Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Gịnị Mere E Ji Enye M Ọtụtụ Iwu?
“Iwu ndị mụrụ m nyere m banyere oge m ga na-alọta n’abalị na-adị agbakasị m ahụ́! Obi anaghị adị m mma ma a gwa m ka m lọta n’oge ma hapụ ndị ọzọ ka ha nọtee aka.”—Allen.
“Ọ dịghị ihe na-ewe m iwe ka ịdị na-elere m oge ma m na-akpọ fon. Ọ na-adị m ka à na-ewere m na m ka bụ nwatakịrị!”—Elizabeth.
Ọ̀ NA-ADỊ gị ka iwu ndị mụrụ gị na-enye gị ọ̀ karịrị akarị? Ọ̀ dịtụla mgbe obi gị gwara gị ka i zoro ezoro pụọ n’ụlọ unu ma ọ bụ ghaara ndị mụrụ gị ụgha banyere ihe i mere? Ya bụrụ otú ahụ, mmetụta ị na-enwe pụrụ iyi nke otu onye na-eto eto, bụ́ onye kọwara ndị mụrụ ya dị ka ndị na-adịghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́, ma kwuo, sị: ‘Ha kwesịrị ikwe ka m kurutụ ume ndụ!’
Ọ pụrụ ịbụ na ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị na-azụ gị enyela gị iwu banyere ihe ndị ha chọrọ ka ị na-eme na ndị ha chọrọ ka ị ghara ịdị na-eme. Iwu ndị a pụrụ ịgụnye ihe ndị a chọrọ gị n’aka ma a bịa n’ihe omume ụlọ akwụkwọ a sị gị mee n’ụlọ, ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ n’ụlọ, oge ị ga na-alọta n’abalị, tinyere ókè ị ga na-akpọru fon, ókè ị ga na-eleru TV, ma ọ bụ ókè ị ga na-anọru na kọmputa. Ha nwedịrị ike ịgwakwu gị ụdị àgwà ha chọrọ ka ị na-akpa n’ụlọ akwụkwọ na ụdị ndị ha chọrọ ka gị na ha na-akpakọrịta.
Ọtụtụ ụmụaka na-adakarị iwu ndị mụrụ ha nyere ha. N’otu nnyocha e mere, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị ntorobịa atọ ọ bụla a gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha anatala ntaramahụhụ n’ihi ịda iwu ndị e nyere ha n’ụlọ, na-eme ka nke a bụrụ ihe a kasị eji maka ya ata ha ahụhụ.
Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-eto eto kwetara na e kwesịrị inwe ụfọdụ iwu n’ụlọ iji gbochie ọgba aghara. Ma, ọ bụrụ na iwu ndị a na-enye n’ụlọ dị ezigbo mkpa, olee ihe mere ụfọdụ n’ime ha ji akpasu iwe? Ọ bụrụkwa na ọ na-adị gị ka iwu ndị mụrụ gị na-enye gị adịghị ekwe gị megharịa ahụ́, olee otú ị pụrụ isi nwetatụ ahụ́ efe?
“Abụghịzi M Nwata”!
Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise aha ya bụ Emily jụrụ, sị, “Olee otú m ga-esi mee ka ndị mụrụ m ghọta na abụghịzi m nwata nakwa na ha kwesịrị ikwe m megharịa ahụ́?” Ò nweela mgbe ị jụrụ ụdị ajụjụ ahụ? Dị ka ọ dị Emily, iwu ndị ahụ pụrụ ịdị na-ewe gị iwe n’ihi na ọ na-adị gị ka à na-ewere na ị ka bụ nwa e ku n’aka. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na otú i si ele ọnọdụ ahụ anya dị iche n’otú ndị mụrụ gị si ele ya. Ma eleghị anya, ha na-ele iwu ndị ha na-enye gị anya dị ka ihe dị mkpa iji chebe gị ma kwadebe gị ibu ibu ọrụ ndị dịịrị gị mgbe i toruru ogo mmadụ.
