Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụmụ Nwaanyị Hà Kwesịrị Ịkụzi Ihe?

Ụmụ Nwaanyị Hà Kwesịrị Ịkụzi Ihe?

Echiche Baịbụl

Ụmụ Nwaanyị Hà Kwesịrị Ịkụzi Ihe?

OTU nwaanyị onye Katọlik dere n’otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta ná mba Amerịka, sị: “Ọ na-eju m anya ma na-ewe m iwe na ruo ugbu a, e kwewebeghị ka ụmụ nwaanyị bụrụ ndị ụkọchukwu na chọọchị anyị.” E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ ọ na-ewe iwe otú a o si ewe nwaanyị a. A sị ka e kwuwe, n’okpukpe ndị ọzọ, ụmụ nwaanyị na-akụzi ihe, bụrụ ndị ụkọchukwu, ndị bishọp, nakwa ndị rabaị.

Ma okpukpe ndị nke na-ekwu na ụmụ nwaanyị ekwesịghị ịkụzi ihe ma ndị nke na-ekwe ka ha na-akụzi ihe n’ụlọ ụka na-ekwucha na Akwụkwọ Nsọ kwadoro ihe ha na-eme. Ma o nweghị nke n’ime ha Baịbụl kwadoro. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Tupu anyị azaa ya, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta otú Baịbụl si kọwaa okwu Grik bụ́ di·aʹko·nos, bụ́ nke a na-ejikarị akọwa onye na-eje ozi n’ọgbakọ.

Ndị Jere Ozi na Narị Afọ Mbụ

Olee otú i si aghọta okwu ahụ bụ́ di·aʹko·nos? Ihe na-agbatakarị ọtụtụ ndị n’uche bụ onye na-edu ndú n’ọgbakọ ebe a na-efe Chineke, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị. Na Baịbụl, e nwere otú ọzọ e si akọwa okwu ahụ. Chegodị banyere otu nwaanyị Onye Kraịst, aha ya bụ Fibi, onye Pọl onyeozi kpọrọ “nwanna anyị nwaanyị . . .  onye na-eje ozi [di·aʹko·nos] n’ọgbakọ dị na Senkrea.”—Ndị Rom 16:1.

Ì chere na Fibi na-eguzo n’ihu ndị ọzọ niile nọ n’ọgbakọ dị na Senkrea na-akụzi ihe? Olee ụdị ozi Fibi jere? N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị, o kwuru na e nwere ụmụ nwaanyị ndị ha na ya so “gbasie mbọ ike n’ọrụ ịgbasa oziọma.”Ndị Filipaị 4:2, 3, Baịbụl Nsọ Nhazi Katọlik.

Ụzọ bụ́ isi Ndị Kraịst narị afọ mbụ si kwusaa ozi ọma bụ “n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” (Ọrụ 20:20) Ndị niile so kwusaa ozi ọma ahụ bụ ndị na-eje ozi. Ụmụ nwaanyị ndị dị ka Prisila sokwa ná ndị ahụ. Prisila na di ya kpọbatara otu nwoke na-atụ egwu Chineke, onye a na-emebeghị baptizim, n’ụlọ ha ma “kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.” (Ọrụ 18:25, 26) O doro anya na Prisila bụ onye na-ekwusa ozi ọma nke ọma otú ahụ Fibi na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ bụ.

Ọrụ Dị Ùgwù

Ikwusa ozi ọma ọ̀ bụ ọrụ e ledara anya, a hapụụrụ ụmụ nwaanyị ka ha na-arụ, ebe ụmụ nwoke ga na-arụ ọrụ dị mkpa, nke bụ́ ịkụzi ihe n’ọgbakọ? Mbanụ, e nwekwara ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú a. Nke mbụ, Baịbụl mere ka o doo anya na Ndị Kraịst niile, ma ụmụ nwoke ndị e nyere ọrụ ndị ọzọ dị mkpa n’ọgbakọ, kwesịrị iso na-ekwusa ozi ọma. (Luk 9:1, 2) Nke ọzọ bụ na ikwusa ozi ọma bụ ụzọ bụ́ isi Ndị Kraịst narị afọ mbụ na ndị nke oge a, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ha, si egosi na ha na-erube isi n’ihe ahụ Jizọs gwara ha mee, nke bụ́ ‘ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, na izi ha ihe.’—Matiu 28:19, 20.

