Olee otú m ga-esi akọwara mmadụ ihe Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke?
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Olee otú m ga-esi akọwara mmadụ ihe Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke?
N’otu ebe a na-eme ememme e ji enye ndị mere nke ọma onyinye, ụmụ nwaanyị abụọ a ma ama, bụ́ ndị na-eme ihe nkiri mịrị ibe ha ọnụ n’ihu ọha! Ndị niile gbakọrọ ebe ahụ bu ụzọ kụja, tie mkpu ma malitezie ịkụ aka iji gosi na ha kwadoro ihe ahụ ha mere. Ụmụ nwaanyị ndị na-edina nwaanyị ibe ha na ụmụ nwoke ndị na-edina nwoke ibe ha ṅụrịrị ọṅụ. * Ha weere na ndị mmadụ anabatawala ụdị ndụ a ha na-ebi. Ụfọdụ ndị kwuru na ihe ahụ ha mere bụ ka ndị mmadụ kwuwe maka ya. Nke ọ sọrọ ya ya bụrụ, otu ihe doro anya bụ na a ga-egosi ihe a ụmụ nwaanyị abụọ a mere na tiivii ugboro ugboro, ọtụtụ nde mmadụ ga-akọkwa akụkọ ya n’ozi ha ga-ezigara ibe ha n’Ịntanet, ruo ụbọchị ole na ole.
DỊ KA ihe a a kọrọ ebe a na-egosi, e nwehaala onye a ma ama pụtara n’ihu ọha mee ka a mara na ya bụ nwoke na-edina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị na-edina nwaanyị ibe ya, ma ọ bụ na ya na-edina ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ejikarị ya emere isi akụkọ. Ụfọdụ ndị na-aja ndị a mma na ha katara obi pụta n’ihu ọha kwuo ụdị ihe a; ebe ndị ọzọ na-akatọ ha, na-ekwu na ha na-emefe ihe ókè. E nwezikwaranụ ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na e kwesịrị ịhapụ ndị na-eme ụdị ihe a ka ha mewe ihe ha na-eme n’ihi na ọ bụ otú ha kpebiri isi bie ndụ ha. Daniel, onye dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Mgbe m ka na-aga akwụkwọ, ụmụ akwụkwọ ndị na-abụghịdị ndị na-edina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha weere na onye ụdị omume a na-ewe iwe bụ onye na-akpọ ndị ọzọ asị ma na-ekpe ha ikpe na-ezighị ezi.” *
Otú e si ele nwoke idina nwoke ibe ya anya n’otu obodo na-adị iche n’otú e si ele ya anya n’obodo ọzọ, otú e sikwa ele ya anya na mbụ dị iche n’otú e si ele ya anya taa. Ma Ndị Kraịst abụghị ndị “ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.” (Ndị Efesọs 4:14) Kama nke ahụ, ha na-ewere ihe ọ bụla Baịbụl kwuru.
Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị? Ọ bụrụ na ị na-ebi ndụ otú Baịbụl kwuru, olee ihe ị ga-agwa ndị na-ekwu na ị na-akpọ ndị ọzọ asị n’ihi na ha na-eme ụdị omume a, ma ọ bụ ndị ga-agwa gị na ị na-ekpe ha ikpe na-ezighị ezi, ma ọ bụdị na ị na-agbara ha ọsọ? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ gị na ihe ndị i nwere ike ịza.
Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere nwoke idina nwoke? Baịbụl kwuru hoo haa na Chineke chọrọ ka ọ bụrụ naanị nwoke na nwaanyị bụ́ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:27, 28; Levitikọs 18:22; Ilu 5:18, 19) Mgbe Baịbụl kwuru na ịkwa iko adịghị mma, ihe ọ na-ekwu bụ na nwoke idina nwoke, nakwa nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye idina, adịghị mma. *—Ndị Galeshia 5:19-21.
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị: “Gịnị ka i chere banyere nwoke idina nwoke?”
Ihe i nwere ike ịza: “Akpọghị m ndị na-eme ụdị omume ahụ asị ma enweghị m ike ịnabata ụdị omume ahụ.”
