Mmadụ “Ịbụ Ezigbo Mmadụ” Ọ̀ Bụ Naanị Ihe A Chọrọ?
Echiche Baịbụl
Mmadụ “Ịbụ Ezigbo Mmadụ” Ọ̀ Bụ Naanị Ihe A Chọrọ?
OTU nwa agbọghọ aha ya bụ Allison kwuru, sị: “Ana m ebi ndụ m n’ụzọ kasị mma m pụrụ isi bie ya ma na-agbalị ịbụ ezigbo mmadụ.” Dị ka nwa agbọghọ a, ọtụtụ mmadụ kweere na nke ahụ bụ naanị ihe Chineke chọrọ mmadụ n’aka ná ndụ.
Obi siri ndị ọzọ ike na ọ bụrụgodị na ha emee mmehie dị oké njọ, na Chineke agaghị ajụ ha ase ma ọ bụrụhaala na a maara ha dị ka ezigbo mmadụ. Ha kweere na Chineke na-aka enwe mmasị n’ịgbaghara mmadụ karịa n’ịma onye ahụ ikpe.
N’ezie, ụdị onye otu onye na-ewere dị ka “ezigbo mmadụ” nwere ike ịdị iche n’ụdị onye onye ọzọ na-ewere dị ka “ezigbo mmadụ.” Ma, olee ihe Baịbụl kwuru? Olee ihe anyị na-aghaghị ime iji mee Chineke obi ụtọ? Olee ihe ọ pụtara ịbụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke?
Ịnakwere Nduzi nke Onye Kere Anyị
Ebe ọ bụ na ọ bụ Jehova Chineke kere anyị, ọ bụ ya ka o ruuru ịgwa anyị otú anyị ga-esi na-eme omume. (Mkpughe 4:11) N’ime Baịbụl, Chineke nyere anyị iwu na ụkpụrụ ndị ga na-eduzi anyị n’ihe banyere omume na ofufe. Chineke gwara ndị ya, sị: “Rubenụ isi n’ihe m kwuru, meekwanụ ihe niile m nyere unu n’iwu; unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke unu.”—Jeremaya 11:4.
Ya mere, mmadụ “ịbụ ezigbo mmadụ” n’anya Chineke pụtara na onye ahụ ga-amụta ihe bụ́ ụkpụrụ Chineke ma mee mgbanwe ná ndụ ya iji na-agbaso ha. Were ya na ọ dị onye ị chọrọ ịbụ enyi ya. Ị ga-achọ nnọọ ịma otú onye ahụ ga-achọ ka i siri na-emeso ya ihe ma mesowe ya ihe otú obi ga na-adị ya mma. Baịbụl na-egosi na, dị ka nna ochie ahụ bụ́ Ebreham, anyị pụrụ ịbụ enyi Jehova—ya bụ, ndị ọ na-ele anya ọma. (Jems 2:23) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ụkpụrụ Chineke dị nnọọ elu karịa nke anyị, anyị agaghị atụ anya ka ọ gbanwee ụkpụrụ ya iji na-agbaso ụkpụrụ nke onye nke ọ bụla n’ime anyị.—Aịzaya 55:8, 9.
Mkpa Nrubeisi Dị
Chineke ọ̀ ga-akatọ anyị n’ezie ma ọ bụrụ na anyị na-eleghara iwu ya ndị anyị weere na ha dị obere, anya? Ụfọdụ pụrụ iche na ọ dịghị mkpa irube isi n’iwu ụfọdụ ndị ha weere na ha dị obere. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị iwu Chineke nyere nke a pụrụ iwere na ọ dịghị mkpa. Buru n’uche na, na 1 Jọn 5:3, Baịbụl egosighị na e nwere iwu nke dị ukwuu na nke dị obere mgbe o kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu.” Mgbe anyị na-eme ike anyị iji na-edebe iwu niile Chineke nyere, anyị na-egosi na anyị ji obi anyị dum hụ ya n’anya.—Matiu 22:37.
Jehova adịghị atụ anya na anyị ga na-emetacha ihe niile. Ọ bụrụ na mmehie anyị wutere anyị n’eziokwu, anyị agbaakwa mbọ hụ na anyị emeghachighị ya, ọ na-eji obi ya niile agbaghara anyị. (Abụ Ọma 103:12-14; Ọrụ 3:19) Ma, ànyị nwere ike ịkpachapụ anya leghara iwu ụfọdụ anya, na-eche na ọ bụrụ na anyị erube isi n’iwu ndị ọzọ, a ga-agbaghara anyị ndị nke anyị leghaara anya? Otu ihe atụ dị na Baịbụl na-egosi na Chineke agaghị anabata ya.
