Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ò Nwere Mgbe Iyi Ọha Egwu Ga-akwụsị?

Ò Nwere Mgbe Iyi Ọha Egwu Ga-akwụsị?

Ò Nwere Mgbe Iyi Ọha Egwu Ga-akwụsị?

MGBE ndị na-eme nchọnchọ ji iri afọ abụọ leba anya n’otú ndị a sị na ha na-eyi ọha egwu si eche echiche na otú obi na-adị ha, ha kwuru, sị: “Anyị kwesịrị ịgba ezigbo mbọ . . . gbanwee uche na obi ha.”

Ma, olee ihe nwere ike ịgbanwe uche na obi ndị na-eme ihe ike na ndị na-emegwara ihe e mere ha?

Baịbụl Nwere Ike Ịgbanwe Uche na Obi

N’ihe dị ka afọ 1992, Hafeni malitere ichebara ihe ndị a kụziiri ya n’okpukpe ọ na-ekpe echiche, o nwetakwara Baịbụl. O kwuru, sị: “Ebu m ụzọ gụọ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, bụ́ ebe e dere otú Jizọs si bie ndụ mgbe ọ bịara n’ụwa. Ka m na-agụ ebe ndị ahụ, eji m nwayọọ nwayọọ nwewe mmasị n’otú Jizọs si kpaa àgwà. Otú o si jiri obiọma mesoo ndị mmadụ ihe n’eleghị ha anya n’ihu mere ka obi tọọ m ezigbo ụtọ.”

Hafeni kwuru na ka ya nọ na-agụ Baịbụl, e nwere ebe mere ka ya ghọtakwuo ụdị onye Chineke bụ. Ebe ahụ bụ Ọrụ 10:34, 35. O kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”

Hafeni kwuru, sị: “Ọ bịara doo m anya na ọ bụ ụmụ mmadụ nọkatara jiri aka ha na-akpa ókè agbụrụ, na-ahụ mba ha n’anya ma na-akpọ agbụrụ ndị ọzọ asị. Achọpụtara m na ihe e dere na Baịbụl nwere ike ịgbanwe otú ndị mmadụ si eche echiche nakwa na ihe ka mkpa ná ndụ a bụ mmadụ na Chineke ịdị ná mma. Ọ bụ ya dị mkpa karịa mmadụ ịga lụwara ndị obodo ya ma ọ bụ ndị agbụrụ ya ọgụ.”

Joseba, onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ, bụ onyeisi ndị kpara nkata ịtụ bọmbụ n’otu ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. O kwuru, sị: “Ma, tupu anyị emee ihe anyị chọrọ ime, ndị uwe ojii jidere m, a tụọ m mkpọrọ afọ abụọ.” Ka oge na-aga, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ Luci, bụ́ nwunye ya, Baịbụl. Joseba mechakwara soro ha na-amụ Baịbụl.

Joseba kwuru, sị: “Ka m na-amụkwu banyere Jizọs, amalitere m inwe mmasị ịdị ka ya. Otu n’ime ihe o kwuru metụrụ m nnọọ n’ahụ́. Ihe ahụ bụ: ‘Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.’ Ama m na ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu.” (Matiu 26:52) Joseba kwukwara, sị: “Igbu mmadụ na-ewe ndị e gburu onye ha iwe, ọ na-emekwa ka ha chọọ imegwara ihe e mere ha. Ime ihe ike na-eme ka ihe ka njọ, ọ bụghị ka ihe ka mma.” Joseba malitere ịgbanwe otú o si eche echiche.

Ma Hafeni ma Joseba ji otú ndụ ha si gbanwee mata na ihe e dere na Baịbụl nwere nnọọ ike ịgbanwe ndụ mmadụ. Baịbụl kwuru, sị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, . . . o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ike Baịbụl na-akpa emeela ka ọtụtụ ndị gbanwee echiche ha na àgwà ha. Ma, è nwere ihe na-egosi na ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru dị n’otu n’ụwa niile?

Ụmụnna Ndị Hụrụ Ibe Ha n’Anya

Mgbe Hafeni malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ ịhụ na ndị na-abịa ọmụmụ ihe ahụ na ibe ha dị n’udo n’agbanyeghị agbụrụ ha. O kwuru, sị: “Ọ tọrọ m ezigbo ụtọ ịnọ ọdụ n’akụkụ onye ọcha. Echetụbeghị m n’echiche na o nwere mgbe m ga-anọkata n’ụwa m kpọwa onye ọcha nwanna. Ọ bụ ihe a mere obi ji sikwuo m ike na Ndịàmà Jehova bụ ezigbo Ndị Kraịst, n’ihi na ha dị n’otu, bụ́kwanụ ihe m na-achọ achọ kemgbe. Ha hụkwara ibe ha n’anya n’agbanyeghị agbụrụ onye ọ bula n’ime ha si.”

