama dị ka Septuagint Grik na Vulgate nke Latịn. Ha na-atụlezi ihe amaokwu ahụ pụtara, deekwa ihe ha chọpụtara. Ha nọ na-akọwa Okwu Chineke ma na-asụgharị ya. Ihe a mere ka e wepụta otu Baịbụl a kpọrọ Baịbụl Zurik n’afọ 1531.
N’agbanyeghị na Zwingli na-ekwu ihe bụ́ eziokwu, ọ kwanyereghị ihe ndị ọzọ chere ùgwù, ọ bụkwa onye iwe. Dị ka ihe atụ, n’afọ 1525, o so kpee ndị Anabaptist ikpe, bụ́ ndị na-ekwetaghị na e kwesịrị ịna-eme ụmụaka baptizim otú yanwa kwetara. Mgbe ụlọikpe mechara kwuo na a ga-egbu onye ọ bụla na-agba ime ụmụaka baptizim ụkwụ, o kwughị na ihe ahụ e kpebiri adịghị mma. Ọ gwakwara ndị ọchịchị ka ha mee ka ndị amị na-amanye ndị mmadụ ikweta ihe ọhụrụ ọ na-akụzi. Ma, mpaghara dị iche iche na Swizaland bụ́ ebe okpukpe Katọlik gbanyere mgbọrọgwụ ekweghị anabata ihe ọhụrụ ndị ọ na-akụzi. Ihe a kpatara agha. Zwingli si Zurik duru ndị agha gaa agha ahụ, agha ahụ takwara isi ya. Ọ dị afọ iri anọ na asaa mgbe ahụ.
Ihe A Ga Na-echeta Gbasara Mbọ Zwingli Gbara
N’agbanyeghị na a maghị Huldrych Zwingli ama otú e si mara Martin Luther na John Calvin, bụ́ ndị Protestant mere ka a gbanwee ihe ndị Katọlik na-akụzi, Zwingli mere ihe ụfọdụ iji gbanwee ozizi ụfọdụ. Zwingli mere ka onye ọ bụla mara na ya anabataghị ozizi ndị Roman Katọlik, ma Luther emechaghị otú ahụ. Mbọ Zwingli gbara mekwara ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ịnabata ihe Calvin kụziri. Ọ bụ ya mere e ji kwuo na ọ bụ ya bụ onye nke atọ mere ka a gbanwee ihe ndị Katọlik na-akụzi.
Mbọ Zwingli gbara nwere nke ọma, nweekwa nke na-adịghị mma. Iji gbasaa ihe ọ na-akụzi, o tinyere aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha. O si otú ahụ ghara ime ka Jizọs Kraịst, bụ́ onye jụrụ itinye aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ndị iro ha n’anya, ọ bụghị igbu ha.—Matiu 5:43, 44; Jọn 6:14, 15.
Ma, a na-echeta Zwingli maka na ọ mụrụ Baịbụl nke ọma, gbakwa mbọ ịkụziri ndị ọzọ ihe ọ mụtara. Ọ chọpụtara ọtụtụ eziokwu ndị dị na Baịbụl, nyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ.
a E nwere ekpere ndị ndú chọọchị na-enye ndị mmadụ ka ha kpee. Ha na-ekwu na ekpere ndị ahụ nwere ike ime ka a ghara ịta mmadụ ahụhụ na pọgatrị ma onye ahụ nwụọ ma ọ bụkwanụ mee ka ahụhụ onye ahụ ga-ata belata.
b E nwere akwụkwọ ha na-edepụta amaokwu Baịbụl ndị ha ga-agụ n’afọ ma ndị ụkọchukwu kwuwe okwu Chukwu.