Eze Sọl nke Izrel họọrọ iwu Chineke ndị nke ọ ga-erube isi na ha. Mgbe ọ na-aga ịlụso ndị Amalek 1 Samuel 15:2-9.
agha, e nyere ya iwu ka ọ ghara ịhapụ anụ ụlọ ha. A gwara ya ka o “gbuo ha.” Ọ bụ eziokwu na Sọl debere iwu ndị ọzọ e nyere ya, o nupụrụ isi n’iwu nke a ma hapụ igbu “anụ ndị kasị mma n’ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi.” N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ya na ndị ya chọrọ ka ihe ndị ahụ bụrụ nke ha.—Mgbe Samuel onye amụma jụrụ Sọl ihe mere na o rubeghị isi n’iwu Chineke, Sọl ekwetaghị, o kwukwara na ya rubere isi. O kwuru ezi ihe ya na ndị ya mere, tinyere àjà ndị ha chụụrụ Chineke. Samuel jụrụ ya, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà nkịtị hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka irube isi n’ihe Jehova kwuru? Lee! Irube isi dị mma karịa àjà, ịṅa ntị dịkwa mma karịa abụba ebule.” (1 Samuel 15:17-22) Ya mere, anyị apụghị ime ka Chineke ghara iwe iwe maka isi anyị nupụụrụ ya site n’ịchụrụ ya àjà ma ọ bụ site n’ịrụrụ ya ezi ọrụ ndị ọzọ.
Ụkpụrụ Chineke—Ihe Na-egosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya
N’ihi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ, ọ hapụghị anyị ka anyị kọwa nkọ otú anyị ga-esi na-eme ihe na-atọ ya ụtọ. N’ime Baịbụl, ọ gwara anyị n’ụzọ doro anya otú anyị ga-esi na-eme omume, dị ka à ga-asị na ọ na-agwa anyị, sị: “Lekwa ụzọ. Jeenụ ije na ya.” (Aịzaya 30:21) Mgbe anyị gbasoro nduzi ya, anyị na-ezere obi nkoropụ na mgbagwoju anya a na-enwe mgbe a na-atụle ụkpụrụ ụmụ mmadụ nke a ga-agbaso. Obi pụkwara isi anyị ike na nduzi Chineke na-abụ maka ọdịmma anyị mgbe niile, nakwa na ọ ‘na-akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru.’—Aịzaya 48:17, 18.
Olee nsogbu dị n’anyị iji aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme anyị abụrụ “ezigbo mmadụ”? Anyị niile ketara omume nke ịchọ naanị ọdịmma nke anyị. Obi anyị pụrụ ịghọgbu anyị. (Jeremaya 17:9) Ọ pụrụ ịdịrị anyị mfe ile iwu Chineke ndị anyị weere na ha siri ike, ma ọ bụ na ha adịghị ekwe anyị megharịa ahụ́, anya dị ka ndị na-adịchaghị mkpa.
Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ na-alụbeghị di na nwunye pụrụ ịhọrọ inwe mmekọahụ, na-eche na ebe ọ bụ na ọ bụ naanị ha abụọ nwere mmekọahụ ahụ, na ọ dịghị onye ọzọ ọ gbasara. Ha pụrụ ịma na ihe ahụ ha mere ekwekọghị n’ụkpụrụ Baịbụl, ma ha pụrụ ikwu na ebe ọ bụ na “ọ dịghị onye e mejọrọ,” na o yighị ka iwe ọ̀ ga-ewe Chineke. Ọchịchọ ọjọọ ahụ ha nwere pụrụ ime ka ha ghara ịhụ otú ihe ahụ ha mere jọruru ná njọ na ihe ga-esi na ya pụta. Baịbụl na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ, ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.”—Ilu 14:12.
Iwu niile Jehova nyere ụmụ mmadụ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya, nakwa na ọ chọghị ka anyị taa ahụhụ. Ileghara ụkpụrụ Chineke nyere banyere mmekọahụ ma ọ bụ omume ndị ọzọ anya emebeghị ka ndị mmadụ nwekwuo obi ụtọ na ihe ịga nke ọma ná ndụ. Kama nke ahụ, o buterela ọtụtụ ndị nsogbu. N’aka nke ọzọ, ịgbaso iwu Chineke na-enyere anyị aka ná mbọ anyị na-agba ibi ndụ dị mma na izere ibutere onwe anyị na ndị ọzọ nsogbu na-enweghị isi.—Abụ Ọma 19:7-11.
Ọ bụrụ na i ji ezi obi na-achọ ịbụ ezigbo mmadụ n’anya Chineke, hụ na ị na-agbalịsi ike ịgbaso nduzi ya. Ị ga-ahụ n’onwe gị na “ihe [Jehova] nyere n’iwu adịghị arọ.”—1 Jọn 5:3.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
▪ Gịnị mere anyị ji kwesị ịnakwere nduzi nke Onye Okike anyị?—Mkpughe 4:11.
▪ Ọ̀ bụ iwu na anyị ga-edebe iwu niile Chineke nyere?—1 Jọn 5:3.
▪ Gịnị mere na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya anyị iji aka anyị ahọrọ ụkpụrụ omume ndị anyị ga na-agbaso?—Ilu 14:12; Jeremaya 17:9.
[Foto dị na peeji nke 9]
Ị̀ na-ele omume ọma anya otú Chineke si ele ya?