Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Ezigbo Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Asị?

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Ezigbo Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Asị?

Echiche Baịbụl

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Ezigbo Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Asị?

“Ndị mmadụ ga-enyefe unu ka a kpagbuo unu, ha ga-egbukwa unu, mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—MATIU 24:9.

ỤBỌCHỊ ole na ole Jizọs kwuchara ihe a, e jiri obi ọjọọ gbuo ya. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20, 21) Gịnịdị mere ndị mmadụ ga-eji akpọ ndị na-eme ihe Jizọs kwuru asị, bụ́ ndị na-agba mbọ ịdị ka ya? A sị ka e kwuwe, Jizọs wepụtara onwe ya nyere ndị mmadụ aka. Ọ kasiri ndị ogbenye obi ma mee ka obi sie ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ike.

Baịbụl kwuru ihe ndị mere e ji kpọọ ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs asị. Ọ bụrụ na anyị elebara ihe ndị ahụ anya, anyị ga-aghọta ihe mere e ji akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst otú ahụ e si kpagbuo Jizọs.

O Nwere Ike Ịbụ na Ha Amaghị Ihe

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ. Ma ha ga-eme ihe ndị a n’ihi na ha amarabeghị Nna m ma ọ bụkwanụ mụ onwe m.” (Jọn 16:2, 3) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị kpagburu Jizọs kwuru na ha na-efe Chineke ahụ Jizọs na-efe, ihe mere ha ji kpagbuo Jizọs bụ na ha nabatara ozizi ụgha na omenala ndị na-ezighị ezi a kụziiri ha. N’eziokwu, ha “na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) Otu n’ime ndị ahụ kpagburu Jizọs bụ Sọl onye Tasọs, onye mechara ghọọ Onye Kraịst, a kpọwazie ya Pọl onyeozi.

Sọl bụ onye Farisii. Ndị Farisii bụ ndị Juu na-akpa ike n’ọchịchị, ha na-emegidekwa Ndị Kraịst. Sọl mechara kwuo, sị: “Abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” O kwukwara, sị: “Amaghị m ihe mgbe ahụ, emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe.” (1 Timoti 1:12, 13) Ma, ozugbo ọ matara onye Chineke na Ọkpara ya bụ, ya agbanwee ndụ ya.

Taa, ọtụtụ ndị na-akpagbubu Ndị Kraịst emeela ihe a Sọl mere. Ihe ọzọ bụ na a na-akpagbukwa ụfọdụ n’ime ha otú e si mechaa kpagbuo Sọl. Ma, ha anaghị eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ e mere ha. Kama nke ahụ, ha na-eme ihe Jizọs kwuru, nke bụ́: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Matiu 5:44) Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ime ihe a Jizọs kwuru, ha na-atụkwa anya na ụfọdụ ndị na-akpagbu ha ga-emecha gbanwee otú ahụ Sọl mechara gbanwee.

Ụfọdụ n’Ime Ha Nwere Anyaụfụ

Ọtụtụ ndị kpagburu Jizọs n’ihi anyaụfụ. N’eziokwu, gọvanọ ndị Rom, aha ya bụ Pọntiọs Paịlet, “maara na ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee [Jizọs] n’aka ya” ka ọ kpọgbuo ya. (Mak 15:9, 10) Gịnị mere ndị ndú okpukpe ndị Juu ji meere Kraịst anyaụfụ? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na Kraịst na ndị nkịtị dị ná mma. Ma, ndị ndú okpukpe ndị Juu enweghị ihe ha ji ha kpọrọ. Ndị Farisii sịrị: “Ụwa dum esorola ya.” (Jọn 12:19) Mgbe ndị mmadụ mechakwara nabata ozi ọma ndịozi Kraịst ziri ha, ‘ekworo juru ndị na-emegide Ndị Kraịst obi,’ ha amalite ịkpagbu Ndị Kraịst ahụ na-ekwusa ozi ọma.—Ọrụ 13:45, 50.