Ọ bụrụgodị na a na-ekwetụ gị megharịa ahụ́, o nwere ike ịdị gị ka à ka na-enye gị iwu ndị i toferela. Nke a na-akacha ewute ewute ma ọ bụrụ
na o yiri ka iwu a na-enye gị ọ̀ karịrị nke a na-enye ụmụnne gị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Marcy kwuru, sị: “Adị m afọ 17, ndị mụrụ m nyere m iwu ịdị na-alọta n’oge n’abalị. A naghị ekwe ka m si n’ụlọ pụọ mgbe ọ bụla m mejọrọ ihe. Ma, mgbe nwanne m nwoke hà ka m, e nyeghị ya iwu banyere oge ọ ga na-alọta n’abalị, ọ dịghịkwa mgbe a gwara ya ka ọ ghara isi n’ụlọ pụọ n’ihi ihe o mejọrọ.” Ka Matthew na-akọ ihe mere n’oge ọ dị afọ iri na ụma, o kwuru banyere ụmụnne ya nwanyị ndị ọ tọrọ na ụmụ nwanne papa ya, sị, “Ihe ọ sọkwara ha ha mee, ọ dịghị ihe a na-eme ha.”Ọ̀ Ka Mma Ka A Ghara Inye Gị Iwu?
O kwere nghọta na ọ pụrụ ịmasị gị i nwere onwe gị pụọ n’ịbụisi nke ndị mụrụ gị. Ma, ọ̀ ga-akara gị mma n’ezie ma ọ bụrụ na o nweghị iwu ọ bụla ha na-enye gị? O nwere ike ịbụ na o nwere ndị na-eto eto ibe gị ị maara, bụ́ ndị pụrụ ịlọta mgbe ọ bụla ọ sọrọ ha n’abalị, ndị pụrụ iji ụdị ejiji ọ bụla masịrị ha, ndị pụkwara iso ndị enyi ha gaa ebe ọ bụla masịrị ha, n’oge ọ bụla masịrị ha. Ma eleghị anya, ndị mụrụ ha ji nnọọ ọrụ n’aka nke na ha adịghị ama ihe ụmụ ha na-eme. Otú o sina dị, isi otú a zụlite ụmụaka emebeghị ka ha nwee ihe ịga nke ọma. (Ilu 29:15) Na ịhụnanya adịghị n’ụwa taa bụ nnọọ n’ihi na ụwa jupụtara ná ndị na-eche nanị maka onwe ha, ọtụtụ n’ime ha bụkwa ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị mụrụ ụmụ na-adịghị enye ụmụ ha iwu.—2 Timoti 3:1-5.
Otu ụbọchị, ụzọ i si ele ezinụlọ ndị nne na nna ha na-adịghị enye ụmụ ha iwu anya ga-adị iche. Tụlee ihe a chọpụtara n’otu nnyocha e ji ụmụ nwanyị ndị a zụlitere n’ezinụlọ ndị mụrụ ha na-enwechaghị iwu ha nyere ha nakwa ndị ndị mụrụ ha na-elebaghịrị anya nke ọma, mee. Mgbe ha na-ekwu banyere otú e si zụlite ha, o nweghị onye ọ bụla n’ime ha kwuru na ọ dị mma ka ndị mụrụ ụmụ hapụ ụmụ ha ka ha mere otú o si masị ha. Kama nke ahụ, ha lere ya anya dị ka ihe na-egosi na ndị mụrụ ha echebaraghị ha echiche ma ọ bụ ihe na-egosi na ha hapụrụ ịrụ ọrụ dịịrị ha.
Kama ịdịwa gị ka ị bụrụ ndị ntorobịa a na-ahapụ ka ha mewe ihe masịrị ha, gbalịa ịdị na-ele iwu ndị mụrụ gị na-enye gị anya dị ka ihe na-egosi na ha hụrụ gị n’anya ma na-eche banyere gị. Site n’iji ezi uche na-agwa gị ebe ị ga-emedebe ihe, ndị mụrụ gị na-eṅomi Jehova Chineke, bụ́ onye gwara ndị ya, sị: “M ga-eme ka i nwee uche, M ga-ezikwa gị ihe n’ụzọ nke ị ga-eje ije n’ime ya: M ga-adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa gị n’ahụ́.”—Ọma 32:8.
