Chọọ Enyemaka
Chọọ Enyemaka
“Ọ [bụrụ] na mmadụ pụrụ imeri onye ọ bụ naanị ya, mmadụ abụọ gbakọrọ aka pụrụ iguzogide ya.”—Ekliziastis 4:12.
Ọ BỤRỤ na ndị ọzọ enyere anyị aka, ọ ga-adịrị anyị mfe imeri onye iro ọ bụla, onye ọ sọkwara ya ma ọ bụ ihe ọ sọkwara ya ya bụrụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, ọ ga-adị mma ma ị gwa ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ka ha nyere gị aka, ma ọ bụ gwa onye ọ bụla ọzọ ga-eji obi ya niile nyere gị aka ma nweere gị ndidi.
I nwekwara ike ịgwa ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga ka ha nyere gị aka, n’ihi na hanwa nwere ike ịka ghọta otú ọ dị gị ma kakwa nyere gị aka. Otu Onye Kraịst bi na Denmak, aha ya bụ Torben, sịrị: “Aka ndị ọzọ nyeere m baara m ezigbo uru.” Abraham, onye bi n’India, sịrị: “Ezigbo ịhụnanya ndị ezinụlọ m na Ndị Kraịst ibe m gosiri m nyeere m aka ịkwụsị ịṅụ sịga.” Ma ọ bụghị mgbe niile ka enyemaka ndị ezinụlọ na ndị enyi na-eme ka mmadụ kwụsị ịṅụ sịga.
Otu nwoke aha ya bụ Bhagwandas, sịrị: “Aṅụrụ m sịga afọ iri abụọ na asaa, ma mgbe m mụtara ihe Baịbụl kwuru banyere omume ndị na-adịghị ọcha, ekpebiri m ịkwụsị ya. Agbalịrị m iselata aka n’ole m na-aṅụ. Akwụsịkwara m iso ndị mụ na ha na-akpa. Agakwara m ka ndị ụlọ ọgwụ nyere m aka. Ma o nweghị nke nwere isi. Ma n’otu abalị, agwara m Jehova Chineke otú obi dị m n’ekpere ma rịọ ya ka o nyere m aka ka m kwụsị ịṅụ sịga. Mgbe ahụzi ka m kwụsịrị ịṅụ ya!”
Ihe ọzọ dị mkpa ị ga-eme bụ ijikere maka nsogbu ndị i nwere ike inwe ma ị chọọ ịkwụsị ịṅụ sịga. Gịnị bụ nsogbu ndị a? Isiokwu na-esonụ ga-agwa anyị.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ì KWESỊRỊ ỊṄỤRỤ YA ỌGWỤ?
Ọgwụ ndị na-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ sịga, dị ka plasta e tinyere nikotin, juziri ebe niile taa. Tupu i kpebie ma ị̀ ga-eji ọgwụ akwụsị ịṅụ sịga, chebara ajụjụ ndị a na-esonụ echiche:
Olee uru ndị dị na ya? E kwuru na ọtụtụ n’ime ihe ndị ụlọ ọgwụ na-agwa onye chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga ka o mee bụ ihe ndị ga-eme ka ọ ghara inwe ọtụtụ nsogbu ndị na-achọ ịkwụsị ịṅụ sịga na-enwekarị. Ma ọ bụghị ndị ọkachamara niile kwetara na ihe ndị ahụ na-eme ka mmadụ kwụsị ịṅụ sịga kpamkpam.
Olee ọghọm ndị dị na ya? Ụfọdụ ọgwụ ndị a na-aṅụ iji kwụsị ịṅụ sịga nwere ike ime ka agbọ nuwe mmadụ, mee ka onye ahụ na-ada mbà n’obi, ma ọ bụdị mee ka onye ahụ chewe echiche igbu onwe ya. Burukwa n’obi na ụfọdụ ọgwụ ndị e ji nikotin mee na-eri mmadụ ahụ́, nweekwa ike ịkpatara onye ahụ nsogbu otú sịga si eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụdị ọgwụ ndị a ka nwekwara ike iri onye na-aṅụ ya ahụ́.
Olee ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi kwụsị ịṅụ sịga? Otu nchọpụta e mere gosiri na ihe karịrị mmadụ asatọ n’ime mmadụ iri ọ bụla, bụ́ ndị kwụsịrịla ịṅụ sịga, kwuru na ihe ha mere bụ ịnọkata otu ụbọchị kwụsị ịṅụ sịga n’agaghị ṅụwara ya ọgwụ.