NA-ECHENỤ NCHE!
Ònye Ka Ị Ga-atụkwasị Obi?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
Obi na-agbawa ndị mmadụ ma ndị ha chere na ha nwere ike ịtụkwasị obi mee ihe gosiri na e kwesịghị ịtụkwasị ha obi. Ọtụtụ ndị akwụsịla ịtụkwasị ndị a obi:
ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị na-achọ ihe ga-abara onwe ha uru kama ịchọ ihe ga-abara ndị mmadụ uru.
ụlọ mgbasa ozi ndị na-anaghị akọ ihe otú o si mee, gharakwa ịna-ekwu ihe bụ́ eziokwu.
ndị sayensị bụ́ ndị na-anaghị eme ihe ga-abara ndị mmadụ uru.
ndị isi okpukpe bụ́ ndị na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama ịna-akụziri ndị mmmadụ eziokwu gbasara Chineke.
Ọ dị mma na ndị mmadụ anaghịzi atụkwasị onye ọ bụla ha hụrụ obi. Baịbụl kwuru, sị:
“Unu atụkwasịla ndị isi obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye na-enweghị ike ịzọpụta mmadụ.”—Abụ Ọma 146:3.
Onye ị ga-atụkwasịli obi
Baịbụl kwuru na e nwere onye ị ga-atụkwasili obi, ya bụ, Jizọs Kraịst. Anyị ekwesịghị iwere Jizọs naanị ka ezigbo mmadụ dịrị ndụ ọtụtụ afọ gara aga. Chineke họpụtara ya ka ọ bụrụ eze, “Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.” (Luk 1:32, 33) Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke, ya bụ, ọchịchị na-achị ugbu a n’eluigwe.—Matiu 6:10.
Ị chọọ ịmatakwu ihe mere i kwesịrị iji tụkwasị Jizọs obi, gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Eze nke Alaeze Chineke?” nakwa isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?”