Ka ọ dị ugbu a, iwu ndị ahụ pụrụ ịdị gị ka hà karịrị gị akarị. Ya bụrụ otú ahụ, tụlee ihe ndị ị pụrụ ime iji nwekwuo obi ụtọ n’ụlọ unu.
Ụdị Nkwurịta Okwu nke Na-arụpụta Ihe Dị Mma
Ka i wee nwerekwuo onwe gị, ma ọ bụ ka e wee kwe ka ị na-emegharịkwu ahụ́, ọ dị mkpa na gị na ndị mụrụ gị ga-enwe ezigbo nkwurịta okwu. Ma ụfọdụ pụrụ ikwu, sị, ‘Ma esorowo m ndị mụrụ m kwurịta ya, ihe nile ka dịkwa otú ha dị!’ Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ pụrụ imeziwanye otú mụ na ndị mụrụ m si ekwurịta okwu?’ Nkwurịta okwu bụ ihe bara uru nke pụrụ inyere gị aka (1) inweta ihe ị chọrọ ma ọ bụ (2) ịghọtakwu ihe mere e ji jụ i mere gị ihe ị chọrọ. N’ezie, ọ bụrụ na ị chọrọ ka a na-emeso gị ihe dị ka onye toruworo ogo mmadụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya na ị ga-eme ka otú i si na-eso ndị mụrụ gị ekwurịta okwu bụrụ otú onye toruworo ogo mmadụ si eme.
▪ Mụta ịchịkwa mmetụta gị. Bible kwuru, sị: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.” (Ilu 29:11) Ezi nkwurịta okwu apụtaghị ime nanị mkpesa. Ime otú ahụ pụrụ ime nanị ka a bakwuoro gị mba! Ya mere, zere iji ákwá eme mkpesa, iji iwe agbachi ndị mụrụ gị nkịtị, na iwebiga iwe ókè. N’agbanyeghị otú i si kwachie ụzọ n’ike ma ọ bụ jiri iwe na-aga ike ike mgbe ndị mụrụ gị gbochiri gị ime ihe ị chọrọ ime, omume dị otú ahụ ga-eme ma eleghị anya ka ha nyekwuo gị iwu—ọ bụghị ka i nwerekwuo onwe gị.
▪ Gbalịa ile ihe anya otú ndị mụrụ gị si ele ya. Tracy bụ́ nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke ọ bụ nanị nne ya na-azụ, chọpụtara na nke a na-enye aka. O kwuru, sị: “Ajụrụ m onwe m sị, ‘Olee ihe mere nne m ji enye m iwu ndị a?’ Ọ chọrọ inyere m aka ka m ghọọ ezigbo mmadụ.” (Ilu 3:1, 2) Ịghọta nchegbu ndị mụrụ gị na-enwe pụrụ inyere gị aka ịma otú ị ga-esi soro ha kwurịta echiche gị. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ha achọghị ka ị gaa otu nnọkọ oriri. Kama ịrụwa ha ụka, ị pụrụ ịjụ ha, sị, “Ọ bụrụkwanụ na mụ na otu enyi m toruworo ogo mmadụ, nke a pụrụ ịtụkwasị obi, esoro jee?” O nwere ike ọ bụghị mgbe nile ka ndị mụrụ gị ga-ekwe ime ihe ị rịọrọ ha; ma ọ bụrụ na ị ghọta nchegbu ha na-enwe, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịtụ aro ha pụrụ ịnabata.
▪ Mee ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi. Ime ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi yiri itinye ego gị n’ụlọ akụ̀. Nanị ego ị pụrụ ịdọrọ bụ nke i tinyerela n’ụlọ akụ̀ ahụ. A ga-eri gị iwu ma ị dọrọ ihe karịrị ego ole i nwere n’ụlọ akụ̀, ọ bụrụkwa na i mee ya ugboro ugboro, a pụrụ imechi ihe ndekọ ego i nwere n’ụlọ akụ̀ ahụ. Inyekwu gị ohere ime ihe ụfọdụ n’onwe gị yiri ịdọrọ ego i tinyere n’ụlọ akụ̀; a ga-enyekwu gị ohere ahụ ma ọ bụrụ na a hụla na omume gị na-egosi na i toruola ka enye gị ụdị ohere ahụ.