Jizọs kwuru na ihe a ga-eji ama ezigbo ndị na-eso ụzọ ya bụ na ha ga-enwe ‘ịhụnanya n’etiti onwe ha.’ (Jọn 13:34, 35) Jizọs etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu abụghị nke ụwa.” (Jọn 6:15; 15:19; Matiu 22:15-22) Taa, dịkwa ka ọ dị n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst bụ na ha hụrụ ibe ha n’anya, ha anaghịkwa etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ime Ihe Jizọs Kụziri

Ma, olee otú ụmụ mmadụ ga-esi enwe ịhụnanya ebe ọ bụkwanụ na e nwere ndị na-eyi ibe ha egwu, bụ́ nke na-eme ka ndị mmadụ na ibe ha ghara ịdị ná mma? Ọ bụrụ na ndị ọchịchị esewe okwu wee malite ịlụ agha, ndị mmadụ na-alụrụ mba ha ma ọ bụ agbụrụ ha agha.

Dị ka ihe atụ, a malitere Agha Ụwa Mbụ n’afọ 1914. Ihe kpatara agha ahụ bụ na Gavrilo Princip gburu Archduke Francis Ferdinand. Ihe mere o ji gbuo ya bụ na ọ chọrọ ịlụrụ agbụrụ ya ọgụ. Archduke Francis Ferdinand kwesịrị ịnọchi nna ya n’ọchịchị mgbe Ọstria na Họngeri bụ otu mba. Princip nọ n’otu òtù kwuru na mmadụ ekwesịghị igbuwe oge ya kwuwe okwu udo ma ọ bụrụ na e nwere ihe ọ chọrọ inweta. Kama na onye ahụ kwesịrị iyi ọha egwu ka o nwee ike nweta ihe ahụ ọ chọrọ. Mgbe Princip gburu Ferdinand, mba ndị sị na ha na-eso ụzọ Kraịst, onye Baịbụl kpọrọ “Onyeisi Udo,” malitere igburịta onwe ha, e gbukwara ọtụtụ nde ndị agha ndị sị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Aịzaya 9:6.

Mgbe agha ahụ biri, otu ụkọchukwu a ma ama, aha ya bụ Harry Emerson Fosdick, katọrọ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst n’ihi na ha anaghị akụziri ndị òtù ha ka ha na-akpa àgwà ka Jizọs. O dere, sị: “Anyị na-azụ ụmụ okorobịa anyị ka ha na-alụ agha. Anyị na-eji ndị kpara ike n’agha eme ọnụ. Anyị na-etinyedị ọkọlọtọ agha n’ime ụlọ chọọchị anyị niile.” Fosdick kwukwara, sị: “Ọ bụ otu ọnụ ahụ anyị ji eto Onyeisi Udo ka anyị jikwa na-ekwu okwu agha ka à ga-asị na ọ bụ ihe ọma.”

Ma, akwụkwọ e bipụtara n’afọ 1975, bụ́ nke kwuru banyere nchọpụta e mere gbasara otú ihe si na-aga n’ụwa, kwuru na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova bụ ndị na-ekweghị etinye aka n’agha ụwa abụọ a lụrụla nakwa n’agha ndị ọzọ a na-alụ kemgbe ahụ. N’agbanyeghị na a kpagburu Ndịàmà Jehova, tụọkwa ha mkpọrọ, ha agaghị lụwa ọgụ iji megwara ihe e mere ha. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi bụ ihe ha gụtara na Baịbụl. Ha kwetakwara na ọ bụ mmụọ nsọ Chineke ka e ji dee ya.”

Ime Ihe Baịbụl Na-akụzi Bara Uru

O nwere mgbe onye bụ́bu praịm minista Beljọm natara onye agbata obi ya akwụkwọ kwuru gbasara otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa. Aha akwụkwọ ahụ bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. * Mgbe praịm minista ahụ gụrụ akwụkwọ ahụ, ihe ọ gụtara metụrụ ya nnọọ n’ahụ́. N’akwụkwọ ozi o degaara onye agbata obi ya ahụ, o kwuru, sị: “O doro m anya na ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-agụ ihe e dere na Matiu, Mak, Luk na Jọn gbasara otú Jizọs Kraịst si bie ndụ n’ụwa, ọ bụrụkwa na ha ana-akpa àgwà ka ya, ụwa a agaghị adị otú ọ dị ugbu a.”

O kwukwara, sị: “Anyị agaghị enwe ndị na-echebe obodo, a gaghị enwe ndị na-eyi ọha egwu, ime ihe ike ga-akwụsịkwa.” Ma, nwoke ahụ mechara, sị: “Ihe a niile bụ mmadụ ịmụ anya na-arọ nrọ.” Ma, ọ̀ bụ eziokwu na ihe ndị ahụ emekataghị mee? Ọ bụ eziokwu na ime ihe ike juru n’ụwa a, Baịbụl enyerela ọtụtụ ndị mmadụ, ndị si agbụrụ dị iche iche, aka ịkwụsị ime ihe ike, ha anaghịzikwa eburu ndị agbụrụ ọzọ iwe n’obi n’ihi arụrụala a rụsawara agbụrụ ha kemgbe ụwa.