✔ Ihe ị ga-eburu n’uche: Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ bụ otú ahụ ka i kpebiri isi na-ebi ndụ gị, ọ bụkwa gị kwesịrị ikpebi otú ị ga-esi na-ebi ndụ. (Jọshụa 24:15) Ihere emela gị na ị kpọrọ omume ahụ asị.—Abụ Ọma 119:46.
Ọ̀ bụ na Ndị Kraịst e kwesịghị ịkwanyere mmadụ niile ùgwù, n’agbanyeghị otú ha kpebiri isi na-enwe mmekọahụ? Ee, ha kwesịrị. Baịbụl kwuru, sị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile.” (1 Pita 2:17) N’ihi ya, Ndị Kraịst anaghị akpọ ndị na-edina nwoke ibe ha asị. Ha na-egosi mmadụ niile obiọma, ma ndị na-edina nwoke ibe ha.—Matiu 7:12.
Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị: “Í cheghị na otú a i si ele omume a anya ga-eme ka ndị ọzọ kpọwa ndị na-eme ya asị?”
Ihe i nwere ike ịza: “Mbanụ. Ihe m kpọrọ asị bụ omume ahụ, ọ bụghị ndị na-eme ya.”
✔ I nwekwara ike ikwu, sị: “Ka m nye gị otu ihe atụ. Anaghị m aṅụ sịga. Nke bụ́ eziokwu bụ na ịṅụ sịga na-asọ m oyi. Ma ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga, agaghị m akpọ gị asị n’ihi na ị na-aṅụ sịga, otú ahụ gịnwa na-agaghịkwa akpọ m asị n’ihi na anaghị m aṅụ sịga. Ọ́ bụghị eziokwu? Otú ahụ ka ọ dịkwa n’otú mụ na gị si ele nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị anya.”
Ọ̀ bụ na Jizọs ekwughị ka ndị mmadụ ghara ikpe ibe ha ikpe? Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ na Ndị Kraịst ekwesịghị ịhapụ ndị na-eme omume a ka ha biwe ndụ ha kpebiri ibi? Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha nabata otú ọ bụla mmadụ kpebiri isi na-ebi ndụ. Kama, o kwuru na “onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya” ka a ga-azọpụta. (Jọn 3:16) Mmadụ inwe okwukwe na Jizọs pụtara na onye ahụ ga-ebi ndụ otú Chineke si chọọ, ya bụ na onye ahụ agaghị eme omume ndị Chineke kpọrọ asị, nke nwoke idina nwoke so na ya.—Ndị Rom 1:26, 27.
Ọ bụrụ na mmadụ asị: “Ndị na-eme ụdị omume ahụ agaghị akwụsịli ya, ọ bụ otú e si mụọ ha.”
Ihe i nwere ike ịza: “Baịbụl ekwughị ma è nwere ihe ụfọdụ dị n’ahụ́ ndị na-eme omume a nke na-eme ka ha na-eme ya, ma o kwuru na e nwere àgwà ụfọdụ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’obi ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5) Ọ bụrụgodị na e nwere ndị idina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-agụ agụụ, Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst ekwesịghị ime ụdị omume ahụ.”
✔ Aro: Kama gị na mmadụ ga-arụwa ụka banyere ihe kpatara o ji agụ ụfọdụ ndị agụụ idina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, ihe ka mma bụ ime ka o doo anya na Baịbụl kwuru na ụdị omume ahụ adịghị mma. I nwere ike iji ihe a maa atụ: “Ọ̀ kwa ị ma na e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe mere ụfọdụ ndị ji ewe iwe ọkụ bụ n’ihi na o si ha n’ọbara? (Ilu 29:22) Ka anyị were ya na ihe ahụ ha kwuru bụ eziokwu. O nwere ike ị ma na Baịbụl kwuru na iwe iwe ọkụ adịghị mma. (Abụ Ọma 37:8; Ndị Efesọs 4:31) À ga-asị na ihe ahụ Baịbụl kwuru adịghị mma naanị n’ihi na e nwere ndị na-ewe iwe ọkụ?”