▪ Tụọ anya ihe ị pụrụ inweta enweta. Ọ bụ ọrụ dịịrị ndị mụrụ gị iji ezi uche na-achịkwa omume gị. N’ihi ya, Bible kwuru banyere “ihe nna gị nyere n’iwu” na “iwu nne gị.” (Ilu 6:20) Otú ọ dị, i kwesịghị iche na iwu ndị mụrụ gị na-enye gị ga-ala ndụ gị n’iyi. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na ị na-erubere ndị mụrụ gị isi mgbe nile, Jehova kwere nkwa na n’ikpeazụ, ‘ị ga-enwe ihe ịga nke ọma’!—Ndị Efesọs 6:1-3.
Ị pụrụ ịhụ isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . ” n’ebe a na-edebe ihe ọmụma n’Intanet nke adres ya bụ www.watchtower.org/ypa
IHE NDỊ A GA-ECHEBARA ECHICHE
▪ Olee iwu ndị kachasị esiri gị ike idebe?
▪ Olee ihe ndị ị gụtara n’isiokwu a ga-enyere gị aka idebe iwu ndị mụrụ gị nyere gị?
▪ Olee otú ị pụrụ isi mee ka ndị mụrụ gị tụkwasịkwuo gị obi?
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 20]
Mgbe Ị Dara Iwu E Nyere Gị
Ọnọdụ a anyị na-aga ikwu banyere ya ugbu a pụrụ ịbụ ihe ị na-ahụkebe: Ị lọtara mgbe oge a gwara gị lọta n’abalị gaferela, ị rụghị ọrụ a gwara gị rụọ n’ụlọ, ma ọ bụ ị kpọfere oge a gwara gị akpọfela na fon. Ndị mụrụ gị abịala ugbu a na-ajụ gị maka ya! Olee otú ị pụrụ isi mee ka ihe ghara ịka njọ?
▪ Gwa ha eziokwu. Ihe a abụghị oge ịghọ ha aghụghọ; gwa ha kpọmkwem otú ihe nile si mee. (Ilu 28:13) Ịkọrọ ha ogologo akụkọ pụrụ ime ka ha kwụsịchaa ịtụkwasị gị obi. Zere ime ka à ga-asị na ihe i mere ziri ezi ma ọ bụ na o nwechaghị ihe ọ bụ. Na-echeta mgbe nile na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.
▪ Rịọ mgbaghara. O kwesịrị ekwesị ka i gosi mwute maka nchekasị na mmechu ihu iwu ahụ ị dara kpatara ma ọ bụkwanụ maka ọrụ ọ tụkwasịịrị ndị ọzọ, nke a pụkwara ime ka ntaramahụhụ a ga-enye gị belata. (1 Samuel 25:24) Otú ọ dị, mwute ị na-enwe aghaghị isi gị n’obi.
▪ Nakwere ihe ọ bụla si na ya pụta. Ihe mbụ obi gị ga-agwa gị mee pụrụ ịbụ ịjụ ntaramahụhụ a chọrọ inye gị, karịsịa mgbe ọ dị gị ka e kwesịghị inye gị ụdị ntaramahụhụ ahụ. (Ilu 20:3) Otú ọ dị, mmadụ ịnakwere ihe si n’ihe o mere pụta, bụ otu ihe na-egosi na o tozuru okè. (Ndị Galeshia 6:7) Ihe ga-akasị mma ka i mee pụrụ ịbụ nanị ịgba mbọ hụ na ndị mụrụ gị tụkwasighachiri gị obi.
[Foto dị na peeji nke 21]
Gbalịa ghọta nchegbu ndị mụrụ gị na-enwe