Akụkọ anyị kọrọ n’isiokwu mbụ dị na magazin a banyere Andre gosiri na e wezụga obere ihe, bọmbụ ahụ tụgburu ọtụtụ ndị enyi ya gaara atụgbu yanwa. Ọ bụ ndị na-agba gọọmenti mgba okpuru dewere bọmbụ ahụ. Andre mechara mụọ Baịbụl mụta na mmadụ kwesịrị ‘ịgbaghara ibe ya kpamkpam,’ ọ malitekwara mewe ihe ahụ ọ mụtara. (Ndị Kọlọsi 3:13) Ọtụtụ afọ ihe ahụ mechara, Hafeni banyere n’òtù ahụ na-agba gọọmenti mgba okpuru. Ma, o mechara malite ịmụ Baịbụl, kwụsịzie ime ihe ike. (Abụ Ọma 11:5) Ugbu a, Andre na Hafeni bụ Ndịàmà Jehova. Ha abụọ na-arụkwa ọrụ n’ebe a na-anọ eme nsụgharị n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Afrịka.

Ka Obi Sie Gị Ike na Iyi Ọha Egwu Ga-akwụsị

N’ụwa niile, Baịbụl emeela ka obi sie ọtụtụ nde ụmụ mmadụ ike na iyi ọha egwu ga-akwụsị n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, e nwere otu ụbọchị Andre nọ na-agwa onye agbata obi ya na Chineke kwere nkwa iweta ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-adị n’ime ya. (Aịzaya 2:4; 11:6-9; 65:17, 21-25; 2 Pita 3:13) Ka ọ nọ na-agwa ya ihe ahụ, ndị soja ji ngwá agha gbaa ụlọ ahụ ha nọ gburugburu. Ha agwa Andre ka ọ pụta n’èzí bịa zara ọnụ ya. Mgbe ha chọpụtara na ọ na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl nakwa na ihe ahụ ọ na-eme masịrị onye agbata obi ya ahụ, ha hapụrụ ya lawa.

Andre gwara onye agbata obi ya ahụ na Chineke agaghị agbachi nkịtị ka nsogbu ụmụ mmadụ dịgide otú ahụ ọ na-agbachighị nkịtị n’oge Noa. Baịbụl kwuru na n’oge ahụ, ‘ụwa jupụtara n’ime ihe ike.’ (Jenesis 6:11) Chineke ji iju mmiri bibie ụwa n’oge ahụ. Ma, o chebere Noa, bụ́ onye udo, chebekwa ezinụlọ ya. Jizọs kwuru, sị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.

Chineke ahọpụtala Jizọs, onye Baịbụl kpọrọ “Nwa nke mmadụ,” ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ya dị n’eluigwe. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akpọrọ ndị mmụọ ozi dị ike bịa wepụ ndị niile na-eme ihe ike n’ụwa a. (Luk 4:43) Ebe ọ bụ Jizọs bụ Eze na-achị Alaeze Chineke, ọ ga-eme ‘ka ihe gaara ndị niile nke ọma, udo adịrịkwa.’ Ọ ga-anapụta ndị ọ na-achị n’aka “ndị na-akpagbu ha na . . . n’aka ndị chọrọ imesi ha ike.”—Abụ Ọma 72:7, 14, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.

Mgbe ahụzi, ndị niile na-eme ezi omume na ndị na-erubere Eze nke Alaeze Chineke isi ga-eji anya ha hụ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs ebe udo dị. (Luk 23:42, 43) Chineke kwere nkwa na Jizọs ga-eji udo na ikpe ziri ezi chịa ugwu ukwu na ugwu nta niile.—Abụ Ọma 72:1-3.

Obi ọ́ gaghị atọ gị ụtọ ibi n’ụwa mgbe eze a ga na-achị ụwa a? N’eziokwu, Jizọs chịwa ụwa, a gaghị enwe iyi ọha egwu.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 20 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Ma Hafeni ma Joseba ji otú ndụ ha si gbanwee mata na ihe e dere na Baịbụl nwere nnọọ ike ịgbanwe ndụ mmadụ

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ana-eme ihe Jizọs Kraịst kụziri, ụwa a agaghị adị otú a ọ dị ugbu a. Anyị agaghị enwe ndị na-echebe obodo, a gaghị enwe ndị na-eyi ọha egwu, ime ihe ike ga-akwụsịkwa.’—Onye bụ́bu praịm minista obodo Beljọm

[Foto dị na peeji nke 8]

Ihe mere Hafeni na Andre ji bido ịhụ ibe ha n’anya bụ na ha mewere ihe Baịbụl kwuru