Gịnị mere Chineke ga-eji gwa onye ọ na-agụ agụụ idina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ka ọ ghara ime otú ahụ? Í cheghị na ọ dị njọ? Ndị na-eche echiche otú ahụ bụ ndị weere na ụmụ mmadụ ga-emerịrị ihe ọ bụla anụ ahụ́ ha chọrọ ka ha mee. Ụdị echiche ahụ adịghị mma. Baịbụl kwuru na Chineke kwanyeere ụmụ mmadụ ùgwù n’ihi na o kere ha ka ha nwee ike ikpebi na ha agaghị eme ihe ọjọọ ọ bụla gụrụ anụ ahụ́ ha agụụ ma ha chọọ.—Ndị Kọlọsi 3:5.
Ọ bụrụ na mmadụ asị: “Ọ bụrụgodị na ị naghị eme omume ahụ, i kwesịrị ịgbanwe otú i si ele omume ahụ anya.”
Ihe i nwere ike ịza: “Ka e were ya na ịgba chaa chaa anaghị amasị m ma ọ na-amasị gị. Ọ̀ ga-adị mma ma i siwe ọnwụ ka m gbanwee otú m si ele ịgba chaa chaa anya naanị n’ihi na ọtụtụ nde mmadụ na-agba chaa chaa?”
✔ Ihe ị ga-eburu n’uche: Ọtụtụ ndị (ma ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke ibe ha) kpọrọ ihe ụfọdụ asị, dị ka igwu wayo, ikpe ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụ ịlụ agha. Baịbụl kpọkwara ihe ndị ahụ asị; ọ bụkwa otú ahụ ka Baịbụl si kwuo na ụdị mmekọahụ ụfọdụ, ma nwoke idina nwoke ibe ya, adịghị mma.—1 Ndị Kọrịnt 6:9-11.
Baịbụl adịghị ekwu ka anyị kpọọ ndị ọzọ asị ma ọ bụ ka a ghara ikwe mmadụ mee ihe na-amasị ya. Naanị ihe ọ na-ekwu bụ na ndị agụụ idina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-agụ kwesịrị ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ,’ otú ụmụ nwoke na-alụbeghị nwunye na ụmụ nwaanyị na-alụbeghị di kwesịkwara ime.—1 Ndị Kọrịnt 6:18.
Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ nde ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru ma na-ejide onwe ha n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla na-abịara ha. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ndị nke olileanya ịlụ di ma ọ bụ nwunye na-adịzichaghịrị, ndị ọzọ bụ ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwere nkwarụ, nke na ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha enweghịzi ike inwe mmekọahụ. Ndị a niile ka na-enwekwa obi ụtọ n’agbanyeghị na ha anaghị enwe mmekọahụ. Ndị ọ na-agụ agụụ idina nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwekwara ike ime otu ihe ahụ ma ọ bụrụ n’eziokwu na ha chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Diuterọnọmi 30:19.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 N’isiokwu a, ihe anyị ga na-ekwukarị bụ ‘ụmụ nwoke ndị na-edina nwoke ibe ha.’ Ma ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwaanyị ndị na-edina nwaanyị ibe ha.
^ par. 4 Aha a kpọrọ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 7 Okwu ahụ Baịbụl kpọrọ “ịkwa iko” apụtaghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ pụtakwara mmadụ ịdịda ibe ya aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ n’ihe o ji bụrụ nwaanyị, ma ọ bụ iji ọnụ amị ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị, ma ọ bụ isi n’otule enwe mmekọahụ.
IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE
● Gịnị mere Chineke ji nye ụmụ mmadụ iwu banyere otú ha ga-esi na-eme omume?
● Olee uru ibi ndụ otú Baịbụl kwuru na-abara gị?
[Igbe dị na peeji nke 24]
OLEEKWANỤ MAKA ONYE NA-EDINA MA NWOKE MA NWAANYỊ?
