Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Ihe Ezinụlọ Ga-atụle
Olee Ihe Na-adịghị n’Ihe Osise A?
Gụọ Ndị Ikpe 7:15-22. Lezie anya n’ihe osise ahụ. Olee ihe ndị na-adịghị na ya? Dee ihe ndị ị chọpụtara n’okpuru ebe a.
1. ․․․․․
2. ․․․․․
3. ․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị mere Gidiọn na ndị agha ya ji merie n’agha ahụ? Gịnị mere obi ji sie Gidiọn na ndị agha ya ike? Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka obi sie gị ike otú ahụ obi siri Gidiọn ike?
GỊNỊ KA Ị MAARA BANYERE EZE DEVID?
4. Ụmụnne Devid ndị nwoke ole tọrọ Devid?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Samuel 16:10, 11.
․․․․․
5. Gịnị bụ aha ọkpara nne Devid?
IJI NYERE GỊ AKA: Gụọ 1 Samuel 17:28.
․․․․․
IHE A GA-EKWURỊTA:
Gịnị ka i chere mere ọkpara nne Devid ji na-abara Devid mba? Gịnị mere ị ga-eji na-egosi ụmụnne gị ndị nwoke na ndị nwaanyị obiọma?
SITE NA MAGAZIN A
Zaa ajụjụ ndị a, ma denye amaokwu Baịbụl ndị na-adịghị na ha.
PEEJI NKE 4 Di na nwunye ekwesịghị ime gịnị? Matiu 19:․․․․․
PEEJI NKE 9 Ime gịnị bụ “ịma mma”? Ilu 19:․․․․․
PEEJI NKE 10 Chineke ewepụtala otu ụbọchị ọ ga-eji eme gịnị? Ọrụ 17:․․․․․
PEEJI NKE 12 Obi dị gịnị? Jeremaya 17:․․․․․
AZỊZA
1. Opi.
2. Ite.
3. Ọwa ọkụ.
4. Asaa.
5. Elayab.