Ihe Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-ebi n’Udo
Echiche Baịbụl
Ihe Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-ebi n’Udo
“Onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’ . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Ọ bụ Jizọs Kraịst kwuru ihe a e dere na Matiu 19:4-6.
ỌTỤTỤ ndị ejighịzi alụmdi na nwunye kpọrọ ihe n’ihi na ụwa anyị a anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya. N’oge a, ụfọdụ ndị di na nwunye na-etisa ma ọ bụkwanụ gbaa alụkwaghịm ma e nwee ihe seere ha okwu, o nwedịrị ike bụrụ ihe na-adịghị ihe ọ bụ. E nwere ndị nke na-etisa, nweekwa ndị nke na-agba alụkwaghịm, naanị na ha chere na di ha ma ọ bụ nwunye ha amaghịzi mma. Nke ọjọọ ya bụ na ụmụaka ndị ha mụrụ na-aka ata ahụhụ ya, obi anaghịkwa adị ha mma ma ha cheta na papa ha na mama ha ebighịzi.
Ihe ndị a anaghị eju ezigbo Ndị Kraịst anya n’ihi na ha ma na anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ Baịbụl kwuru na n’oge a, ndị mmadụ agaghịzi na-eguzosi ike n’ihe, ha agaghị na-ahụ ibe ha n’anya, ha agaghịkwa na-enwe obi mmadụ. Ị makwa na ọ bụrụ na àgwà ndị a adị n’ezinụlọ, ihe agaghị na-aga aga. (2 Timoti 3:1-5) Ì ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe? Ihe ndị a na-eme n’ezinụlọ ndị mmadụ ọ̀ na-ewute gị?
Ya bụrụ otú ahụ, wetuo obi. Baịbụl nwere ndụmọdụ ndị ga-enyere di na nwunye aka ịna-ebi n’udo, ọtụtụ ndị di na nwunye emeekwala ihe ndị o kwuru, ya abaara ha uru. Ka anyị leba ise n’ime ha anya ma hụ otú ha nwere ike isi nyere di na nwunye aka. *
Ihe Ise Ndị Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-ebi n’Udo
(1) Cheta na alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ. Ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 19:4-6 gosiri na ya na Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, ma na alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ. Ọ bụ ya mere Chineke ji baara ndị gbara nwunye ha alụkwaghịm n’oge ochie mba n’ihi na ha mere ya ka ha nwee ike gaa lụrụ ụmụ agbọghọ. Ọ gwara ha, sị: ‘Unu aghọọla nwunye unu lụrụ n’okorobịa aghụghọ, ọ bụ ezie na unu na ha gbara ndụ.’ Jehova gwakwara ha na ya “kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.” (Malakaị 2:14-16) Chineke ejighị alụmdi na nwunye egwu egwu, ọ na-ahụkwa otú di na nwunye si emeso ibe ha.
(2) Na-arụ ọrụ di kwesịrị ịrụ. E kwesịrị inwe onye ga-ekpebi ihe a ga-eme mgbe e nwere ihe dị mkpa a chọrọ ime n’ezinụlọ. Baịbụl kwuru na ọ bụ di ga-ekpebi ya. Ndị Efesọs 5:23 kwuru, sị: “Di bụ isi nke nwunye ya.” Na Baịbụl kwuru na di bụ isi nwunye ya apụtaghị na ọ ga-eji aka ike na-achị ya. Di kwesịrị icheta na ya na nwunye ya bụ “otu anụ ahụ́,” o kwesịkwara ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù ma na-ajụta ya ihe o chere tupu o kpebiwe ihe a ga-eme. (1 Pita 3:7) Baịbụl gwara ndị di ka ha “na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.”—Ndị Efesọs 5:28.
(3) Bụrụ nwunye na-enyere di ya aka. Baịbụl kwuru na nwunye bụ ‘onye na-eme ka di ya zuo ezu.’ (Jenesis 2:18) Okwu ahụ pụtara na nwunye kwesịrị inwe àgwà ndị di ya na-enweghị. N’ihi ya, o kwesịghị ịna-ama di ya aka, kama, ọ ga na-enyere ya aka iji hụ na udo chịrị n’ezinụlọ. Ndị Efesọs 5:22 kwuru, sị: “Ka ndị bụ́ nwunye na-edo onwe ha n’okpuru ndị di ha.” Ma, oleekwanụ ihe nwaanyị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe di ya chọrọ ime adịghị ya mma? Ihe ọ ga-eme bụ iwetu obi gwa ya ihe o chere gbasara ihe ahụ. O kwesịghị ịkparịwa ya otú ahụ ọ na-agaghị achọ ka di ya kparịa ya.
(4) Atụla anya na ihe ga na-aga siriri werere mgbe niile. Okwu a na-echeghị echiche kwuo ma ọ bụ okwu ọjọọ nwere ike ime ka di na nwunye see okwu. Ihe isi ike, ọrịa, ma ọ bụ nsogbu dị n’ịzụ ụmụ nwekwara ike mee ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo hoo haa na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28) Ma, nsogbu ndị ahụ ekwesịghị iwetara di na nwunye ọgba aghara. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ abụọ hụrụ ibe ha n’anya ma kwere ka ihe ha na-amụta na Baịbụl na-achị ndụ ha, ọ ga-adịrị ha mfe idozi ihe ọ bụla na-esere ha okwu. Ị̀ mụtala ihe ndị ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị nwere ike ibilite n’ezinụlọ unu? Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha.”—Jems 1:5.
(5) Agbala n’èzí. O nweghị ihe na-eweta ọgba aghara n’etiti di na nwunye ka ịkwa iko, bụ́kwanụ naanị ihe Chineke kwuru na mmadụ nwere ike iji maka ya gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. (Matiu 19:9) Baịbụl kwuru, sị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye gharakwa ịbụ ihe e merụrụ emerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Olee ihe ga-enyere di na nwunye aka ka ha ghara ịna-agba n’èzí? Baịbụl kwuru, sị: “Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.”—1 Ndị Kọrịnt 7:3, 4.
Ụfọdụ nwere ike ikwu na ihe ise ndị a anyị tụlere magburu onwe ha, kama na o nweghị onye ga-emeli ha. Ndị ọzọ nwekwara ike ịsị na ha bụ ihe mgbe ochie. Ma, ọtụtụ di na nwunye ndị merela ihe ndị a eritela ezigbo uru, nke gosiri na ha abụghị ihe mgbe ochie. Ndị na-eme ha na-erite ụdị uru ahụ onye na-achọ ka Chineke na-eduzi ya n’ihe niile ọ na-eme ná ndụ na-erite. Baịbụl kwuru na onye ahụ “[ga-adị] ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.” (Abụ Ọma 1:2, 3) Otu n’ime “ihe ọ bụla” ahụ ga-aga nke ọma bụ alụmdi na nwunye.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ị chọọ ịgụkwu gbasara ihe di na nwunye nwere ike ime ka ha na-ebi n’udo, gụọ Ụlọ Nche nke Febụwarị 1, 2011.
Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?
● Olee otú Chineke si ele ịgba alụkwaghịm anya?—Malakaị 2:14-16.
● Olee otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya?—Ndị Efesọs 5:23, 28.
● Olee onye ọ ga-abụ di na nwunye na-eme ihe o kwuru, ha ana-ebi n’udo?—Abụ Ọma 1:2, 3.