Àgwà ọma ndị na-efe Chineke na-akpa na-ewe ndị ọzọ iwe. Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Ebe ọ bụ na unu esoghị ha [ya bụ, ndị ajọ omume] na-ebi ndụ ịla n’iyi a, ọ na-eju ha anya, ha ewee na-ekwujọ unu.” (1 Pita 4:4) Ndị mmadụ na-emekwa otu ihe ahụ taa. Ọ bụ eziokwu na ezigbo Ndị Kraịst na-agbalị ka ha ghara ịkpa àgwà ọjọọ, ha abụghị ndị ezi omume n’anya onwe ha, ha anaghịkwa eme ka hà ka ndị ọzọ mma. Ma ọ́ bụghị ya, ọ pụtara na ha abụghị ezigbo Ndị Kraịst, n’ihi na mmadụ niile bụ ndị mmehie, ha chọkwara ka Chineke meere ha ebere.—Ndị Rom 3:23.

A Kpọrọ Ha Asị Maka na Ha “Abụghị nke Ụwa”

Baịbụl kwuru, sị: “Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.” (1 Jọn 2:15) Olee ụwa Jọn onyeozi na-ekwu okwu ya n’ebe a? Ọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke na ndị na-erubere Setan, bụ́ “chi nke [ụwa a],” isi.—2 Ndị Kọrịnt 4:4; 1 Jọn 5:19.

Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị hụrụ ụwa na omume ọjọọ e ji mara ya n’anya na-akpagbu ndị na-agbalị ibi ndụ otú Baịbụl kwuru. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndịozi ya, sị: “A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa, kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.”—Jọn 15:19.

Ị̀ hụrụ na ihe mere e ji kpọọ ndị na-efe Jehova asị bụ na ha anaghị eme omume ọjọọ e ji mara ụwa, ha anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi, ha anaghịkwa eso eme ihe ike a na-eme n’ụwa a Setan na-achị? Ọtụtụ ndị nwere ezi obi chọrọ ka ụwa a dị mma, ma ha agaghị emeli ka ọ dị mma n’ihi na onye na-achị ụwa a ka ha ike, anaghịkwa ahụ ya anya. Ọ bụ naanị Jehova Chineke ga-egbuli Setan, ọ ga-emechakwa laa ya n’iyi otú ahụ ọkụ si ala ihe n’iyi.—Mkpughe 20:10, 14.

Ndịàmà Jehova nwere olileanya na Chineke ga-eme ihe a o kwuru, ọ bụ ya mere ha ji ezi ụmụ mmadụ “ozi ọma nke a nke alaeze” n’ụwa niile. (Matiu 24:14) N’eziokwu, Ndịàmà Jehova kwenyesiri ike na ọ bụ naanị Alaeze Chineke, ya bụ, ọchịchị ya nke Kraịst bụ eze ya, ga-eweta udo na obi ụtọ n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. (Matiu 6:9, 10) N’ihi ya, ha agaghị akwụsị ikwusa Alaeze ahụ n’ihi na ha ma na ọ kacha mma mmadụ ime ihe dị Chineke mma kama ime ihe dị ụmụ mmadụ mma.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Gịnị mere Sọl onye Tasọs ji kpagbuo ndịozi Kraịst?—1 Timoti 1:12, 13.

● Olee àgwà ọjọọ ụfọdụ ndị iro Jizọs na-akpa, bụ́ nke mere ha ji kpagbuo ya?—Mak 15:9, 10.

● Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ụwa a anya?—1 Jọn 2:15.

[Okwu nkọwa dị na peeji nke 23]

N’afọ 1945, ìgwè mmadụ iwe ji wakporo Ndịàmà Jehova na Kwebek, dị na Kanada, n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke

[Ebe E Si Nweta Foto]

A natara ikike n’aka Canada Wide