Ọ Gbawara Ozugbo O si Post Ọfịs Pụọ
Ọ Gbawara Ozugbo O si Post Ọfịs Pụọ
E NWERE otu onye ọcha a mụrụ na Saụt Afrịka, ma o bi na Namibia. Aha onye ahụ bụ Andre. Nwoke a kwuru, sị: “Agaghị m echefu ihe mere n’otu ụtụtụ Mọnde m gara post ọfịs. Ndị mmadụ juru ebe ahụ. Ahụrụ m otu akpa n’akụkụ ebe m guzo, o yighịkwa ka è nwere onye nwe ya. Mụ agwa ndị na-arụ ebe ahụ ka ha nye m akwụkwọ ozi m, ha enye m ya, mụ abanye n’ụgbọala m lawa. Mgbe m gbara ihe dị ka nkeji atọ, mụ anụ ụda dasiri ike. E mechara gwa m na bọmbụ gbawara n’akụkụ ebe ahụ m guzo mgbe ahụ.”
Andre kwukwara, sị: “Naanị ihe bụ́ mkpa m mgbe ahụ bụ iwere akwụkwọ ozi m. Ma, ọ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́ mgbe m mechara mata na bọmbụ ahụ tụgburu ndị ọ na-enweghị ihe ha mere. Amakwa m ọtụtụ n’ime ha. Obi na-ajọ m njọ mgbe ọ bụla m chetara ihe ahụ merenụ n’agbanyeghị na o mere kemgbe iri afọ abụọ na ise gara aga. Emechara m gaa hụ ndị ahụ bọmbụ ahụ gburu na ndị nke o merụrụ ahụ́. Mgbe ụfọdụ, m cheta ha, mụ agwa onwe m na m gaara abụ onye nwụrụ anwụ ugbu a.”
Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
E nwere ike, ihe ahụ mere Andre agaghị eme gị, ma, ọ ga-abụ na ị nụla na ụdị ihe ahụ na-emekarị n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọtụtụ ndị na-emezi ihe ike, ya bụ, ha na-eyi ọha egwu, iji nweta ihe ha chọrọ.—Gụọ igbe bụ́ “Olee Ndị Bụ Ndị Na-eyi Ọha Egwu?” Ọ dị na peeji nke na-eso peeji a.
N’afọ 1997, otu onye nta akụkọ chọpụtara na e nwere “naanị mba anọ, bụ́ ebe ndị mmadụ ji bọmbụ gbuo ma onwe ha ma ndị ọzọ.” Ma ka o ruru n’afọ 2008, onye nta akụkọ ahụ dere na
“e nweela ndị ji bọmbụ gbuo ma onwe ha ma ndị ọzọ n’ihe karịrị iri mba atọ ndị dị na kọntinent niile dị n’ụwa ma e wezụga kọntinent Ọstrelia na Antaktika.” O kwukwara na “ndị na-akpa ụdị ike a na-ebukwu ibu n’ụwa, ike ha na-akpa na-atakwa isi ọtụtụ mmadụ kwa afọ.”Ka anyị were akụkọ ahụ anyị kọrọ ná mmalite isiokwu a dị ka ihe atụ. Ndị kwuru na ọ bụ ha dewere bọmbụ ahụ sị na ha achọghịzi ka ndị na-achị mba ha na-achị ha. Mbọ ha na-agba bụ ka ha chịwa onwe ha. Ma, olee ihe mere ndị mmadụ ji eme ụdị ihe ahụ iji nweta ihe ha chọrọ? Ka anyị lebagodị anya n’ihe mere otu nwoke aha ya bụ Hafeni.
A mụrụ Hafeni na Zambia, ma ebe ọ nọ too bụ n’ogige dị iche iche ebe ndị gbara ọsọ ndụ na-ezere mmiri ná mba ndị dị Zambia nso. Hafeni sịrị: “Obi adịghị m mma n’ihi mmeso ọjọọ e mesoro ezinụlọ anyị na ndị ọzọ.” Nke a mere o ji soro n’òtù na-agba ọchịchị mgba okpuru, ndị mụrụ ya sokwa n’òtù ahụ.
Hafeni kwuru otú ọ na-adị ya ma ya cheta ihe mere n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Ihe kacha ewute m n’ihe ahụ niile merenụ bụ otú obi na-adị anyị n’oge ahụ anyị na-agba ọsọ ndụ. Ụmụaka anaghị ahụ nne ha, nna ha, na ụmụnne ha anya. Ndị torola eto na-anọ n’ọhịa na-alụ agha, ọtụtụ n’ime ha alọtaghịkwa. Ahụghị m papa m, ma ná mmadụ ma na foto. Naanị ihe m ma banyere ya bụ na ọ nwụrụ n’agha. Ihe ndị a niile na-enye m nsogbu n’obi ruo taa.”
O doro anya na ihe mere ndị mmadụ ji egbu ma onwe ha ma ndị ọzọ abụghị obere ihe. Ọ bụrụ na anyị aghọta ya nke ọma, ọ ga-enyere anyị aka ịmara ihe a ga-eme ka iyi ọha egwu kwụsị.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]
OLEE NDỊ BỤ NDỊ NA-EYI ỌHA EGWU?
Otu onye na-eme nchọnchọ, aha ya bụ Mark Juergensmeyer, kwuru, sị: “Ọ bụ otú mmadụ si lee ihe ike e mere anya ga-eme ka o kwuo ma onye mere ya ọ̀ bụ ‘onye na-eyi ọha egwu’ ma ọ bụ na ọ bụghị. Otú mmadụ si hụ ihe na-aga n’ụwa na-ekpebikarị otú ọ ga-esi aghọta okwu a. Ọ bụrụ na onye ahụ chere na udo dị n’ụwa, onye mere ihe ike ga-abụ onye na-eyi ọha egwu. Ma, ọ bụrụ na o chere na ọgba aghara dị n’ụwa, o nweghị ihe ọ ga-eji iyi ọha egwu kpọrọ.”
N’ihi ya, mgbe ọ bụla e yiri ọha egwu, ọ na-abụkarị okwu gbasara ọchịchị na-akpata ya. Ọtụtụ ndị na-eyi ọha egwu na-asị na ha chọrọ inwere onwe ha, ha anaghị ekweta na ha bụ ndị na-eyi ọha egwu. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na iyi ọha egwu bụ (1) ịrụsa ndị na-abụghị ndị agha arụrụala na (2) mmadụ ime ihe ike iji nweta ihe ọ chọrọ, ya bụ, ka o menye ndị ọ chọrọ inweta ihe n’aka ụjọ. Ya mere, ndị chọrọ ka ihe gbanwee nwere ike yie ọha egwu, ma hà bụ ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru ma hà bụ ndị ọchịchị n’onwe ha.