E nwere ọrụ ọzọ dị mkpa ụmụ nwaanyị na-arụ n’ọgbakọ. Pọl kwuru, sị: “Ka ndị agadi nwaanyị bụrụ . . . ndị na-akụzi ihe dị mma; ka ha wee mee ka ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ nwee uche ziri ezi iji hụ di ha n’anya, iji hụ ụmụ ha n’anya.” (Taịtọs 2:3, 4) N’ihi ya, ụmụ nwaanyị ndị merela agadi, ndị nwere àgwà ọma e ji mara Ndị Kraịst, nwere ọrụ inyere ụmụ nwaanyị na-akatabeghị ahụ́ aka ịmụta ịkpa àgwà ọma. Nke ahụ bụkwa ọrụ dị mkpa na ọrụ dị ùgwù.

Ịkụzi Ihe n’Ọgbakọ

Ma o nweghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru ka ụmụ nwaanyị guzoro n’ọgbakọ na-akụzi ihe. Kama nke ahụ, Pọl onyeozi gwara ha ka ha “na-agbachi nkịtị n’ọgbakọ.” Maka gịnị? Otu ihe o kwuru mere ha ga-eji mee nke a bụ ka e mee ihe niile “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.” (1 Ndị Kọrịnt 14:34, 40) Ka ihe nwee ike na-aga were were n’ọgbakọ, ọ bụ naanị ụmụ nwoke ka Chineke nyere ọrụ ịkụzi ihe. Ma, buru n’obi na ọ bụghị naanị na mmadụ bụ nwoke ga-eme ka o ruo eru ịkụzi ihe n’ọgbakọ na ịbụ onye nlekọta; ọ bụ naanị ụmụ nwoke ndị ruru eru ka a na-enye ọrụ ilekọta ọgbakọ. *1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9.

Ọrụ Chineke nyere ụmụ nwaanyị ò gosiri na o jighị ha kpọrọ ihe? Mbanụ. Cheta na Jehova Chineke nyere ha ọrụ dị mkpa, ya bụ, ịgba àmà banyere ya n’ihu ọha. (Abụ Ọma 68:11) Ndịàmà Jehova taa, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, bụ́ ndị na-eje ozi ọma, enyerela ọtụtụ nde mmadụ aka ichegharị ma nweta nzọpụta. (Ọrụ 2:21; 2 Pita 3:9) Nke ahụ abụghị obere ọrụ!

Otú a ụmụ nwoke si nwee ọrụ nke ha, ụmụ nwaanyị enweekwa nke ha, na-eme ka udo dị n’ọgbakọ, gosikwa na a na-akwanyere onye nke ọ bụla ùgwù. Iji maa atụ: Mgbe mmadụ ji ụkwụ agafe n’okporo ụzọ na-ekwo ekwo, anya ya na ntị ya na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nyere onye ahụ aka ịgafe. N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọ n’ọgbakọ na-arụ ọrụ Chineke nyere onye nke ọ bụla n’ime ha, Chineke ga-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ ahụ.—1 Ndị Kọrịnt 14:33; Ndị Filipaị 4:9. *

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Burukwa n’obi na nwoke ịbụ onye nlekọta n’ọgbakọ apụtaghị na ọ bụ o kwuchaa, o bie. Ọ nọ n’okpuru Kraịst, iwu jikwa ya ime ihe otú Baịbụl kwuru. (1 Ndị Kọrịnt 11:3) Ndị na-elekọta ọgbakọ kwesịkwara ‘ịna-edo onwe ha n’okpuru ibe ha,’ dị umeala n’obi, ma na-akwado mkpebi ndị a na-eme n’ọgbakọ.—Ndị Efesọs 5:21.

^ par. 15 Mgbe ụmụ nwaanyị na-erubere ụmụ nwoke isi n’ọgbakọ, dị ka Chineke kwuru, ha na-egosi ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe ihe nlereanya.—1 Ndị Kọrịnt 11:10.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Olee otú ụmụ nwaanyị nọ n’ọgbakọ narị afọ mbụ si kụzie ihe?—Ọrụ 18:26.

● Olee ndị a na-ahọpụta ka ha na-elekọta ọgbakọ?—1 Timoti 3:1, 2.

● Olee otú Chineke si ewere ozi ọma ụmụ nwaanyị bụ́ Ndị Kraịst na-ezisa taa?—Abụ Ọma 68:11.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 17]

“Ọ bụ Jehova kwuru okwu; ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.”—ABỤ ỌMA 68:11