Ọ bụ eziokwu na e nwere ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke ibe ha ma na-edinakwa ndị nwaanyị, nweekwa ndị nwaanyị na-eme otú ahụ, o yiri ka ọ̀ bụ ụmụ agbọghọ na-akazi eme ya. Lee ụfọdụ ihe mere o ji dị otú ahụ.
● Ọ na-eme ka ụmụ nwoke nwewe mmasị n’ebe ha nọ
“Ọtụtụ ụmụ okorobịa ekwuola na ha na-enwe mmasị n’ụmụ agbọghọ na-edina ụmụ agbọghọ ibe ha. Ụmụ agbọghọ ndị ọ na-adị ka ụmụ nwoke anaghị enwe mmasị n’ebe ha nọ ga-eme ihe ọ bụla ka ụmụ nwoke nwewe mmasị n’ebe ha nọ.”—Jessica, ọ dị afọ iri na isii.
● Ha chọrọ ịma otú ọ na-adị
“Ebe ọ bụ na a na-egosikarị ebe ụmụ agbọghọ na-esusu ibe ha ọnụ na tiivi, na fim, na-agụkarịkwa ya n’egwú, ọtụtụ ndị na-eto eto ga-achọwa ime ya iji mara otú ọ na-adị, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ha eweghị ya ka ihe dị njọ.”—Lisa, ọ dị afọ iri abụọ na isii.
● Ihe ụmụ agbọghọ ibe ha na-amasị ha
“E nwere ụmụ agbọghọ abụọ m hụrụ n’ebe anyị gara oriri. Ha abụọ na-edina ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ibe ha. Otu enyi m mechara gwa m na ha sị na ihe m masịrị ha. Mụ na otu n’ime ha mechara jiri ekwe ntị na-ezigara ibe anyị ozi. Ka oge na-aga, ihe ya bidoro masịwakwa m.”—Vicky, ọ dị afọ iri na atọ.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, i kwesịghị itinye aka n’àgwà ọ bụla Baịbụl kpọrọ omume na-adịghị ọcha. (Ndị Efesọs 4:19; 5:11) Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị ma n’ụmụ nwoke ma n’ụmụ nwaanyị? Ọtụtụ ndị nwere ike ịgwa gị na o nweghị ihe o mere ma gị na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-edina. Ma, i kwesịrị icheta na mmadụ inwe mmasị na nwoke ibe ya ma ọ bụ na nwaanyị ibe ya na-abụkarị ihe mmadụ na-emecha tofee. Ihe a ka Lisette, onye dị afọ iri na isii, chọpụtara. Ọ sịrị: “Mgbe m kọọrọ ndị mụrụ m na m na-enwe mmasị n’ebe ụmụ nwaanyị ibe m nọ, ha nyeere m aka ịghọta ihe mere o ji dị m otú ahụ. Ihe a na-akụziri anyị n’ụlọ akwụkwọ mekwara ka m ghọta na mgbe mmadụ na-eto eto, ọ na-enwe ọtụtụ mgbanwe n’ahụ́ ya. Ekwenyesiri m ike na ọ bụrụ na ọtụtụ ndị na-eto eto aghọta ihe ndị na-eme n’ahụ́ ha, ọ ga-enyere ha aka ịghọta na mmadụ inwe mmasị na nwoke ibe ya ma ọ bụ na nwaanyị ibe ya bụ ihe oge ya na-agafe agafe, ọ ga-enyekwara ha aka ka ha ghara itinye aka n’ụdị omume ahụ.”
Ya bụrụgodị na mmasị ị na-enwe n’ụmụ nwaanyị ibe gị ekweghị akwụsị, cheta otu ihe Baịbụl kwuru na ị ga-emeli: I nwere ike ikpebi na ị gaghị eme omume ọjọọ ọ bụla. *
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 43 Ị chọọ, i nwere ike ịgụ ihe e kwuru n’isi nke 28 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2. Isiokwu ya bụ, “Gịnị Ka M Ga-eme Ka Mụ na Nwoke ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Ghara Inwe Mmekọahụ?” Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Foto dị na peeji nke 23]
E nwegodị ihe ọtụtụ mmadụ tinyere isi na ya, Ndị Kraịst na-akata obi ghara iso ha